Etu ndị uweojii si nwụchie nwaanyị ji aka tigbuo nwa odibọ ya dị afọ 11

Ebe foto si, HUMAN RIGHTS COMMISSION PLATEAU STATE
Ndị uweojii Plateu Steeti anwụchiela otu nwaanyị aha ya bụ Oriakụ Nnaemeka Nwachukwu maka ebubo na o ji mmekpa ahụ gbu nwa odibo ya bụ Margaret Joshua onye dị naanị afọ 11.
Nwaanyị a ji mmiri ọkụ wụchapụ nwa odibọ ya ike, dịka ndị ọrụ ikike dịịrị mmadụ na Plateau steeti si kwuo.
Akụkọ a pụtara ihe dịka otu nwaanyị aha ya bụ Comfort Moses gara kọọrọ ndị uweojii etu o si zọpụta nwatakịrị ahụ ebe o dina n'ụlọ arụchaghị arụcha ma kpọga ya ụlọọgwụ ebe ọ nọrọ nwụọ.
Comfort gwara BBC Pidgin na ọ bụ n'ụbọchị Fraịde, Nọvemba 11, ka ọ hụrụ nwata ahụ n'akụkụ ụlọ ya n'ebe elekere asaa nke mgbede.
"Mgbe m lakpuru n'ime ụlọ m, obi m ezughị ike, m wee pụọ ga kpọbata ya. Ọnya ọnya juputara ahụ ya niile," Comfort Moses kwuru.
"Mgbe m jụrụ ya ihe mere ya, ọ sị na ya ga-agwa m, mana ka m buru ụzọ nyetụ ya mmiri ka ọ ṅụọ."

Ebe foto si, SALAU ABDULRAHMAN
Comfort Moses kwuru na ya chọpụtara na nwata ahụ enweghị ike ịnọdụ ala n'ihi ọnya mere ya n'ike, ebe nne ya ukwu wụrụ ya mmiri ọkụ.
O kwuru na ya na di ya mechara buga nwa ahụ na nke ndị uweojii, si ebe ahụ kpọga ya ụlọọgwụ, mana ndị ụlọọgwụ sị na ha agaghị emenwu ihe dị na ya.
"Anyị gaziri ụlọọgwụ nkụzi nke mahadum Jos, ebe ahụ ka nwata a nọrọ nwụọ n'ụbọchị 14 nke Nọvemba," Comfort kwuru.
Ọbụghị ebumnobi m ka ọ nwụọ - Oriaku Nwachukwu
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Dịka ndị uweojii nwụchiri Oriaku Nwachukwu, o kwuru na ọ bụ eziokwu na ọ na-eti nwa odibo ya ihe, mana ọ bụ maka na nwata ahụ na-emetụ onwe ya aka n'ụzọ ruru unyi oge niile, nke bekee na-akpọ 'masturbation'.
Oriaku Nwachukwu kwuru na ọ bụ otu enyi ya si Kebbi steeti kpọtara ya nwata ahụ n'ihi ọnọdụ ụbịam nne na nna ya nọ na ya.
O kwukwara na ya ahụbeghị nne na nna nwata ahụ anya, mana ya na ha na-ekwu n'ekwentị ugboro ugboro.
Gbasara mmiri ọkụ wụrụ nwata ahụ n'ike, oriaku Nwachukwu kwuru na nke ahụ bụ ihe mberede, na ya amaghị ama mee ya.
"N'ụbọchị ahụ, esiri m mmiri ọkụ nke m chọrọ iji tinye akwa 'towel' ma na-asa mmiri, mana oge oge m na-abara ya mba n'ihi ihe ọjọọ o mere, o ji ụjọ na-ala azụ ma daa ada danye n'ime mmiri ọkụ ahụ," oriaku Nwachukwu kwuru.
"Tupu mụ agụpụta ya na mmiri ahụ, anụahụ dị n'ike ya ekpechapụla."
"Akpọrọ di m n'ekwentị ka ọ bịa ka anyị buga ya ụlọọgwụ, mana ọ lọtaghị n'oge. Tupu ọ lọta, anyị ahụkwaghị Margaret n'ụlọ."
"Anyị chọrọ ya ebe niile mana anyị ahụghị ya. N'echi ya, anyị gara kọọrọ ndị uweojii na anyị na-achọ ya achọ."
Ọ sị na ha chọrọ nwata ahụ abalị abụọ, mana ha amaghị na ọ gara zoo na nke onye agbataobi ha.
"Oge di m gwara m na akpọgala ya ụlọọgwụ, enwere m aṅụrị n'ihi na echere m na-a ga-enye ya ọgwụgwọ. N'ezie, amaghị m na ọ ga-anwụ," oriaku Nwachukwu kwuru.
Anyị ga-enwetara Maragaret ikpe kwụ ọtọ - Ndị uweojii
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Plateau steeti bụ Alfred Alabo gwara BBC na ha ga-eme ihe niile ha nwereike iji hụ na ikpe ziri ezi weere ọnọdụ n'okwu a.
O kwuru na ha anwụchiela nwaanyị ahụ ma malitekwa nnyocha, "ugbua nwaanyị ahụ nọ na ngalaba 'State Criminal Investigation Department".
"Obi adịghị anyị mma chaachaa maka ụdị ihe a merenụ, anyị na-akpọku ndị mmadụ ka onye ọbụla hụrụ ụdị ihe dị etu a ghara ịgbachi nkịtị."
N'otu aka ahụ kwa, onyeisi ngalaba na-ahụ maka ikike dịịrị mmadụ na gọọmentị Plateau steeti bụ Grace Pam gwara BBC Pidgin na ha na-eche ka ndị uweojii mechaa nnyocha ha tupu ha akpụpụ nwaanyị ahụ bụ Oriaku Nnaemeka Nwachukwu ụlọikpe.
"Anyị na-enweta mkpesa maka mmekpa ahụ ụmụntakịrị kwa mgbe kwa mgbe, mana onwebeghị nke n'ime ha nwata ahụ nwụrụ anwụ," Grace Pam kwuru.
O kwukwara na ọ bụ ọnọdụ enweghị nchekwa na-eme ka ọtụtụ ndị mmadụ si n'ime obodo na-agba ọsọ ndụ na-abata na mpaghara ndị mepere emepe.
Ọ bụ nke a na-eme ka ọtụtụ na-akpọpụ ụmụ ha dịka odibo nye ezinụlọ dị icheiche, na-amaghị etu ezinụlọ ahụ si eleta ụmụ ha anya.









