Ọ bụghị eziokwu na m alụbeghị di – Nne ejima ise
Ihe iribama emeerela otu ezinaụlọ n’Umuahia, Abia steeti dịka otu nwoke na nwaanyị tụrụ anyị ụmụ ejima anọ hụrụ ka dọkịnta gwupụtara ụmụ ejima ise.
Nwaada Oluomachi Lynda Nwojo onye nọ na Klaasị ikpeazụ ya na mahadum Michael Okpara University of Agriculture (MOUAU) enweghị ike gwa ndị onye ntaakụkọ anyị n’Abia steeti okwu n’ihi ọ ka na-ekuru ume ndụ nwayọ nwayọ na ụmụ ọ mụrụ.
Dịka anyị garuru n’ụlọọgwụ Federal Medical Centre, Umuahia ebe a mụrụ ụmụaka a, nwanne nwaanyị nwaada Nwojo bụ Helen kọwaara BBC Igbo na ya bụ ihe ọma meere ha tụrụ ha n’anya.
O kwuru: “Anyị mere usoro ahụike nke nnyocha afọ nwaanyị bụ ‘Ultrasound scan’ ugboro ugboro, dọkịnta gwara anyị na ọ bụ ejima ụmụ anọ nọ n’afọ nwanne m nwaanyị”
Helen gara n’ihu kwuo na ya bụ ihe tụrụ ma ha ma ndị dọkịnta n’anya etu e siri kuputa ụmụ ise n’afọ n’ụbọchị Mọnde bụ ụbọchị abụọ n’ọnwa Ọktọba.”

Ebe foto si, Linda Nwojo/Facebook

N'gbanyeghị na anyị enweghịike hụ nna ụmụaka a, nwanne ya nwaanyị gwara BBC Igbo na “Obi dị Nna ụmụaka a ezigbo mma maka ụmụ ndị a e kupụtara.”
Oriakụ Priscilla kọwara BBC Igbo na di nwa ya agbaghị ọsọ dịka akụkọ na-efegharị na soshal midia si ekwu.
O kwuru na aha di nwa ya bụ Chinedum Nwoye, na ọ na-ere ahịa.
Ọ gara n’ihu kọwara na ọ ma di na nwunye ahụ ka dị ntorobịa nke bụ na ya bụ ihe ọma a mere ga-ebu ha aka nke ukwuu.
Ọnụ na-ekwuru ụlọọgwụ Federal Medical Centre, Umuahia bụ Chikezirim Madubuko kwuru na kọwara na nne ụmụaka ahụ nọ n’ọnọdụ ahụike ọma ma kwuo
Nne nwaada Nwojo bụ Priscilla Nwojo gwara BBC Igbo na akụkọ na-efegharị na nwa ya alụghị nna ụmụaka bụ akụkọ ụgha n'ihi ha abụọ alụọla kemgbe.
“Ọ ka na-ezuike n’ihi ịmụ ụmụ ise abụghị egwu ụtaba achị n’aka agba egwu”
Helen kwukwara na ha anatala ozi ekele n'aka gọọmentị Abịa banyere inyere nwanne ya na ụmụ ndị a mụrụ aka mana ruo ugbua, enwebeghị ihe ọbụla ha hụrụla n'aka gọọmentị.
Ọ gara n'ihu kọwa na etu ọnọdụ akụnụba ndị mmadụ na Naịjirịa ugbua, na ọ ga-adị ya na ezinaụlọ ha obi ụtọ ma ndị mmadụ pụta gbatara ha ọsọ enyemaka site n'ihe onyonyo nakwa ihe ndị ọzo e ji eleta ụmụaka anya.
Ọ kelekwara ndị zitere ha onyinye dị icheiche.

Ebe foto si, Nwadiuto Okeugo










