Democracy Day: Buhari emezụghị nkwa o kwere - Ohaneze, CUPP

Ohaneze Ndigbo
Nkọwa foto, Okwu.I.Okwu, Dubem Onyia na Chinedu Nebo

Dika a na eme mmeme ụbọchị ọchịchị onyekwuoucheya, ndị Ohaneze na CUPP ekwuola na Onyeisiala Muhammadu Buhari mezughị nkwa o kwere ndị Naijirịa ka ọ banyere n'ọchịchị n'afọ 2015..

Okwu a na-eso ihe Buhari kwuru na mmemme ụbọchị Ncheta ọchịchị onyekwuoucheya e mere n'Abuja ụbọchị Wenezde Juun 12, afọ a, ebe ọ sịrị na o mezuru nkwa o kwere gbasara nchekwa, akunauba obodo na nrụrụaka.

Onye odeakwụkwọ Ohaneze bụ Chuks Ilegbu gwara BBC Igbo na "Buhari nwara ike ya mana o zughị oke".

N'uche Ilegbu, Boko Haram, ndị ntọ, ndị Fulani ọchịehi na ndị ohi ka na-akpa mkpamkpa na mpaghara dị icheiche na Naijiria.

Aha onyonyo, Ụmụ Naịjirịa na-anwụ n'ọchịchị nchịgbu Buhari

Kenneth Udeze bụ ọnụ na-ekwuru otu jikọrọ otu ndọrọndọrọ ọchịchị anọghị na gọọmenti a kpọrọ 'CUPP' n'aha ịchafụ mabụrụkwa onyeisioche otu 'Action Alliance' si na " ọ bụghị eziokwu" na Buhari mezuru nkwa o kwere ụmụ Naịjirịa.

Udeze ọ sịrị "mmadụ ruru puku nari asaa bụ ndị nwụrụ n'ọchịchị nke Buhari."

Mana Joe Igbokwe bụ odeakwụkwọ na mgbasaozi otu APC kwuru na Buhari mezuru ihe o kwuru.

Aha onyonyo, O nweghi onye megidere ndị aka azụ na Naịjirịa ka Buhari

O kwuru na "e kwube maka nchekwa, ọ bu ndị daara ntunyeaka na-eme ihe ndị a ka o were dịka onyeisiala amaghị ihe o na- eme."

Ọ gara n'ihu kwụọ na "o nweghị onye rụrụ ọrụ megide ndị akaazu na Naịjirịa dịka onyeisiala siri rụọ."

Na otu aka ahu, onye odeakwụkwọ na Mgbasa ozi nkendi otu ndọrọndọroochịchị bu APC kwadoro Ọnyeisiala were kwuo si na 'onweghị onye ruru ọrụ megide ndị akaazu na Naịjirịa dịka ọnyeisiala siri lụọ. ọ natara ha ego, tinye ha na nga, nata ha ụlọ.

N'ihe gbasaara Umunwanyi na Ndọrọndọrọ ọchịchị

Stella Oduah

Ebe foto si, Stella Oduah on Facebook

Ndị a niile kwadoro ụmụnwaanyi isonye na ndọrọndọrọ ọchịchị n'ekwu na ihe ga-adi mma ma ọ bụru na ụmụnwaanyị sonye n'ọchịchị

Lee etu mmemme ụbọchị ọchịchị onyekwuouche ya siri were gaa: