Orlu News: Ndị uweojii Naịjirịa anwụchiela onyeisi nchụaja ha sị na ọ bụ onye Ipob

Onyeisi nchúaja

Ebe foto si, Others

Ka na-ekwu nke a na-ekwu, ndị uweojii Imo steeti akparala onyeisi nchụaja ndị Life Sabbath Synagogue Amii dị n'Akabọ, Okpuruọchịchị Ikeduru n'Imo steeti.

Ndị uweojii sị na Ikechukeu Umaefulem bụ onye na-esuru ndị otu Ipob atịkpa.

Ha sị na ha nwetere egbe chakakpim, mkpọnala, nsịegbe, ọkọlọtọ Biafra.

Etu ndị ọrụ nchekwa si gbaa ụlọ oriri abụọ ọkụ n'Orlu, Imo Steeti

BBC Igbo garuru Orlu, ebe akụkọ na-ekwu na ndị ọrụ nchekwa bịara n'ike ha were wakpoo ma gbaa ụlọoriri abụọ ọkụ n'Orlu, Imo Steeti.

Orlu, Imo State

Onye ntaakụkọ anyị chọpụtara na ya bụ akukọ bu eziokwu na ndị ọrụ nchekwa gbara ya bụ ụlọ ọkụ ma nwuchie umu nwoke na ụmụ nwaanyị bụ ndị ha hụrụ na ya bụ ụlọ oriri mgbe ha wakporo ya.

Ndị ntoroọbịa Amaefeke bụ ebe otu n'ime ụlọoriri ndị a nke aha ya bụ "Evening Paris" nọ ekweghị ka onye ntaakụkọ BBC Igbo seta ihe onyonyo ebe ahụ maọbụ zaa ajụjụ ọbụla ọ jụrụ ha.

Ebe nke ọzọ ndị ọrụ nchekwa wakporo bụ ụlọ obibi mmadụ dị n'obodo Okwuabala nke dị n'Orlu n'ụtụtụ Mọnde.

Awakporo ụlọ obibi a n'Ọnịcha, Imo Steeti
Nkọwa foto, Awakporo ụlọ obibi a n'Ọnịcha, Imo Steeti

Egwu nọ na mpaghara Okwuabala dịka ndị mmadụ ekweghị ịza ajụjụ onye ntaakụkọ anyị jụrụ ha maka ihe mere.

Kama otu onye gwara BBC Igbo okwu na nzuzo kwuru na ndị nchekwa enweteghị onye nwe ya bụ ụlọ oge ha bịara.

Mgbe BBC Igbo rutere Ihite Owerri bụkwa ebe ndị nchekwa wakporo ụlọ ọriri bụ Kappa Inn.

Ndị kwere ikwu okwu na nzuzu kwuru na ya bụ Kapa Inn bụ ebe ndị akwụnakwụna na ndị omekome na anọ.

Onye na-ekwuchitere ndị uweojii Imo Steeti bụ Mike Abattam kwuru na ndị gara ya bụ ọrụ ka nọ n'iru ọrụ ma sị na ha rụchaa ọrụ ha na ọ ga-ewepụta akwụkwọ ozi maka ihe mere.