Police Promotions: Gịnị mere Ohaneze, 'Igbo Professionals' ji eti mkpu maka 'Police Promotion' ọhụrụ e mere?

Njirimara Ohaneze

Ebe foto si, Ohaneze

Otu Ohaneze Ndigbo na otu "Igbo Professionals' etiela mkpu kwuo na mbulielu ndị uweojii e mere na nso nso a bụ "ịga n'ihu na akpamoke megide ndị Ọwụwa Anyanwụ Naijiria".

Ha kwuru na mbulielu ahụ nke e buliri ndị uweojii mmadụ 37 n'ọkwa kọmịshọna , ebe ndị Ugwu nwetara ọkwa mmadụ 24, ebe ndị ndị Ọwụwa anyanwụ nwetara naanị otu onye, pụtara na o nweghịkwa steeti na Ọwụwa Anyanwụ ga-enwe Kọmishọna onye uweojii bụ onye Igbo.

Ohaneze gara n'ihu gosi iwe ha na 'ndị Igbo welitere isi n'ọrụ ndị uweojii na-epelata na-aga n'ihi ihe ha kpọrọ "agwa mmegbu na-akpasu iwe" nke gọọmenti etiti na-akpaso ndị Ọwụwa Anyanwụ.

N'ozi ha wepụtara ụbọchị Fraide nke onye ndụmọdụ mgbasaozi Nnia Nwodo, onyeisi Ọhaneze bụ Emeka Attamah binyere aka, ha kwuru na ha ajụla ya bụ oke ahụ awọrọ ha kpam kpam.

Ozi ahụ sị, "I lee anya na ndekọ ndị uweojii e buliri elu na ọkwa dịka Kọmishọna, mmadụ 12 si 'North-West', Mmadụ asatọ si North East , mmadụ asaa si 'South West', mmadụ ise si 'South South', mmadụ anọ si North Central', ebe dịka eze a ma na ọ ga-echi, naanị otu onye si n' South East."

Ohanaeze Ndigbo boro ebubo na agwa ịna-akpachapụ ndị Owuwa-Anyanwụ bụ ihe ọchịchị kwuru ọchịchị na-eme ndị Ọwụwa Anyanwụ kemgbe kama na nke Ọchịchị ugbua bụ ahụbeghị.

N'otu aka, otu "Igbo Professionals" nke a kpọrọ 'Conference of Igbo Professionals Worldwide' (CIPW) na Bekee kwuru na mbulielu e mere ebe a wọrọ ndị Ọwụwa Anyanwụ tara ọjị anya.

N'ozi nke onyeisi ha bụ Patrick Kaluna odeakwụkwọ ha bụ Dr. Uche Mbaka binyere aka ha sị, " N' anya anyị, nke a bụ ụzọ were anya ọchịchị gọọmenti etiti siri chọọ ịkpachapụcha ndị Igbo kpamkpam n'okwu Naijiria. Agwa a dị mkpasu iwe bụ ihe jọgburu onwe ya, anyị anabataghị ya."

Otu ahụ rụtụkwara aka na ụzọ ndị ọzọ ha na-ebo ebubo na gọọmenti etiti ghọnahụrụ ndị Ọwụwa Anyanwụ dịka "nhọpụta ndị bụ isi n'ọrụ nchekwa,ewuwewu mmepe obodo dịka okporoụzọ, ọkporo ụgbọ oloko, ọdọ ụgbọmmiri, nakwa ego a na-eketa n'akpa gọọmenti etiti nakwa iweta ndị nnyemaka mmepe obodo si ofesi(development partners ) bụ nke ha boro ebubo na a na-ewegakarị na mpaghara ndị ọzọ.

Aha onyonyo, Onnoghen: Ihe ndị nwere agba na-ekwu maka ya

Ha gara n'ihu kpoo Onyeisiala Muhammadu Buhari oku ka o lebagharịa anya na ya bụ mbulielu e mere.

Cheta na nsonso a, ngalaba na-ahụ maka ọrụ uweojii bụ "Police Service Commission (PSC)" nọrọ ọgbakọ ha bulie mmadụ anọ n'ọkwa Osote Osote Onyeisi Ndị uweojii( Assistant Inspectors General of Police) ma mekwa otu Komishona Osote onyeisi ndị uweojii(Deputy Inspectors General of Police).

Dịka Ikechukwu Ani bụ ọnụ na-ekwuru ngalaba na-ahụ maka ndị uweojii bụ 'Police Service Commission' (PSC) na Bekee, e bulikwara ndị ọzọ ha nyere ọkwa Komishona na ọkwa ndị ọzọ gụnyere:

Ndị e mere Osote onyeisi uweojii ọhụrụ(DIGs) bụ

1. AIG Usman Alkali Baba, (DIG Administration)

2. AIG Dan Mallam Mohammed,( AIG na-achịkọta Zone 13 Ukpo, Anambra Steeti);

3. AIG David Oyebanji Folawiyo, (AIG na-achịkọta Zone 17, Akure)

4 CP Joseph Egbunike,( CP, Budget.)

Mmadụ 13 nke e mere AIGs bụ

1. CP Augunbiade Lasore, (Komishona ndị uweojii Kebbi steeti.)

2. CP Uche Anozie, (ọ laala ezumike nka)

3. CP Kenneth Ebrimson, (ọ laala ezumike nka)

4. CP Undie J. Adie, (Komishona ndị uweojii Osun steeti.)

5. CP Olugbenga Adeyanju, Komishona ndị uweojii Adamawa steeti.)

6. CP Johnson B. Kokumo, onye bụ Komishona ndị uweojii Edo Steeti ugbua

7. CP Ajani O. Babatunde, Onyeisi Koleji ndị uweojii dị n'Ikeja(Commandant, Police College, Ikeja.

8. CP Olukolu Tairu Shina, (Ọ laala ezumike nka.)

9. CP Awunah N. Donald, onye bụbụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii gburugburu mana ugbua ọ ghọọla Onyeisi Koleji Ọzụzụ ndị uweojii na Jọs( Commandant, Police Staff College, Jos.

10. CP Hafiz Inuwa, Komishona ndị uweojii Delta Steeti.

11. CP Garba Baba Umar, Komishona ndị nweojii na-ahụ maka 'Interpol'.

12. CP Omololu Bishi, Komishona na-ahụ maka nwa ọgụ (CP, Armament.)

13. CP Isaac O. Akinmoyede, Komishona uweojii Imo Steeeti.

E bulikwara ndị Osote komishona uweojii iri abụọ na atọ n'ọkwa Kọmishọna.

Ha gụnyere:

1. DCP Godwin Akor Job( lalaara ezumike nka bụ onye bụbu osote Komishona uweojii na-ahụ maka nchịkọta Ndị uweojii Abia steeti

2. Abimbola Adebola Shokoya, DCP, OPS, Kwara;

3. DCP Christopher Owolabi, DCP Administration, Bauchi;

4. Olubunmi Osoka, DCP, OPS, Benue

5. Attahiru Isa, (ọ laala ezumike nka)

6. DCP Yekini Adio Ayoku, DCP Administration, Zone 6, Calabar;

7. Olufu Tony Adejoh, DCP Ops, Ebonyi.

8. DCP Ari Mohammed Ali, DCP Ops, Lagos

9. Mamman Sanda Umar

10. Aliyu Adamu

11. Haladu Musa Ros-Amson na ndị ọzọ.

E buliri mmadụ 29 bụbu ndị ACPs n'ọkwa DCPs

Ha gunyere:

1. Emmanuel Ola Toluse

2. Simeon Udofia Akpanudom

3. Osagie John Agans-Irabo, Area Commander, Aguata, Anambra State;

4. Adedamola Ayilara, Commander, PMF 2, Lagos;

5. Michael Okoh, Area Commander, Ajaokuta;

6. Hycenth Azuka Edozie, ACP, Ops FIIB FHQ, Abuja;

7. Betty Enekpen Otimenyin, bụbu onyeisi( Area Commander,) Eleme, Rivers Steeti ma bụrụ onyeisi( Area Commander), Mbaitoli, Imo State.

E buliri mmadụ 91 nọ n'ọkwa 'Chief Superintendents of Police' (CSPs) gaa n'ọkwa "Assistant Commissioners of Police"

Ha gunyere:

1. "CSP Olusegun Akanbi; CSP Stanley Egbo;

2. CSP Doughye Blessing;

3. CSP Timoty Olaolu;

4. CSP Emmanuel Anene Ogbuanya, DPO, B Division, Awka;

5. CSP Linus Ogbodo

6. CSP Samuel Awopetu, i/c MOPOL 16, Abeokuta, Ogun State

E mekwara mmadụ 599 Superintendents of Police

Ha gunyere:

1. Etim Okon Inyang, FCT Command,

2. SP Glory Udoka, O/C Gender Unit, State CID, Enugu

3. SP Celestina Tochukwu Amadi Kalu, onye bụbu ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Delta Steeti mabụụ onye bụ onyeisi Ogige ndị uweojii Ogudu, dị na Legos Steeti.