Ohaneze Ndigbo: Mma na nke atọchaghị Igbo ọchị Ohaneze mere n' oge ọchịchị Nnia Nwodo

- Onye dere ya, Uche Akolisa
- Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5
N'abalị iri nke ọnwa Jenụwarị afọ 2021 ka Nnia Nwodo pịakọrọ oche ya dịka onyeisi otu Ohaneze Ndigbo.
Ọchịchị ya nke malitere n'ọnwa Jenụwarị afọ 2017 bịara na njedebe dịka ntụlịaka otu ahụ e mere n'Owere ụbọchị ụka (10/1/2021) họpụtara George Obiozor dịka onye ga-eweghara oche onyeisi Ohaneze.
Dịka ụfọdụ ndị mmadụ na-ele anya n'enyo ịkọta etu ọchịchị Obiozor ga-adị, BBC Igbo tinyere anya na mmiri lee ihe Ohaneze mere n' oge Nwodo:
1. Ọnụ na-ekwuru ọha na eze ndị Igbo

Ebe foto si, Ohaneze
Oge otu Ohaneze Ndigbo malitere n' afọ 1976, ihe a kpọrọ otu a bụ "Igbo National Assembly".
Ọ bụ ọkaiwu a ma ama bụ Ben Nwabueze bụ onye kpokobara Ndigbo nwere agba iji bido otu a.
Ebumnobi otu ahụ nke ha malitere oge Agha Biafra kwụsịrị bụ ịgba mbọ maka ọdịmma Igbo, dika otu Afenifere na Arewa Consultative Forum na-achọ ndị agbụrụ nke ha.
Gọọmentị etiti machiri otu ahụ, ha malite ọzọ ma gụgharia ya, "Ohaneze Ndigbo".
Mana ebumnobi ha dịka ọ dị na mbụ ka bụkwa ikwuru Ndigbo.
Ọrụ a ka ndị niile chịgoro otu Ohaneze, malite na Ben Nwabueze bụ onyeisi mbụ ya ruo na Gary Igariwey bụ onye nyefere Nnia Nwodo ọchịchị, gbara mbọ ịrụ.
Mana ndị ma ihe ekwe na- akụ na ndọrọndọrọ ọchịchị obodo dịka Steve Nwosu, onye ntaakụkọ a na-anụ aha ya na-ekwu na, o nweghị onye chịgoro otu Ohaneze na nso nso a ji nhazi okwu na akọ bulie okwu ọdịmma Igbo ka Nnia Nwodo.
Ha kwuru n' ọchịchị ya wetara Igbo ùgwù.
Nwosu sị, "Oge ọchịchị ya dịịrị ndị Igbo mma."
"Onyeisi Ohaneze pụrụ apụ bụ Nnia Nwodo buliri Ohaneze."
"O ji nka ịhazi okwu nakwa akọ na uche gba mbọ maka ikike dịrị ndị Igbo".
Ijị maa atụ: Oge onyeisi Arewa Consultative bụ Ango Abdullah bọrọ ndi Igbo ebubo na ọ bụ ha na-ebute ọgbaghara ebe niile e nwere nsogbu, ọkachasị na Ọdịda Anyanwụ, Ọhaneze nyere ha ọsịsa ma kwuo na Ndigbo bụ ndị na-akpa udo ma na akwalite mmepe obodo ebe ọbụla ha hụrụ onwe ha.
Ọzọ bụ na otu Ohaneze Ndigbo katọrọ ogbugbu e gburu onye otu Ipob n'ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị Ipob na ndị ọrụ nchekwa n'Emene,Enugwu steeti.
2. Igbagha atụmatụ ọbụla ha hụtara ka nke megidere ndị Igbo
Nwodo sonyeere mmadụ iri na ise bụ otu si Ndida Anyanwụ na etiti Ugwu were gbaa onyeisiala Nigeria bụ Muhammadụ Buhari akwụkwọ n'ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja maka mmegbu ndị si na mpaghara ndị a na ịnye ọkwa n'ọrụ nchekwa nakwa ngalaba gọọmenti gbara ọkpụrụkpụ.
Ọzọ dịka ibe ya bụ oge gọọmentị etiti machiri otu na- achọ nnwereonwe Biafra, bụ Ipob n'ịchafụ dika otu na-eyi ndụ egwu, Ohaneze tiri mkpu ka gọọmenti tọhapụ otu ahụ na-agbanyeghị n'otu Ipob na-enye Ohaneze nnukwu isi ọwụwa.
Ohaneze tikwara mkpu maka ngọnahụ nke ha boro ebubo na gọọmenti etiti gọnahụrụ ndị Igbo na mbulielu e buliri ndị uweojii welitere isi n'ọrụ na nso nso a.
3.Itinye aka n'ofe mmiri Niger
Igbo sị na e zuo ka a ha eri udele a tọtuo ngịga. A nyụkọọ mamịrị ọnụ ọ gbọọ ụfụfụ.
Ihe ọzọ pụrụ iche otu Ohaneze mere oge ọchịchị Nnịa Nwodo bụ isetịpụ aka kwe ndị agbụrụ ndị ọzọ nọ n'ofe mmiri ndị ha na Igbo nwere otu obi n'ihe gbasara ka ihe si aga na Naijiria aka udo nke ha kpọrọ "Handshake Across the Niger" na Bekee.
Ndị a mechara tikọọ isi ọnụ ma kpọọ oku ka a hazigharịa Naijiria na mpaghara, na mpaghara ( restructuring).
Ọ bụ site na mmekọrịta, ka Nnia Nwodo bụ onye ọchịchị bịara n'isi njedebe n'Ohaneze Ndigbo, kpalitere mmalite otu 'Southern and Middle Belts Forum' bụ otu họrọ ya na nsonso a dịka onye nchịkọta ha.
Otu a gụnyere otu dị icheiche na -anọchite agbụrụ di iche iche na Ndịda Anyanwụ Naijiria dịka Afenifere (Yourba), PANDEF (Niger Delta), Ohanaeze Ndigbo na 'Middle Belt Forum'.
4. Ịkpalite ndị Gọvanọ Ọwụwa- Anyanwu ịmalite kwa ọgbakọ ha ọzọ

Ebe foto si, Gov. Ifeanyi Ugwuanyi/Facebook
Ọgbakọ ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ na-agbabu ọnyụpa dịka onye ndụmọdụ mgbasaozi Nwodo bụ Attamah si gwa BBC, mana ọ bụ Nnia Nwodo kpalitere otu ahu ọzọ.
Nke a mere na ọgbakọ ha na-agụnyekwa ndị otu Ohaneze iji mụta echiche Ohaneze n'okwu a kpụ n'ọnụ.
O nwere ebe Nwodo dajọrọ?

Ebe foto si, Twitter/Atiku
Ọ bụghị naanị ihe ọma, ihe ọma ka a na-agụkọ, ụfọdụ ndị Igbo na-ebo Nnia Nwodo ebubo ime ndị Igbo "a sụọ ala ma a kọghị ji".
Lee ụfọdụ ebe ha kwuru n'ọchịchị ya riri mperi:
Inye Atiku Nkwado
Ebubo nke a bụ maka na otu Ohaneze kwụnyeere Atiku Abubakar oge ọ na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha pati PDP n' afọ 2019.
Dịka Uche Okwukwu bụbu odeakwụkwọ ukwu Ohaneze siri kwuo, otu Ohaneze ekwesighị inwe pati ha sonyeere ukwu iche.
Mana Onye ndụmọdụ mgbasaozi Nwodo bụ Emeka Attamah kwụrụ na "ọ bụ ndị Igbo kwuru, ọ bụghị Nnịa Nwodo."Ọ bụ oke Ndigbo iwepụta onyeisiala n'afọ 2023 - Nnia Nwodo
Attamah kọwara na ọ bụ n'ọgbakọ ndị Igbo na otu gbụrụ ndị ọzọ, gụnyere Pandef na Afenifere, nke e mere n'abalị 28 nke ọnwa Febrụwarị afọ 2018, ka a nọrọ kwupụta mkpebi ịkwụnyere Atiku.
Ọ gara n' ihu kwuo n' otu Igbo sị tụọ vootu na ntuliaka 2019 goziri n'ezie na ọ bụghị Ọhaneze.
Nkewa otu Ohaneze

E nwere nghọtahie n' Ohaneze malite oge e mechara ntuliaka tụpụtara ya n' afọ 2017. Nghọtahie in ime Ohaneze kawanyere njọ dịka otú otu pụtara gbálìa idenye aha yiri nke Ohaneze n'aka ngalaba na-ahụ maka ndebanye aha a kpọrọ CAC ma ya nụ mbọ kụrụ afọ n'ala.E nwekwara nsogbu dịka ngalaba ntorobịa Ohanézè na ndị okenye ha ebighị otu olu ekwu okwu dịka ọ siri metụta ndị Igbo.
Ọzọ nụ nghọtahie nke butere nchụpụ Uche Okwukwu dịka Odeakwụkwọ Ohanézè, esemokwu ahụ ebighị rue ọgwụgwụ ọchịchị nke na Okwukwu gbálìrì ịkponye aja na garị dịka Ohanézè na-akwado ntuliaka ha mere na nso nso a.Ụfọdụ hụtara ọgbaghara niile ndị a dịka nkata ndị achọghị ọdịmma na ịdịkọnotu Ndígbo na-akpa, ebe ụfọdụ boro ya akpaghị ụka akpa nke ọchịchị Nwodo.
Onyeisi otu 'Alaigbo Development Foundation' bụ Okammụta Uzoma Nwali boro Nnịa Nwodo ebubo Ịkewa otu ahụ.
Ọ sị, "N' oge ọchịchị ya, Ọhaneze Ndígbo kewara n'otu, n'otu. Ndị ha na John Nnia Nwodo na-akpa n' ọdụdụ ọha eze bụ ndị oji akpa eli ozu n' Alaigbo."Mana onye ndụmọdụ Nwodo bụ Emeka Attamah gwara BBC Igbo na ebubo na Nwodo kewara Ohanézè bụ okpotokpo asị."Nwodo kwudoro ma hapụkwa Ohanézè n' otu. Enwe ihe o meere ọ bụ inye otu ahụ agba."
Ọ gara n' ihu kwuo na ndị na- akpọ onwe ha otu si n' Ohaneze pụta bụ ndị dajọrọ dịka Ikechukwu Isiguzoro "bụ onye e wepụrụ maka akwụbaghị aka ọtọ nakwa ịda iwu Ohanézè Ndígbo dika onye ndu ngalaba nke ndị ntorobịa na Uche Okwukwu bụ onye bụbụ odeakwụkwọ mana n'ihi nnupuisi, ndị Imeobi Ohaneze kwụsịtụrụ ya ọrụ, mana ọ na- agagharị na- akpọ onwe ya Odeakwụkwọ."















