Electoral Amendment Bill: Nkọwa ihe mere Onyeisiala Buhari ji ghara ibinye ya aka

Aha onyonyo, Nkọwa ihe mere Onyeisiala Buhari ebinyeghi 'Electoral Amendment Bill' aka

N’ọdinso a, ndị omeiwu Naịjirịa kwuru na ha ahazichaala iwu ga-achịkọta ntuliaka na Naịjirịa, nke bekee kpọrọ ‘Electoral Amendment Bill’, ma wegara ya Onyeisiala Muhammadu Buhari ka o binye ya aka.

Mana onyeisiala jụrụ ajụ, n’ihi na ọ chọrọ ka e wepụ ngalaba iwu ahụ nke kwuru na ọ bụ naanị usoro a kpọrọ ‘Direct Primaries’ ka a ga-esi na-eme ntuliaka imeụlọ na Naịjirịa.

Onyeisiala Buhari kọwara ọghọm niile nwere ike isi na ‘direct primary’ pụta, nke mere o ji dị mkpa ka e nwee usoro ndị ọzọ pati dị icheiche nwere ike ịgbaso na ntuliaka imeụlọ, ma ọ bụrụ na ha chọọ.

Dịka Buhari si kọwaa, ‘direct primary’ na-eri nnukwu ego, ọ na-egbu nnukwu oge, ọ na-akwalite wuruwuru na ntuliaka, n’ihi etu ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa si dị ugbua, ọ gaghị adị mfe ime ntuliaka na ‘ward' niile dị na Naịjirịa, nke ọnụọgụgụ ya dị puku asatọ, na narị asatọ na itoolu.

Mana kedụ usoro dị icheiche e si eme ntuliaka imeụlọ?

E nwere usoro atọ e si ahọpụta ndị chọrọ iso zọọ ọchịchị: bekee kpọrọ ha direct primary; indirect primary; na consensus.

‘Direct Primary’ na-enye ohere ka onye ọbụla so n’otu ndọrọndọrọ ọchịchị sonye na ntuliaka imeụlọ iji họpụta ndị ga-aga nnọchite anya pati ahụ na ntuliaka nke zuzugbe.

Iji maa atụ, Anambra steeti nwere ‘ward’ narị atọ na iri abụọ na isii (326), nke a pụtara na pati ọbụla ga-emerịrị ntuliaka imeụlọ ha na ward niile ndị a n’otu n’otu.

Ọ pụtakwara na Independent National Electoral Commission (Inec) ga-eziga ndịọrụ ha n’ebe niile ahụ ilekọta etu ntuliaka si aga, ndị uweojii ga-ezigakwa ndị ọrụ n’ebe ahụ niile iji gbochie nsogbu... Ụfọdụ na-ekwu na nke a ga-eri ego ma gbukwaa oge.

N’aka nke ọzọ, ‘indirect primary’ pụtara na a ga-ahọpụta ndị pati olemole na ‘ward’ dị icheiche ka ha gaa nọchite anya ‘ward’ ha na ntuliaka imeụlọ nke pati ahụ.

Inec ga-eziga ndị ọrụ abụọ maọbụ atọ ka ha gaa lee etu ya bụ ntuliaka si gaa, ndị uweojii ga-ezigakwa ụfọdụ ndịọrụ ha maka nchekwa... Nke a anaghị eri nnukwu ego maọbụ oge.

Ndịiche dị n'etiti 'direct primary', 'indirect primary' na 'consensus candidate'

Ụfọdụ na-ekwu na ‘indirect primary’ na-enye ike inye ohere ka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị were ego gobie mmadụ olemole ahụ ahọpụtara ka ha bịa nọchite anya ‘ward’ ha na ya bụ ntuliaka.

Usoro nke ‘consensus’ bụ mgbe mmadụ niile nọ na otu ndọrọndọrọ ọchịchị kwekọrịtara ma họpụta otu onye ga-anọchite anya ha, n’enweghị ntuliaka ọbụla, maka na ndị Igbo na-ekwu na a gbakọọ aka kwanye nwa nwa n’olulu, ọ naghị awa n’afa.

Nke bụ eziokwu bụ na o nweghị ebe e si gawa Ọnịcha ka ọ dị nso, maka na atụsịwa ajị dị n’ajị, onye kere ajị agbara ọtọ.

Ihe ka mkpa bụ ka ndị mmadụ tinye uche ma tinyekwa uchu n’usoro e si ahọpụta ndị ga-achị ha.

Ọzọkwa bụ ka e nwee ntaramahụhụ siri ike maka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-eji ego egobi ndị mmadụ n’oge ntuliaka.

Kedụ ebe a kwụ ugbua n'okwu 'Electoral Amendment Bill' a?

Ka ọ dị ugbua, ndị omeiwu emegharịala iwu ntuliaka ọhụrụ a, ma tinyechaa ihe niile onyeisiala dụrụ ha ọdụ ka ha tinye.

Ihe fọdụziri bụ ma Onyeisiala Buhari ọ ga-ebinyezi ya aka. O nwebeghị onye ma.