Boy killed in Aba: Etu e si gbuo nwa m ebe ọ gaara ikpofu unyi n'Aba
Otu nwaanyị aha ya bụ Elizabeth Kalu Oleonuma akọwaala etu ndị ọ sị na-arụ ebe a na-ekpofu unyi na Jubilee Aba si gbuo nwa nwoke dị afọ iri na asaa.
Ọ sị na o zigaara nwa ya nwoke bụ Olee ka ọ ga kpofuo unyi n'ụbọchị ụka 12 Septemba, 2021 na ozi ọzọ ọ nụrụ bụ na nwa ya anwụọla.
Otu nwata hụrụ ka ihe a ji mee kwuru na ha ruru ebe a na-ekpofu ụnyị, onye nọ ebe ahụ sị ha chere ma mechaa sị ha kpofuo.
Ọ sị na mgbe ọ sị ha kwụsị, na Olee wufuru unyi nke ya nke mere onye ahụ jịrị sị ka otu nwata ọzọ jide Olee ma nata ya efere oji kpofuo unyi.
Nwata ahụ jidere Olee ma were aka kụọ ya n'obi ugboro abụọ nke mere o ji daa ma nwụọ.
Kirie ihe ha kwuru n'uju.
