Rochas Okorocha: EFCC anatala ikike ịjichi akụnaụba Okorocha na nwunye ya

Rochas na nNkechi Okorocha

Ebe foto si, @owelleRochas/Facebook, @reaRochas/Twitter

Ngalaba gọọmenti na-ebu agha megide nrụrụaka bụ EFCC n'aha ịchafụ ekwuola na ha anatala ikike ịjichi akụnaụba Rochas, nke nwunye bụ Nneoma nakwa nke nwa ya nwaanyị.

Onyeisi ụlọọrụ ha n'Enugwu bụ Usman Imam gwara ndị ntaakụkọ nke a dịka ọ na akọwa ka ha si rụọ ọrụ n'ọnwa asaa gara aga.

Ha kwukwara na ha jichiri ụlọ ozọ nke otu Paschal Obi bụbu onye enyemaka Okorocha na nwa ya nwaanyị.

Rochas Okorocha na nwa ya nwaanyí Uloma Nwosu

Ebe foto si, @ulomarochas/Instagram

Imam kọwara na ha malitere nyocha Rochas na ezinaụlọ ya ma kwuo na ha ga-azara ọnụ ha n'okwu a.

Ihe ndị ha jichiri gụnyere ụlọ-obibi ruru asatọ, otu ụlọ oriri, ụlọakwụkọ abụọ, ụlọahịa nakwa otu ụlọọgwụ.

Aha onyonyo, Rochas ekwenyeghị na Buhari na-emegbu ndị Igbo

"Anyị na-agbalị ịnapụta ihe ndị a n'aka Okorocha kpam kpam ma nyeghachi ya ndị Imo steeti" ka o kwuru.

Akụkọ ga-amasị gị