Lee mgbe Abia PDP ga-eme ntuliaka ịhọpụta onye ga-anọchi anya Uchenna Ikonne

Ebe foto si, PDP/Ikonne
Otu Peoples Democratic Party (PDP) nke Abia Steeti ekwụpụtala mgbe ha ga-emegharị ntuliaka ịhọpụta onye ga-eji ọkọlọta ha azọ ọkwa Gọvanọ na steeti ahụ.
N’akwụkwọ ozi odeakwụkwọ ha bụ Elder Abraham Amah wepụtara, ha sị na ọ ga-abụ n’ụbọchị anọ nke ọnwa Febụwarị 2023, n’ọgbọegwuregwu dị n’Umuahịa n’elekere iri nke ụtụtụ.
Nke a na-abịa dịka Uchenna Ikonne jibu ọkọlọtọ ha nwụrụ n’ụbọchị 25 Jenụwarị 2023 mgbe ọ rịachara ọrịa.
Amah sị na ohere ịgbata akwụkwọ nkwupụta uche nakwa akwụkwọ ịzọ ọkwa a malitela taa bụ 27 Jenụwarị 2023 na ọ ga-akwụsị n’ụbọchị Wenezde 1 Febụwarị 2023.
Otu a na-akpọku ka ndị chọrọ ịzọ ọkwa gọvanọ n’aha pati PDP gaa n’isiụlọọrụ ha dị n’Abuja ma gbata akwụkwọ a.
Kedụ ihe ndị nwere ike ime ma onye na-azọ ọkwa n'aha pati nwụọ tupu ntuliaka?

Ebe foto si, Uche Ikonne/Facebook
Dịka akụkọ na onye ji aha pati People’s Democratic Party azọ ọkwa gọvanọ Abia steeti bụ Uche Ikonne anwụọla, ajụjụ ọtụtụ ụmụ Naijiria kpụ n'ọnụ bụ gịnị ga-emezi ugbua oche ahụ tọgbọ chakoo.
Ikonne nwụrụ n'ụlọgwụ 'National Hospital' dị n' Abuja ụbọchị Wenezde, abalị 25 nke ọnwa Jenụwarị afọ ka ọ rịachara ọrịa nwa oge, dịka ọkpara ya bụ Uche-Ikonne Chikezie si kwuo.
Ụfọdụ na-ajụ ma onye yana ya so ya azọ ọkwa ahụ n'aha PDP dịka osote ya bụ Igwe Philip Okey ọ ga-ewere ọkwa ahụ ma aghọọzie onye ga-azọ ọkwa ahụ ka a ga-ahọpụta onye ọzọ?
Ebe Inec nakwa Iwu Ntuliaka ọhụrụ kwụ na nke a

Ebe foto si, Uche Ikonne/Facebook
Iwu ntuliaka ọhụrụ Naịjirịa bụ ‘Electoral Act 2022’ nke Onyeisiala Muhammadu Buhari enyeela ohere ọhụrụ dị iche iche banyere usoro ntuliaka Naịjirịa.
Dịka onye ji aha pati People’s Democratic Party azọ ọkwa gọvanọ Abia steeti bụ Uche Ikonne lara mmụọ n’ụbọchị 25 nke ọnwa Jenụwarị 2023, ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (Inec) bụ Festus Okoye gwara BBC Igbo n’Wenezde ohere dị iche iche dịịrị pati ahụ.
O kwuru na ụfọdụ ihe ndị dị n’akụkụ iwu ọhụrụ a nke ‘Section 34 – Sub Section 1 & 3’ nyere ntuzi aka atọ sị:

Ebe foto si, Okey Igwe/Facebook
Ọmụmaatụ mbụ:
- Ọ bụrụ na onye na-azọ ọkwa gọvanọ steeti nwụọ n’otu ọnwa tupu oge ntuliaka, pati ahụ ga-eziterịrị Inec ozi ọnwụ onye ahụ ma gosi ihe ịgbaama na ọ nwụọla n’ezie.
- Ha ga-ezitekwara Inec ụbọchị ha ga-eme ntuliaka ime ụlọ ọhụrụ nke pati ha n’ime izu abụọ iji họpụta onye ọzọ ga-anọchi onye ahụ.
Ọmụmaatụ nke abụọ:
Ọ bụrụ na onye na-azọ ọkwa gọvanọ nwụọ n’ime abalị abụọ maọbụ otu izu ka e mee ntuliaka, pati ahụ ga-emerịrị ntuliaka ime ụlọ ma họpụta onye ọzọ n’abalị 14 dịka Inec ga-emere steeti ahụ ntuliaka ọkwa gọvanọ nke ha iche n’ime abalị 21.
Ọmụmaatụ nke atọ:
Ọ bụrụ na onye na-azọ ọkwa gọvanọ nwụọ mgbe amaliterela ntuliaka ọkwa gọvanọ steeti ahụ, osote ya ga-anọchịtezi anya ya n’ịzọ ọkwa pati ahụ.
Otu onye ọchịchị pati PDP n’Abịa steeti na-achọghị ka a kpọọ aha ya gbaara BBC Igbo ama n'Wenezde na nke a bụ eziokwu dịka o kwuru:
“Pati anyị na-eru uju mana anyị na-akwado ime ntuliaka ime ụlọ n’ime abalị 14 na-abịa abịa iji họpụta onye ga-anọchi Ikonne n’ịzọrọ anyị ọkwa gọvanọ.”
Etu Uchenna Ikonne na-azọrọ PDP ọkwa gọvanọ siri laa mmụọ

Ebe foto si, Uche Ikonne
Ọkamụta nke ngalaba ahụike ‘Optometry’ bụ Uchenna Ikonne na-azọrọ Pati People's Democratic Party (PDP) ọkwa gọvanọ Abịa steeti 2023 lara mmụọ n'ụbọchị Wenezde.
Nwa ya nwoke bụ Dkt Chikezie Uche-Ikonne mara ọkwa ọnwụ ya nye ọha.
Ozi ya kwuru:
"Nna m nọ na-agbake n'ahụ ọ dara dịka o si mba UK ebe ọ na-anata ọgwụgwọ lọghachite mana ọ dakwara ahụ ọzọ nke mere obi ji kporọpụ ya ugboro ugboro bụ ihe dulara ya mmụọ."
Kọmịshịnọ azụmahịa Abia steeti bụ Okiyi Kalu gbakwara BBC ama ọnwụ Ikonne dịka e kwuru na ọ lara mmụọ taa bụ ụbọchị 25 nke ọnwa Jenụwarị, 2023.
O kwuru:
“Ọ bụ ihe obi mgbawa nye m dịka m na-ama ọkwa ọnwụ Eleazar Uchenna Ikonne nke lara mmụọ n’ụlọọgwụ National Hospital Abuja n’ebe elekere anọ nke isi ụtụtụ taa bụ ụbọchị 25 nke ọnwa Jenụwarị 2023 dịka ọ rịara ahụ nwa mgbe nta.”

Ebe foto si, Okezie Ikpeazu
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Gọọmentị Abịa steeti ezipụtala ozi iti aka n’obi nye ezinụlọ Ikonne ma gwaa ndị Abia na ọkwa ọnwụ Ikonne gbawara ọchịchị steeti ahụ obi.
Ozi gọvanọ steeti ahụ bụ Okezie Victor Ikpeazu zipụtara kwuru:
“Anyị na-arịọ Chineke nabata mkpụrụ obi ya ma nye ya ebere, nye ya izu ike ebighị ebi ma nye onye ọbụla ọnwụ nke bụ ihe agaghị emezịnwụ emezi metụtara ikike inwe ezi nkasiobi.”
O kwukwara na iji kwanyere ugwu pụrụiche na ọ na-enye iwu ka ọkọlọtọ niile na-efe na ụlọọrụ PDP niile na steeti ahụ datuo ruo ọkara ọkwa ha dịka a ga-akwụsị ihe niile gbasara achụmnta vootu na steeti ahụ nwa mgbe nta ruo Mọnde, ụbọchị 30 nke ọnwa Jenụwarị, 2023.
Ọnwụ Ikonne na-abịa dịka o ji ihe fọrọ naanị otu ọnwa ka ntuliaka gọvanọ na Naịjirịa bịazuo na mmezu.
Ụlọọrụ na-ahụ maka nhazị ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (Inec) ehibela ntuliaka ọkwa gọvanọ na Naịjirịa n’ụbọchị 25 nke ọnwa Maachị 2023.
Ọtụtụ tụrụ anya ịnụ olu Ikonne taa dịka BBC Igbo (BBC Igbo Debate 2023) na-eme nrụrịtaụka ọkwa Gọvanọ Abịa steeti taa mana akụkọ ọnwụ ya emeela ka ọha daa jụụ n'olileanya a.
Isonye ya bụ nrụrịtaụka ọkwa gọvanọ abịa steeti nke BBC Igbo na-eme, biko pịa aka ebe a.
Enyinnaya Chima Nwafor na-azọ ọkwa gọvanọ Abia steeti 2023 n'aha pati Young Progressives Party (YPP) kọwara BBC Igbo na iji kwanyere ọkamụta nke ngalaba ahụike ‘Uchenna Ikonneu ugwu dịịrị ya na ọ gaghazị esonye na nrụrịtaụka (BBC Igbo Debate 2023) ha mere n'ụbọchị 25 nke ọnwa Jenụwarị maka ndị na-azọ ọkwa gọvanọ Abia steeti.
O kwuru na dịka nwata a zụrụ azụ na ọ gaghị abụ ihe ziri ezi ịnọ na-akarọ ọha atụmatụ ọchịchị ya ebe nna ya ukwu lara mmụọ.
O ji obi iru uju rịọ ọha ka a nabata ọpụpụ ya na ya bụ nrụrịtaụka.

Ebe foto si, Uche Ikonne
Ihe ndị ị kwesịrị ịma maka Uche Ikonne.

Ebe foto si, Uche Ikonne/Facebook
- Uchenna Ikonne rụbụrụ ọrụ dịka onyeisi mahadum 'Abia State University' n’afọ 2015. Nke mere onye nke asaa na-eji ọkwa ahụ na mahadum a.
- Ọ rụbụkwara ọrụ dịka onyeisi mahadum ‘Abia State Polytechnic’ malite n’afọ 2014 ruo afọ 2015.
- Ikonne bụ onye pati People’s Democratic Party ma bụrụ onye a họpụtara ịzọrọ pati ahụ ọkwa gọvanọ n’Abịa steeti na ntuliaka 2023 dịka ya bụ pati nọ n’ọchịchị na steeti ahụ ugbua.
- Ọ bụ onye ọkamụta nakwa onye ọkaibe n’ihe gbasara ahụike dịka ọ akụkụ ahụike ọkachamara ihe gbasara bụ ngalaba na-ahụ maka anya ndị mmadụ (Optometry).
- Ọ bụ onye Agburuike Nsulu, nke okpuruọchịchị Isiala Ngwa North n'Abịa steeti.











