Ka mmemme June 12 n'Abuja sị aga

BBC Igbo kwụ chịm na-ewetara unu akụkọ gbasara etu mmemme June 12 n'Abuja sị aga n'Abuja taa.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Jessica Nwankwo and Uche Akolisa

  1. Ọ bughị eziokwu, Buhari emeghị ọfụma n'okwu nchekwa, ọgụ megide nrụrụaka - Ohaneze,CUPP

    Ndigbo

    Ohaneze agbaghaala okwu onyeisiala Buhari kwuru na ya mezuru nkwa ya dịka o siri gbasa nchekwa, akụnaụba nakwa ọgụ megide nrụrụaka.

    Odeakwụkwọ mgbasaozi Ohaneze bụ Chuks Ilegbu gwara BBC Igbo na ‘ Buhari nwara ike ya mana ozughị oke n’ihina Boko Haram , ndị ntọ, ndị Fulaniọchịehi na ndị ohi ka na-akpa mkpamkpa na mpaghara dị icheiche na Naijiria.

  2. Buhari emechiela okwu ya n'emume ncheta ụbọchị ọchịchị onyekwuouche ya, Lee okpụrụkpụ okwu ya

  3. Buhari abaghariala amaegwuregwu Abuja, Moshood Abiola stadium

    N'ozi ya ya mmemme ncheta ọchịchị onyekwuoucheya na Naijiria, Buhari gbanwere aha amaegwuregwu etiti dị n'Abuja, Moshood Abiola Stadium.

    Amaegwuregwu Moshood Abiola

    Ebe foto si, Getty Images

  4. Emezuola m nkwa atọ m kwere- Buhari

    Buhari

    Ebe foto si, @FMIC

    Nkọwa foto, Onyeisiala Naijiria, Muhammadu Buhari ka ọ na-agwa ụmụ Naijiria okwu

    N'ozi ya taa, onyeisiala Muhammadu Buhari kọwara na ụbọchị ta bụ ụbọchị pụụ iche n'ihi na ọchịchị nkịtị sị na aka ndị nkịtị banyekwa n'aka ndị nkịti.

    O kwuru na "E nyere m Inec ohere ịrụ ọrụ ha na-enweghị mgbochi ọbụla."

    O kerele ndị Naijiria maka ị tụnyere ya na ntuliaka 2019.

    O kerele ndị ọrụ nchekwa maka iti ya onwe ha n’ihe egwu dịka ha na-echekwa ụmụ Naijiria.

    Buhari onyeisiala Naịjirịa
    Nkọwa foto, Ọkpụrụkpụ okwu Buhari n'okwu ya

    Ọ rụtụrụ aka na ya kwere nkwa atọ; nchekwa, ịkwalite akụnaụba na ibu agha megide nrụrụaka.

    ma kwụọ sị, " ọ nweghị onye ga-agbagha na m emezuola nkwa ndị a niile."

    Kemgbe ndụ abụ onye ọrụ oyibo, o nweghị ọrụ ọzọ nwere.

  5. E ji ịkụ na ịgba egwu merụba ụbọchị

    Ndịagha Naijiria, nakwa ndị otu egwu ọdịnala dị icheiche mere ihe ngosi iji mee ndị mmadụ obi Ụtọ.

  6. Ndị chiburu Naịjirịa dịka Obasanjo, Jonathan na IBB abịaghị emume June 12, Buhari na-elegharị ndị ọrụ nchekwa

    Nke a bụ mbụ a na-eme emume ọchịchị onyekwuouche ya.

    Ndị ndụ ọtụtụ mba ụwa bịara mana ndị chiburu Naịjirịa dịka Obasanjo, Jonathan na IBB abịaghị emume a.

    Buhari na-elele ndị ọrụ nchekwa n'emume Juun 12
    Ndị bịara emume Juun 12
  7. Ihe ndị mmadụ ghọtara maka mpụtara ọchịchị onyekwuouche ya, Gee ihe ndị mmadụ nwere ikwu maka nghọta ọchịchị onyekwuouche ya ebe a

    Aha onyonyo, Democracy day: Kedụ etu i si hụta ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa?
  8. Etu si APC gosi onwe ha

    Otu APC gosiri na ụka a kpara akpa na-eji isi ekwe ya dịka ha ndị ha na onyeisiala kwadoro meriri ndịka onyeisi na osote ya na ntuliaka Onyeisi Sineti na nke Ụlọomeiwu Nta.

    Bido n abali ole na ole tupu ụbọchi a kara aka, Onyesiala Muhammadu Buhari na Goje zukọọ o were wetpụ aka ya na ịzọ ọkwa ma hapụụ ya Ahmed Lawan.

    N'aka nke Ọzọ, Gnbajambiamila nwetarakwara nkwado ndị pati ya dịka tupu ntuliaka nke ha amalite, ọtụtụ Ndi APC na-eti aha ya na mkpu ka aga asị na o meriela.

    Ebumnuche ha mechara mezuo, ebe PDP nakwa Ndigbo nọ n'ụlọomeiwu gbara aka laa ka Aarọn.

    Lawan,Omo-Agege,Wase na Gbajabiamila

    Ebe foto si, @NGRSenate/@FMICNigeria

  9. Rochas anatala asambodo mmeri ya

    Dịka mmemme ntuliaka ụlọomeiwu nke Itoolu na-aga n'ihu, Inec nyere Rochas Okorocha asambo mmeri dịka Sinetọ na-anọchite Imo-West.

    Nke a na-eso mmeri o nwetara n'ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja nke nyere Inec iwu ka ha nye ya akwụkwọ mmeri ya.

  10. Gbajabiamila emeriela dịka onyeisi Ụlọomeiwu Nta

    Femi Gbajabiaiala nke APC emeriela dịka onyeisi Ụlọomeiwu Nta.

    O jiri vootu dị nari atọ iri asatọ na otu (381) merie Bago Mohammed onye nwetara iri asaa na isii(76) na ntụliaka ndị nnọchiteanya mmadụ narị atọ iri ise na asatọ tụrụ vootu.

    Otu Vootu adịghị mma.

    Gbajabiamila

    Ebe foto si, @Femigbaja/BBC Igbo

  11. Onye bụ Gbajabiamila?

    Femi Gbajabiamila bụ onye ọkaiwu na onye otu ndọrọndọrọ APC.

    Ọ bụ ya ka e chere gara abụ onyeisi Ụlọomeiwu Nta n'afọ 2015 mana, o ruteghi ya aka.

    Ya na Bago Mohammed na-azọ nzọ oche onyeisi ụlọomeiwu nta.

  12. Onye ga-abụ onyeisi Ụlọomeiwu Nta: Gbajabiamila ka ọ bụ Bago?

    Femi Gbajabiamila

    Ebe foto si, @Femigbaja

    Jubrin Abdulmin Adulmumin kpọpụtara FemiGbajabiamila dịka onyeisi Ụlọomeiwu Nta ebe Lynda Ikpeazu kwadoro ya.

    N'aka nke ọzọ, Abubakir Yunusa Ahmed Umah Bago Mohammed.

    mmadụ abụọ a kpọpụtara kwadoro mkpọpụta a kpọpụtara ha.

    Hon Bago

    Ebe foto si, @HonBago

  13. Agha a kara aka...

    Ụlọomeiwu Nta

    Ebe foto si, NTA

    Mgbe Ụlọomeiwu bidoro ịgụpụta akwụkwọ ozi si n 'aka onyeisiala Muhammed Buhari.

    Ọ kpọpụtakwara ndị so n' ọgbakọ ụlọomeiwunta nke itolu.

    Onye a kpọrọ, ọ zaa aha ya.

    Ndị si Ọwụwa-Anyanwu nọ na ya gụnyere:

    Abia

    Kalu Benjamin Okezie

    Samuel Onuigbo

    Nwokeocha Darlington Ezinwa

    Solomon Adaelu

    Uko Ndukwe

    Anambra

    Umeoji Chukwuemeka.

    Valentine Ogbonna

    Onyema Wilfred

    Chuba Ikpeazu Lynda

    Ezenwankwo Okwudili

    Imo

    Emeka Martins Chinedu

    Paschal Obi

    Ugonna Ozurigbo

    Uchenna Eke

    Enugwu

    Nnaji Corneluis

    Oke Martins

    Nnaji Nnolim John

    Asadu Patrick Oziokoja

    Okechukwu Toby

  14. Ọ na-akpọtụ n'Ụlọomeiwu Nta

    Dịka emume n-aga n'ụlọomeiwu Ukwu, ọ na-akpọtụ akpọtụ n'ụlọomeiwu nke nta dịka ntuliaka maka ọkwa ndị ndụ ha na-ebiri ọkụ.

    Ụfọdụ n-eti mkpu, ụfọdụ na-akụ aka, ebe ụfọdụ dọrọ n'oche ha na-ele ka ihe si aga.

    maadụ 360 na-anọchite mpaghara dị icheiche na Naijiria zụkọrọ n'ọgba ha.

    Anya ahụbeghị onye ojeozi ụlọomeiwu onye ga-edu ha n'emume ntuliaka nke ha.

    Ụlọomeiwu Nta

    Ebe foto si, House of Representative

  15. Onye bụ Ahmed Lawan?

    Ọ bụ onye na-anọchite Yobe-North n’ụlọomeiwu Ukwu nke Itoolu.

    Lawan onye bụbu onye nkuzi mahadum tupu ọ banye ndọrọndọrọ ọchịchị n’afọ 1999 oge ọ banyere n’Ulọomeiwu nke Nta .

    O banyere na Sineti n’afọ 2007.

    A họpụtakwara ọzọ dịka sinetọ n’afọ 2011 n’aha pati ANPP.

    Ahmed Lawan

    Ebe foto si, Ahmed Lawan

  16. E duola Omo-Agege dịka Osote onyeisi Sineti

    O kwere nkwa ichekwa Iwu Naijiria ma dowekwa iwu usoro akpama agwa (Code of Conduct).

    Omo-Agege

    Ebe foto si, Channels TV

  17. Omo- Agege emeriela dịka Osote onyeisi Sineti

    Ovie Omo-Agege nke APC emeriela na ntuliaka niji nweta ọkwa Osote onyeisi Sineti na ntuliaka e mere.

    Omo-Agege nwetara vootu 68, ebe Ekweremadu nwetara vootu 37

    Ozigbo ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere onyeisi Sineti ọhụrụ bụ Ahmed Lawan gara kwee ya n'aka.

    Ihe mere bụ n' APC enyeghị ohere ọbụla ka ndị anọghị na pati ha.

    Ovie Omo-Agege

    Ebe foto si, Sen Ovie/Twitter/BBC Igbo

  18. E bidola ịgụ vootu

    Ka ọ dị ugbua, e bidola gụwa vootu a tụtara na ntuliaka ọkwa osote onyeisi Sineti nke Itoolu.

    Agụmvootu

    Ebe foto si, Channels TV

  19. Onye bụ Omo-Agege?

    Ovie Omo-Agege bụkwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị nwere agba ma bụkwa ọkaiwu.

    Ọ na-anọchite Delta-Central n'Ụlọomeiwu Ukwu.

    A na-arụrụ ya aka n'ebubo ndị zigara ndị agboro gara zuru ọfọ Sineti n'oge agba nke asatọ nke Ụlọomeiwu Ukwu n'ọnwa Apreel, 2018.

    Ovie Omo-Agege

    Ebe foto si, Sen Ovie/ Twitter

  20. Onye bụ Ekweremadu?

    Ike Ekweremadu bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị a ma ama n'Naịjiria.

    Ọ nọọla n'Ụlọomeiwu Ukwu kemgbe afọ 2003 dịka onye na -anọchite Enugwu-West.

    Onye otu PDP, Ekweremmadụ arụọla ọrụ dịka Osote Onyeisi Sineti ụgboro abụọ. Nke bụ bụ yana David Mark(2003), ebe nke abụọ bụ ya na Bukola Sarakị(2015-2019)

    Ekweremadu

    Ebe foto si, Ike Ekweremadu