Umunna ala Igbo: Gịnị mere ha ji baa uru n'ala Igbo?

Ebe a na-eke anụ ụmụnna

Ebe foto si, Visual Jonin

    • Onye dere ya, Jessica Nwankwo
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, BBC Igbo, Lagos

O nweghi onye Igbo ma ndị bi na mba ma ndị bi n'ụlọ anụbeghi maka otu akporo 'Umunna'.

Ezinaụlọ niile nwere ya dịka ha bụ otu n'ime ndị dị mkpa n'ala Igbo.

Ha na-apụtakarị akwụnyere mmadụ n'oge mmemem dịka akwamozu maọbụ oge ịgba nkwụ ndz.

Mana kedụ ndị ha bụ n'ezie? O nwere uru ha bara n'ala Igbo?

Aha onyonyo, Igbo Culture: Usoro e ji echi nze n'ala Igbo

Kedụ ndị bụ Umunna?

Ndị Ohafịa

Umunna dịka e si akpọ ya pụtara "Ụmụ" ndị "nna ji", ọ bụkwa ebe onye chọrọ ka ọ ga-ejedebere ya.

Onye kọwara nke a bụ Maazi Jonathan Nwanwko ama dịka Anasoroha bụ onye ọnụ na-eru n'okwu n'Omenala Igbo.

Ọ gara n'ihu kọwaa na "E nwere ụmụnnwa abụọ: ndị imeụlọ nakwa ndị ezi" ya bụ

Maazị Nwankwo kọwara na ọ bidoro kemgbe oge gboo nke a chọpụtakwara n'ime akwụkwọ nsọ.

O ji ezinaụlọ Abraham ma atụ sị "dịka Abraham mụtara Ishamel nakwa Isaac icheiche, ụmụ niile si n'aha pụta bụ ụmụnna onwe ha"

Ihe ọzọ o kwuru bụ na ndị niile so n'ezinaụlọ bụ Ụmụnna, ma nwoke ma nwaanyị.

Mana abaịaziri kewaa ya nwee otu ụmụnwaanyị a na-akpọ ụmụ ada nakwa otu ụmụ nwoke.

Aha onyonyo, Igbo Culture: Ihe mere e ji kwụsị ịgba mbarị n'obodo anyị

O nweghi ihe pụrụiche a na-eme iji sonye n'otu ụmụnna dịka ọ bụ ndị a mụrụ n'ezinaụlọ na-esonye ya.

Kama onye ọbụla ga-eso n'ihe a na-eme ga-etozu dịmkpa maọbụ okorobịa tupu agụnye ya n'ime ihe a na-eme.

"Ụmụ nna abụghị maka ụmụaka maọbụ ndị ntorọbịa ka na-etolite" ka o kwuru.

Kedụ uru ha bara n'ala Igbo?

Ndị ụmụnna na-eke ihe ruru ha

Ebe foto si, visual jonin

Mazi Nwankwo kwuru Ihe eji enwe Umunna bụ ka ha nweike chekwaa ma hazie ihe ndị dịrị ha dịka ezinaụlọ.

"E nwee ihe ọbụla metụtara ha, ma ihe ọjọọ ma ihe ọma, ụmụ nna ọbụla ga-agbakọ kere ya"

O nwere ihe ndị Umunna ga-emere gị ndị ilo ekwesighi ịmere gị ọ kachasị n'ịkwa ozu.

"Ọ bụ ndị umunna na-asa ozu ahụ, nọrọzie na be onye nwụrụ kpọọ ndị agbatobi oku." ka okwuru.

Nwankwo kwuru na onye kpọrọ ndị ezi ka emeere ha ihe a, ọ ga-abụrụ ihe ihere dịrị ezinaụlọ ahụ.

- Ha na-ekpezi ọkwụ ala ọbụla dapụtara n'etiti ndị so n'Umunna ahụ

- Ha na-ekpekwa esemokwu dị n'etiti ha, ma n'ezinaụlọ, ma n'ụmụnna.

- Ha na-amanye iwu ezinaụlọ ndị so n'ime ha ga-eso iji kwụwa aka ha ọtọ n'obodo

Nwankwo sị "Onye ọbụla dara iwu a, adaa ya nha maọbụ taa ya ahụhụ maọbụ kpachapụ ya".

Iji ma atụ: Ikekwe ndị umunnwa nwereike kwuo na o nweghi onye n'ime ha ga-alụ ọgụ n'ahịa maọbụ n'ọha mmadụ.

O nwee onye ọbụla dara iwu a, akpọọ nzụkọ n'okwu ya ma daa ya nha.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị