Nigeria political party primaries: Kedụ etu m ga-esi bụrụ ‘delegate’?
Kamgbe e mechara ntuliaka ime ụlọ nke otu ndọrọ ọchịchị na Naịjirịa, ọtụtụ mmadụ na-aju ese etu ha nwereike iji bụrụ 'delegate'.
Mana tupu ị na-eche echiche ịbụ otu n'ime ha, ọ dị mkpa ka ị bu ụzọ mata ndị bụ 'delegate'.
Kedụ ndị bụ 'delegates'?

Ndị delegates bụ ndị so n’ime otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị a họpụtara n’ụzọ pụrụiche ka ha nwee ike ibinye aka n’oge ntuliaka ime ụlọ ma họpụta ndị ga-eji ọkọlọtọ otu ahụ azọ ọkwa dị iche iche. Ndị delegates na apụta ihe ma ọ bụrụ na otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị agbaso ntuliaka ime ụlọ a kpọrọ ‘indirect primaries’. E nwere ndị delegates ụzọ abụọ, nke mbụ bụ ‘adhoc delegates’ bụ ndị a họpụtara nwa obere oge iji họpụta ndị ga-azọ ọkwa. Ọzọ bụ ‘statutory delegates’ bụ ndu ndu maọbụ ndi ji ọkwa n’otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ma adhoc ma statutory delegates, na-arụcha otu ọrụ
Iwu Naịjirịa ọ kwadoro 'delegate'?
Iwu ntuliaka afọ 2022 (electoral act 2022) sị na pati ọbụla ga-agbasọ ntuliaka ime ụlọ a kpọrọ 'direct primaries maọbụ i'ndirect primaries'.
Onye jiri indirect primaries, mee ntuliaka na ọ bụ na a ga-ahọpụta delegates pụrụiche nke bụ na ndị ‘statutory delegates’ agaghị esonye.
Ndị ụlọomeiwu mere iwu ọhụrụ nke sị ka ‘statutory delegate’ soro họpụta onye ga-azọ ọkwa mana Onyeisiala Muhammadu Buhari etinyebeghi aka na ya.





