2019 Elections: Onye ọbụla rere vootu ya, erela ọdịnihu ya
Akụkọ dị mkpa
Onye ọbụla rere vootu ya erela ọdịnịhụ ya.

Nke a bụ okwu onyeisi ụlọụka katọlịk na Legọs bụ Archbishop Adewale Martins gwara ndị ụlọụka ya.
Ọ gwakwara ha sị ha gba mbọ tụnyere onye ga-echekwa ma kpuchie okwuke ha.
O ji ohere ahụ gwa ndị mmadụ ha ga nata akwụkwọ ntụlịaka ha bụ "Voter's card".
Ọzọ,

Ebe foto si, National Judicial Council
A ga-akpụpụ onye ọkaikpe kachasị na Naịjirịa ụlọikpe ị zara ọnụ ya maka ebubo ịkpachi akụnaụba ya.
Na mba ofesi,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Mmadụ atọ anwụọla dịka ndị ọzọ ruru iri anọ n'asaa merụrụ ahụ mgbemgbawa si n'ụlọ achịcha mara obodo Paris jijiji n'ụtụtụ ụbọchị satọde na mba Frans.
N'egwuregwu
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Aha otu egwuregwu Arsenal nakwa West Ham na-ewu ewu ugbua dịka ha sọkọtara mpị n'ụbọchị satode
Otu WestHam ji otu ọkpụ goolu asataghị otu merie Arsenal.
Akụkọ mere taa n'otu nkeji
Abaribe na arịọ ụloikpe mkpeghari arịọ

Ebe foto si, BBC/ElliotUkoh/@realFFK
Onye na-anọchịte Abia saụt na ụlọ omeiwu Naịjirịa bụ Enyinnaya Abaribe agaala ụlọikpe mkpegharị n'Abuja ịrịọ ka akagbuo ikpe enyere ka ya na mmadụ abụọ ọzọ nara Nnamdi Kanu n'akaebe weta nde nari naira ha ji naa ya bụ aka ebe.
Abaribe sịkwa ka ụlọikpe ahụ kagbuo aha ya n'ime ndị nara akaebe ahụ.
Ọ bụ ụbọchị nke iri na anọ n'ọnwa Janụwarị ka ọkaiwu Binta Nyako nyedebere ka akwụta ya bụ Ego.
Ndị uwojii sị na Saraki ekwughi eziokwu

Ebe foto si, @bukolasaraki
Ndị uweojii Naịjirịa akatọọla ihe onyeisi ndịomeiwu Naịjirịa bụ Bukola Saraki kwuru banyere ọnya ọ sị ndị Uweojii dọọrọ ya na ezinaụlọ ya iji memina ha.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naịjirịa bụ Jimoh Moshood sị na-onweghi mgbe ndị uweojii ji na-akwado, maọbụ na-echekwa ndị isi aba okpu Saraki sị bịara ọgụ na be ya.
Moshood sịkwa na ndị uweojii na-echekwa Saraki ka nọ ọrụ ha.
N'ofesi,

Ebe foto si, Getty Images
Mgbachi ụlọọrụ gọọmenti na Amerika abanyela abalị iri abụọ na otu nke mere ya mgbachị nke kachasi nọtee aka kemgbe Amerịka malitere.
Mgbachị a sitere na ndọrọndọrọ ndị omeiwu pati na-anọghị n'ọchịchị na onyisiala Donlad Trump na-enwe maka ego ọchọrọ ka eji rụọ mgbidi n'oke Amerịka na Mexico
N'asọmpị CAF Campions League

Ebe foto si, Getty Images
Otu egwuregwu Lobi stars nke Naịjirịa ji ọkpụ goolu abụọ asatara ọtụ ji mepe njem ha mgbe ha zutere Mamelodi Sundowns nke Saụt Afirịka na ọgbọ egwuregwu Nnamdi Azikiwe dị n'Enugwu.
Lobi ga-aga Ivory Coast n'ụbọchi nke iri na itoolu nke ọnwa Janụwari ga soro Asec Mimosa sụọ mpị.
Gee akụkọ ndị a ebe:
Ihe nkiri nke ụtụtu a:











