Oba Akintunde Akinyemi nke obodo Iselu anapụla Rochas Okorocha ara n'ọnụ

Ebe foto si, Oba Akinyemi/Rochas Okorocha
Ọba Akintunde Akinyemi bụ eze obodo Iselu dị n'Okpuru ọchịchị Yewa-North ekwuola na ya anapụla Senetọ Rochas Okorocha ọkwa nkwanyere ugwu pụrụ iche n'ala Yoruba ya na ndị imeobi ya nyeburu ya.
A họpụtaburu Okorocha dịka 'Otunba Asoludero nke obodo Iselu " nke pụtara 'Ichie Ọkpa udo nke obodo Iselu" dị na Yewa-North nke Ogun steeti.
N'akwụkwọozi nke o binyere aka ya ma wepụta n'abalị itoolu nke ọnwa Ọgọstụ, afọ 2021,Oba Akinyemi sịrị na mmemme ịji mejupụta nhọpụta Okorocha nke e tinyeburu n'abalị iri na itoolu nke ọnwa Septemba agaghị enwekwa isi ọzọ.

Ebe foto si, Oba Akintude Akinyemi
Ozi ahụ kwuru sị, " mụnwa bụ Ọba Ebenezer Akintunde Akinyemi, Eselu nke Alaeze Iselu dị na Okpuru Ọchịchị Yewa-North dị n'Ogun steeti ji obi mwute edetara gị akwụkwọ iji gwaa gi na a napụla gị nhọpụta gị dịka "Otunba Asoludero nke Alaeze Iselu ma na-akagbukwa mmemme ichi gị ya bụ echichi."
O kwuru na dịka ya na ndị imeobi ya nwere mkpebi inye Okorocha nkwanyere ugwu ahụ, ha degara ya akwụkwọ ozi, na o nydre ha ọsịsa ebe ọ nabatara ya ma sị ha hiwe mmemme ya n'abalị 19 nke ọnwa Septemba.
Mgbe BBC Igbo kpọrọ Ọba Akinyemi n'ekwentị, o kwuru n'ezie na ọ bụ ya dere akwụkwọ ozi ahụ mana ya agaghị ekwubela ihe mere ya jiri gbanwee obi ya ma napụ Okorocha ọkwa o nyerela ya.
Okorocha kwuru na ya bụ ihe mere dịka e siri kwuo ya.
Onye nnyemaka ya n'ihe gbasara soshal midia, bụ Ebere Nzewuji gwara BBC Igbo n'ekwentị sị, "O nwee ihe ndị eze Yoroba gwara ụnụ, ụnụ were ya etu ahụ."
Akụkọ ga-amasị gị:
- Sexual Harrassment: Andrew Cuomo agbaala arụkwaghịm dịka gọvanọ New York
- Etu ndị ọrụ nchekwa siri gbaa ụlọ ọrịrị abụọ ọkụ n'Orlu, Imo Steeti
- Ọkaiwu Nzeribe akpọpụtala 'ungun Judicial known man' - Rochas Okorocha
- Harrison Gwamnishu na 'Egbeigwe' ekpeziela
- E gburu otu onye ma gbaa ụgbọala ndị mmadụ ọkụ n'Onicha, Ebonyi Steeti














