Justice Onnoghen: A ga-akpụpụ Ọkaikpe ukwu Naịjirịa Ụlọikpe?

Ebe foto si, National Judicial Council
Ozi ọnụ na-ekwuru ngalaba na-ahụ maka mkwupụta akụnaụba ndị no ọrụ ọha bụ nke akpọrọ Code of Conduct Tribunal (CCT) na Bekee bụ Ibraheem Al-Hassan binyere aka na-akọwa na aga akpụpụ Ọkaikpe Naịjirịa ụlọikpe n'ụbọchị Monde.
Ozi ahụ kwuru na Ọkaikpe Onnogehn Nkanu Walter Samuel ga-aga zara ọnụ ya maka ekwupụtaghị akụnaụba.
Ozi a kwuru na ọ bụ ngalaba Code of Conduct Bureau (CCB) tinyere akwụkwọ na CCT ka amalite ikpe Ọkaikpe Onnoghen ikpe.
Iwu Naịjirịa hibere na onye ọbụla chọrọ ịrụrụ ọha ọrụ ga-ekwupute ma detuo akụnaụba ya niile.
Ọ bụ na aka CCB ka a na-edetu ọnụọgụgụ akụnaụba mmadụ nwere.
Ndị ga-etinye anya n'okwu a bụ ndị gụnyere Ọkaikpe Danladi Y. Umar.
Dịka akwụkwọ ozi siri kwuo, ebubo isii dị n'akwụkwọ ebubo bu aha Okaikpe Onnoghen.
Ọ bu n'afọ 2016 ka Ọkaikpe Ọnnoghen rigoro ọkwa dịka Ọkaikpe Naịjirịa, mana ọ bụ nA 2017 ka echere ya iyi ọrụ.
Nke a ga-abụ mbụ a na-akpụpụ Ọkaikpe kachasị na Naịjirịa ụlọikpe.
Ebubo bidoro dịka otu kpọrọ onwe ha Anti-Corruption and Research Based Data Initiative (ARDI) depụtara ozi si ka emee Onnoghen nyocha.










