Ihe mere PDP Abia Steeti jiri si n'Isialangwa North họpụta onye ga-azọ ọkwa Gọvanọ

Aha onyonyo, Nigeria Election 2023: Ihe mere PDP jiri si n'Isialangwa North họpụta onye ga-azọ ọkwa Gọv
Ihe mere PDP Abia Steeti jiri si n'Isialangwa North họpụta onye ga-azọ ọkwa Gọvanọ

Kọmishọna na-ahụ maka ndị Eze ọdịnala n'Abia Steeti bụ Christopher Enweremadu akọwaala ihe mere Pati ha bụ Peoples Democratic Party (PDP) jiri si na mpaghara Isiala Ngwa North (Abia Central) họpụta onye na-azọ ọkwa Gọvanọ na Steeti ahụ.

Ọ kọwara na mgbe e kewapụtara Abia site n'Imo Steeet na ọ bụ naanị mpaghara abụọ ka ọ dị nke gụnyere; Umuahia (Old Bende) zone na Aba zone.

Ọ gara n'ihu kwuo na a bịa n'ọchịchị Abia Steeti kamgbe ọchịchị onye kwuo uche ya malitere n'afọ 1999, na ndị si mpaghara Umuahia (old Bende) achịala afọ iri na isii, ebe ndị nke si mpaghara Aba achịala naanị afọ asatọ.

"Ọchịchị na-adị mma e menyere ndị ebe a, e menyere ndị ebe, maka na oke zuo ọha, iro ala".

Christopher Enweremadu

Enweremadu sị na ọ bụ nke a mere ha PDP jiri kpebie isi na mpaghara Isiala Ngwa so n'Aba Zone họpụta onye ga-azọ ọkwa Gọvanọ n'aha ha.

"Anyi nwere olileanya na ndị Abia na-anaghị achọ mmegbu ka aghọta ma kwete na mkpebi a PDP mere banyere ọkwa Gọvanọ."

Enweremadu gakwara n'ihu kọwaa ihe mere ndị Abia ga-eji atụrụ PDP vootu na ntuliaka afọ 2023 a.

Ọ kọwaara na-ewepụ ọrụ ndị ọzọ PDP rụrụla, na ihe banyere nchekwa n'Abia bụ otu ihe kachasị mkpa ọchịchị Gọvanọ Okezie Ikpeazụ mere.

Ọ sị na o kwenyere na ndị Abia ga-ele ihe ndị a anya ma tụnyere PDP vootu.

Kirie ihe o kwuru n'uju;