Justice Onnoghen: Nnia Nwodo, ndị gọvanọ ọdịda anyanwụ na ọlụọla Niger Delta etinyela ọnụ

Ebe foto si, National Judicial Council
Anụbeghị okwu ikpeazụ gbasara ikpọpụ ọkaipe kachasị na Naịjirịa ụlọikpe akpọrọ Code of Conduct Tribunal (CCT) taa bụ Jenụwarị iri na anọ.
Onyeisi Ohaneze ndị Igbo bụ Nnia Nwodo kwuru na udiri mkpebi a nwereike itinye Naịjirịa na nnukwu ọgbaghara ga-ebute ọtụtụ ikwafụ ọbara.
Otu ọlụọla si na "Niger Delta" dọrọ onyeisiala aka na nti na ọ bụrụ na ọ kwụsịighị atụmmatụ a, na ha ga-awakpo ebe niile a na-arụpụta mmanụ agbidi na Naịjiria.
Onye ozi Niger Delta Watch dogs, coalition of Niger Delta agitators bụ John Duku depụtara nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara ụnyahụ.
Ndị gọvanọ ọdịda anyanwụ gụnyere gọvanọ isii gwara Onnoghen n'ọgbakọ mere ụnyahụ bụ Jenụwarị iri na atọ na ya gbachị oku ọbụla Code of Bureau kpọrọ ya.
N'okwu ha, " ọ bụ eziokwu na anyị anaghị agba ibuso nrụrụaka agha mgba mana udiri a ekwesighị ekwesi makana iwu obodo akwadoghị ya."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1

Ebe foto si, National Judicial Council/Kemi Adeosun
Okwu banyere ịkpọpụ ọkaikpe Walter Onnoghen abụrụla ihe ọtụtụ ndị mmadụ ji atụnyere nke Kemi Adeosun n'ụzọ dị iche iche.
Ụfọdụ ndị kwuru na ebe Kemi Adeosun gbara arụkwaghịm n'ọrụ n'ihi asambodo adịgboroja na Onnoghon kwesiri n'otu aka ahụ ịgba arụkwaghịm.
Souljah kwuru na ndị ire abụọ katọrọ Kemi Adeosun kpụzi akwụkwọ iwu n'ọnụ ugbua:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ha kwuru na ihe ọjọọ bụ ihe ọjọọ agbanyeghi onye mere ya, na onweghi onye karịrị iwu na-achị Naịjirịa.
David Atta kwuru na Kemi Adeosun mere ihe ọjọọ ndị mmadụ akpụrụ ya n'ọnụ na ugbua bụ oge nke Onnoghen ị zara ọnụ ya:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Ebe ndị ọzọ kwuru na a kpọpụghi Kemi Adeosun n'ụlọikpe, na e kwesighi ịkpọpụ ọkaikpe Onnoghen n'ụlọikpe.
Bubeangel kwuru na oge nke Adeosun na Buhari nyere aka kpọpụya na mba ofesi mana ọ chọrọ ịkpọpụ Onnoghen n'ụlọikpe:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Sịnetọ Shehu Sani nke Kaduna Steeti kwuru na ikpọpụ Onnoghen n'ụlọikpe bụ imetọ ikike na-eche ikpe ziri ezi na Naịjirịa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 5
N'aka nke ọzọ onye bụbu onyeisi otu jịkọtara ndị ọkaiwu na Naịjirịa (NBA) bụ Olisa Agbakoba kwuru na etu esi kpọpụ ọkaikpe Onnoghen n'ụlọikpe adịghị mma.
O kwuru na ọ bụ otu jikọtara ndị ọkaikpe kwesiri ibu ụzọ nyocha Onnoghen ma ọ bụrụ ọkaiwu gọọmenti bịa kpesara ha.
Agbakoba gwara BBC na ọkaikpe Onnoghen nwere ikike na-echekwa ya na ikpe a agaghị adị mfe n'okpukpe.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:









