Rochas Okorocha na EFCC: Ụlọikpe ajụla ịtọhapụ Rochas Okorocha dịka EFCC kpụpụrụ ya ikpe taa

Rochas Okorocha

Ebe foto si, Rochas Okorocha

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja ajụla ịtọhapụ aka chiburu Imo steeti bụ Rochas Okorocha n'ikpe metụtara mmefu ego dị ijeri N2.9.

Ngalaba gọọmentị na-ebu agha megide nrụrụraka bụ 'Economic and Financial Crime Commision' (EFCC) kpụpụrụ Okorocha n'ụlọikpe n'ụtụtụ taa bụ Monde maka ebubo 17 metụtara nrụrụaka.

Dịka a kpọpụtara ebubo ndị a ahụ n'ikpe ahụ nke Jọstis Inyang Ekwo nọ n'isi ya, Okorocha kwuru sị na aka ya dị ọcha.

Ọkaikpe Ekwo higharịrị ikpe ahụ gaa echi bụ Tuzde, abalị 30 nke ọnwa Mee, afọ 2022, bu ụbịchi a ga-etinye ọnụị n'okwu ma a ga-enye Okorocha ohere isi n'ụlọ abịa ikpe ahụ nke Bekee kpọrọ bail.

Ọkaiwu ahụ nyere ntụziaka ka e jichie Okorocha ganye ụbọchị ahụ.

Cheta na n'ịzụụka gara aga,abalị 24 nke ọnwa Mee afọ 2022, ndị ọrụ EFCC nwuchiri Okorocha n'ụlọ ya dịka ha kwatara ọtụtụ awa, ma kpakaa ụzọ nakwa elu ụloOkorocha na Maitama, dị n Abuja.

Akụkọ ka na-abịa

Ihe mere anyị jiri gbaa isi akwara nwụchie Rochas Okorocha n'ụlọ ya- EFCC

Rochas Okorocha

Ngalaba gọọmentị na-ebu agha megide mpụ na nrụrụaka na Naịjriịa bụ 'Economic and Financial Crimes Commission' (EFCC) akọwala ihe mere ha ji nwụchi Sinetọ Rochas Okorocha n'ụlọ ya ụbọchị Tuzde.

EFCC nwụchiri Okorocha dịka ha chị ndị uweojii gbara egbe aghara aghara, gbaka ụzọ na elu ụlọ tupu ha banye n'ụlọ ya dị na Maitama Abụja n'abalị 24 nke ọnwa Mee afọ 2022.

N'ihe onyonyo nke Okorocha tinyere n'akara Facebook ya n'abalị Tuzde gosiri ebe ọ mara afọ n'ala na-ekpe ekpere ka Chineke gbatara ya ọsọ enyemaka dịka ndị ọrụ EFCC na-agbawa ụzọ nakwa elu ụlọ ya.

Nwa Okorocha kwuru n'ihe onyonyo ahụ a nataghị ikike nnwụchi n'ụlọikpe iji nwụchi ya.

Aha onyonyo, Rochas Okorocha

Mana n'ozi ha wepụtara n'akara Instagram n'ụtụtụ Wenezde, ha kwuru na ihe mere ha ji gawa nwuchie ya n'ụlọ ya bụ na ọ jụrụ ịza oku ha.

"Nke a so ọjụjụ ọjụjụ onye bụbu gọvanọ ịza oku a kpọrọ ya ugboro ugboro" dịka EFCC hapụburu ya ka o si n'ụlọ na-abịa nke Bekee kpọrọ "Adminstrative bail".

EFCC kwuru na ha kpụburu Okorocha ụlọikpe n'abalị 24 nke ọnwa Januwarị afọ 2022 maka ebubo metụtara imefu ego ọha na ala ruru ijeri naira abụọ na ụma itoolu (N2.9 million).

Ha kwuru na Okorocha ekweghị ka e nye ya akwụkwọ ịkpọ oku n'ụlọikpe ikpe ahụ nke Jọstis Inyang Ekwo nke Ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị'Abuja nọ n'isi ya.

Nke mere ka e yigharịa ikpe ahụ gaa abalị 28 nke Maachị.

"Jọstis Ekwo higharịrị ya gaa Mee 30 ma dọọ aka na ntị na "nke a ga-abụ ikpeazụ m ga-ehigharị ya."

Ha kwuru na ọ bụ nke mere na EFCC "enweghịzị ihe ọzọ anyị ga-eme karịa ịnwụchi ya kpụta ya maka ikpe ya ikpe."

Egbe dara aghara aghara dịka EFCC nwụchiri Rochas Okorocha

Rochas Okorocha

Ebe foto si, Rochas Okorocha

Ụlọọrụ na-ahụ maka igbochi mpụ na nrụrụaka na Naịjriịa bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) anwụchịela Sinetọ Rochas Okorocha n'ụlọ ya.

EFCC wakporo ụlọ Okorocha ka a nụchara ụda egbe n'ogige ụlọ ya.

Otu onye nọ nso ezinụlọ ahụ ihe a mee na-achọghị ka akpọọ aha ya gwara BBC Igbo na "A gbara ọtụtụ gaasị mmiri anya n'ime ụlọ Okorocha dịka ha nwara ịchụpụ ndị niile nọ ebe ahụ."

Onye ahụ kwuru na Okorocha kwanyere ndị ahụ ugwu dịka ha malitere iji aka ike eso ndị mmadụ ebe ahụ.

EFCC kwusiri ike na ndị ntaakụkọ niile nọ ebe ahụ ga-apụrịrị n'ịlọ ahụ, dịka ha chụpụrụ ndị niile nọ n'ụlọ ahụ n'ike.

Akụkọ kwuru na e mekpara ụfọdụ ndị ntaakụkọ nọ ebe ahụ ahụ dịka ezuru ụfọdụ n'ime ha egbe n'ahụ.

Ihe onyonyo Okorocha zipụtara n'akara Facebook ya gosiri etu ndị nchekwa nke EFCC siri wakpoo be ya, gbawaa elu ụlọ be ya dịka ha gbara isi akwara ịnwụchịe ya.

Cheta na akụkọ pụtara na mgbede ụbọchị Tuzde na aka chiburu Imo Steetị bụ Rochas Okorocha etiela mkpu na ndị ụlọọrụ na-ebu agha megide mpụ EFCC wakporo ụlọ ya dị n'Abuja.

EFCC wakporo ụlọ ya dị na mpaghara Maitama Abuja n'ehihie Tuzde dịka na na-achọ ịnwuchi ya.

Aha onyonyo, Rochas Okorocha

Mgbe Okorocha na-aza ekwentị ndị Channels TV kpọrọ ya, ọ katọrọ agwa ndị ngalaba EFCC kpara ma ṅụọ iyi ịnọgide n'ime ụlọ ruo mgbe ọ ga-ahụ akwụkwọ ikike sị ka a nwụchie ya.

N'okwu ya "e ji m n'agbụ ebe a, ajụọla m ha ma ha ji akwụkwọ ikike ịnwụchi m. Ana m akwado ịga mee nyocha maka ọkwa onyeisiala m na-azọ".

"Amaghị m ihe na-eme; Ọ bụ ihe ọjọọ na ihe a na-eme ebe a. Aga m anọ ebe a ruo mgbe m matara ihe ha na-achọ, a chọrọ m ịhụ akwụkwọ ikike sịrị ha nwuchie m".

Ihe onyonyo si n'ụlọ Okorocha bụ nke dị na soshal midia gosiri ebe ndị EFCC juru na mbara ezi ụlọ Okorocha.

Ha siri ọnwụ ka Okorocha nyefee ha onwe ya maọbụ zaa oku ha kpọrọ ya kamgbe bụ nke ọ na-achọghị ịza.

Ndị EFCC jiri ihe dochie ọnụ ụlọ Okorocha nke gbochiri ụfọdụ ndị ntaakụkọ ịbata na ndị ọzọ ịbata n'ime ụlọ ya.

Aha onyonyo, Exclusive: Ndị ritere ọkwa gọvanọ n'ụlọikpe ma n'ime obi ha na ha abụghị 'gọvanọ - Rochas

Ha mechara sị na chọrọ ịgbaka ọnụzọ ụlọ Rochas ebe ọ jụrụ ịpụta ka ha nwuchie ya.

EFCC dere na ọbaozi webaịtị ha sị na Rochas gbapụrụ ọsọ, jụ ịza oku ụlọikpe kpọrọ maka ikpe ya n'ụbọchị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Maachị.

Ha sị na ọkaikpe ya bụ ikpe dị n'aka bụ Justice Ekwo bụgharịi ya bụ ikpe ruo ụbọchị iri atọ nke ọnwa Mee, ma dọọ aka na ntị na nke ahụ bụ nke ikpeazụ ọ ga-ebugharị ya bụ ikpe.

Ha sị na ọ bụ ya mere ha jiri bịa ịnwụrụ ya.

Ihe onye nọ ezinụlọ Okorocha nso gwara BBC Igbo maka nwụchị ya

Akwụkwọ onye nọ ezinụlọ ahụ nso zitere BBC Igbo maka okwu nchwụchị Okorocha

Akwụkwọ onye ahụ nọ nso ezinụlọ Okorocha zitere BBC Igbo gosiri ihe ọ sị bụ mkpebi ụlọikpe mere n'isi nwụchị Okoroche nke EFCC mere n'afọ 2021.

Mkpebi ụlọikpe ukwu dị na Pọta kọtụ nke ọkaikpe Dalyop Pam nọ n'isi ya nọ n'ụbọchị isii nke ọnwa Disemba 2021 kwuru na etu ndị EFCC siri bịa kpụrụ, kpọchịe ma na-eyi Okorocha egwu ịbịa kpọchiị ya ọzọ maka inyocha ọchịchị ya n'Imo steeti site n'afọ 2011 ruo 2019 ezighị ezi.

Ọkaikpe Pam kwuru na nke megidere iwu ikike diri onye nke ala Naịjirịa nakwa nke Afrịka.

Kedụ ebubo EFCC na-ebo Okorocha?

Okorocha bụ sịnetọ na-anọchiteanya mpaghara Owerri West n'ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa

Ebe foto si, Okorocha na EFCC

Akụkọ banyere ụlọọrụ EFCC na Rochas Okorocha malitere mgbe ọ rituru n'ọkwa dịka gọvanọ Imo Steetị n'afọ 2019.

Ha boro ya ebubo izu ego gọọmentị Imo Steetị mgbe ọ nọ n'ọchịchị ma kpachie ọtụtụ ụlọ Rochas ne ezinaụlọ nwe.

N'ọnwa Jenụwarị afọ 2022, ụlọọrụ EFCC boro Okorocha ebubo ọhụrụ ruru iri na asaa nke ọnụego ya bụ ijeri naịra abụọ na ụma (N2.9bn) ma kpụpụ ya n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja.

Ha sị na Rochas na ndị ọzọ gụnyere onye pati APC bụ Anyim Nyerere Chinenye, ụlọọrụ ise gbakọtara aka ma zuo ego ọha.

Ụlọorụ ndị a bụ Naphtali International Limited, Perfect Finish Multi Projects Limited, Consolid Projects Consulting Limited, Pramif International Limited, na Legend World Concepts Limited.

Ha sị na ego a ha zuru megidere iwu na-achị mbupu na ịtụmgbere ego na Naịjirịa nke afọ 2011 (Money Laundering Act 2011).

EFCC wepụtara ebubo ọhụrụ ngwa ngwa Rochas kwupụtachara mmasị ya ịzọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa.

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post