Rochas Okorocha na gọọmenti Imo steeti na-adụ aka n'ọnụ gbasara ndi bụ "unknown gunmen"

Ebe foto si, Hope Uzodimma/Rochas Okorocha
Aka chiburu Imo steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na ụwa gaha ama ndị a na-akpọ "unknown gunmen"n'Imo steeti dịka a nwụchịchara ọgọ ya nwoke bụ Uche Nwosu.
Okorocha bụ sinetọ n'ụlọ omeiwu ụkwụ Naịjiria kwuru nke a n'ihe onyonyo Channels tv.
O kwuru na nwụchị Nwosu ụbọchị ụka n'ụlọụka gositụrụ ụwa etu gọọmenti Imo steeti si eji ndị uweojii na-anọ n'obi gọọmenti eme mpụ.
Gọọmenti Imo steeti kwuru na ya bụ nwụchị bụ iji nye ndị uweojii ohere ime nyocha pụrụiche nakwa Okorocha na-achọ iji ndọrọndọrọ ọchịchị wee tigharịa ọhaneze anya.
Nwosu onye zọrọ ọkwa gọvanọ Imo steeti n'afọ 2019 enwerela onwe ya ma na-ekwu na nwụchị ya bụ nke gbadoro ụkwụ na ndọrọndọrọ ọchịchị.
Ndị uweojii enwebeghị ihe ha kwuru maka ya bụ nwụchị maọbụ ntọghapụ Nwosu.
Ihe gọọmenti Imo sara Okorocha

Ebe foto si, Hope Uzodimma
Ọnụ na-ekwuchitere gọọmenti Imo steeti bụ Nwachukwu Oguike ekwuola na sineto Rochas Okorocha kwesiri "ka enyere ya aka maọbụ nyochaa ya ọfụma".
Ọ gwara BBC Igbo n'ekwentị gbasara ebubo "unknown gunmen" Rochas boro gọọmentị steeti ahụ.
O kwukwara na ihe ndị a Okorocha na-ekwu ekwesighi onye tozuru ọkwa ya dịka Gọvanọ ochie nakwa Sinetọ.
Ihe Okorocha kwuru kpọmkwem
"Ihe na-eme n'Imo steeti na-agba anya mmiri, ọbụghị naanị n'Imo ma na Naịjirịa niile. Imo steeti bụzị "banana republic", ebe a na-enweghị nsọpụrụ nye iwu nakwa ebe ndị mmadụ ji ụjọ biri."
"Ọtụtụ mmadụ na-ajụ kedụ ndị bụ "unknown gunmen" mana ọ dịka ihe ndị na-eme ugbua n'Imo steeti egosila ndị ha bụ."
"Unknown gunmen bụ ndị uweojii si n'obi gọọmenti, na-ananghị akwanyere kọmịshọna uweojii Imo steeti ugwu , onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa. Naanị ndị ha na-akwanyere ugwu bụ gọvanọ Imo steeti, Hope Uzodimma nakwa Shaba bụ onyeisi ndị ọrụ nchekwa n'obi gọọmenti."
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị








