Ọ bughị eziokwu, Buhari emeghị ọfụma n'okwu nchekwa, ọgụ megide nrụrụaka - Ohaneze,CUPP

Ohaneze agbaghaala okwu onyeisiala Buhari kwuru na ya mezuru nkwa ya dịka o siri gbasa nchekwa, akụnaụba nakwa ọgụ megide nrụrụaka.
Odeakwụkwọ mgbasaozi Ohaneze bụ Chuks Ilegbu gwara BBC Igbo na ‘ Buhari nwara ike ya mana ozughị oke n’ihina Boko Haram , ndị ntọ, ndị Fulaniọchịehi na ndị ohi ka na-akpa mkpamkpa na mpaghara dị icheiche na Naijiria.


















