Ụlọikpe kachasị akụpụla akwụkwọ onyeisiala Buhari gbara ịgbanwe iwu ntuliaka

Onyeisiala Buhari na ndị isi ụlọomeiwu

Ebe foto si, Nigeria Presidency

Ụlọikpe kachasị atụpụla ikpe nke Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari gbara ịkachapụ s 84(12) nke iwu ọhụrụ Electoral Act nke o binyeburu aka.

Ndị ọkaikpe asaa lebara ya bụ okwu anya tụpụrụ ma kpọo ya "mmebi iwu e ji ekpe ikpe"

Aokmaye Agim bụ onye gụpụtara mkpebi ahụ kwuru na onyeisiala Buhari enweghi ike ibinye aka n'iwu ọhụrụ ma tụgharịa sị ndị ọkaikpe kagbuo ya.

"O nweghi ebe ọbụla n'iwu Naịjirịa nyere onyeisiala ikike ịgbagha iwu ọbụla ma o binyechaa ya aka" ka Agim kwuru.

Cheta na onyeisiala Muhammadu Buhari binyeburu aka n'iwu ahụ kpụchiri usoro ntuliaka bụ 'Electoral Act Amendment Bill 2022' n'ọnwa Febụwarị afọ a.

Gịnị dị n'ime s.84(12) n'iwu ahụ?

Ihe dị n'ime s.84(12) e ji ekpe ikpe kwuru na "o nweghi onye ndọrọndọrọ ọbụla enyere ọkwa ga-eso zọ ọkwa ma sọrọ họpụtakwa mmadụ na ntuliaka imeụlọ otu ndọrọndọrọ ọbụla".

Nke a butere nsogbu dịka onyeisiala Muhammadu Buhari degaara ndị ụlọomeiwu akwụkwọ sị ha kachapụ ya bụ iwu mana ha jụrụ ajụ.

Ọ bụ nke a buteziri ka onyeisiala nakwa ọkaiwu ukwu bụ Abubakar Malami gbaa ndị ụlọomeiwu akwụkwọ na-ekwu na s.84(12) megidere iwu Naịjirịa.

Ndị ụlọomeiwu gbachighara onyeisiala akwụkwọ nke ha ma kwuo na ọ bụ ha ka ọ dịịrị ime iwu ma gwa ụlọikpe kachasị ka ha kagbuo ikpe ahụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị ụlọomeiwu bụ Benjamin Kalu gwara ụlọntaakụkọ THISDAY na mkpebi a bụ mmeri nye ọchịchị onye kwuo uche ya.