Ned Nwoko: Asịrị e jiri m gbaa na 'social media' ka wutekarịcha m

Aha onyonyo, Ihe mere m jiri akwado 'social media bill' - Ned Nwoko

Dịka ọtụtụ mmadụ na-ekwusi ike etu uche ha dị maka atụmatụ iwu a kpọrọ "social media bill" na Bekee, Sinetọ Ned Nwoke gwara BBC Igbo na ya nabatara ya.

Ọ sị na ihe mere ya jiri nabata ya bụ ihe mere ya n' soshal midia, ebe o tu nwata nwoke ọ maghị boro ya ebubo ịbụ nna ya.

O kwuru na nwata ahụ boro ya na-aya tụwara nnne ya ime, gbalaga.

Ọ sị na etu ndi mmadụ jiri na-emetọ aha mmadụ nakwa na-ebo ebubo aghara aghara mere o jiri kwesi na e nwere ihe eji etinye anya na ya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: