AbdulRasheed Bawa: Senate Naịjirịa akwadola nwa amadi a dịka onyeisi ọhụrụ EFCC

Ebe foto si, Screengrab
Ndị ụlọ omeiwu ukwu na Naịjirịa enyela Abdulrasheed Bawa Nkwado dịka onyeisi ngalaba mgbochi mpụ a kpọrọ 'Economic and Financial Crimes Commission' na bekee.
Nke a mere n'ụbọchị Wenezde dịka ndị omeiwu ahụ gbachara Bawa ajụjụọnụ n'ọgbakọ ha.
Bawa ga-anọchi Ibrahim Magu bụ onye gọọmentị etiti boro ebubo nrụrụaka na nnupu isi ma chụtuo ya n'ọkwa.
N'oge a na-agba ya ajụjụọnụ, Bawa kwere nkwa na ya ga-eji ike ya niile nakwa ọgụgụisi ya niile wulie ngalaba EFCC ma iji hụ na aka ga-akpara ndị niile na-ezu Naịjirịa ohi.
O kwukwara na ọ ga-eji ọzụzụ ọ natara na ngalaba mgbochi mpụ nke mba Amerịka bụ FBI mee ka EFCC kwụrụ chịm.
Bawa kwuru sị: "Dịka onyeisi EFCC, iwu Naịjirịa ga-abụ ebe mgbakwasa ụkwụ m."
"Aga m emekwa ka ọrụ anyị niile bụrụ ihe ga-agba n'anwụ ma bụrụkwa ihe onye ọbụla ga-ejide anyị aka ma anyị mejọọ."
Onye bụ Abdulrasheed Bawa Buhari họpụtara dịka onyeisi EFCC?

Ebe foto si, EFCC
AbdulRasheed Bawa bụ onye ọhụrụ onyeisiala Naịjirịa họpụtara ka ọ bụrụ onyeisioche ọhụrụ ngalaba na-ebuso mpụ na nrụrụaka agha bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC).
Buhari wegara sineti Naịjirịa aha Abdulrasheed Bawa ka ha binye aka na ọ ga-abụ onyeisioche ọhụrụ EFCC.
O mere nke a n'akwụkwọ ozi o zigaara onyeisi ndị ụlọomeiwu bụ Ahmad Lawan.
Bawa dị afọ iri anọ bụ onye nnyocha mpụ na nrụrụaka ndị ọzọ metụtara ego.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ọ gụrụ Economics na Mahadum ma bụrụkwa otu onye mbụ ahọpụtara n'ọrụ ndị otu EFCC kemgbe afọ 2005.
Ọ bụrụ na ndị sineti kwenye ka ọ bụrụ onyeisioche ngalaba ahụ, Bawa ga-abụ onyeisioche EFCC kacha bụrụ ntorọbịa kamgbe ehibere ngalaba ahụ.
Onyeisiala Buhari wepụrụ Ibrahim Magu bụbụ onyeisioche ngalaba ahụ n'ọnwa July 2020 maka ebubo mpụ na ọ riri ego nakwa ihe ndị anapụtara ndị mmadụ mere mpụ ma zuo ohi/
Ka ọ pụchara, Mohammed Umar bidoro rụwa ka onye nnọchite anya onyeisioche ngalaba ahụ.
Ibuso mpụ na nrụrụaka so otu ihe dị ọchịchị Buhari mkpa kamgbe afọ 2015 ọ banyere ọkwa ahụ mana ndị na-ekwu na ọ naghị agacha ọfụma etu esi che.









