2023 General Election: Mkpu nnwereonwe, EndSARS na ihe asaa dị mkpa ga-ekwu onye ga-abụ onyeisiala n'afọ 2023

Ebe foto si, Getty/EPA
- Onye dere ya, Uche Akolisa
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
Ntuliaka Onyeisiala afọ 2023 agaghị abụ ụtaba achị n'aka ete egwu n'ihi na ọ bụ okwe amaghị onye ọ ga-adanyere.
Dịka otu onye na-agba mbọ maka ikike dịịrị onye mabụrụkwa onyeisi otu 'Vote,Not Fight Campaign' bụ Nonso Orakwe kwuru na "Ntuliaka 2023 agaghị adị ka ntuliaka ndị emerela n'oge gara aga."
"Ọ gaghị adị mfe, Mbụ ndị mmadụ na-asị na ọ gbasaghị ha, ugbua ndi mmadụ apụtala, ma obere nwa ma nnukwu, chabanye n'ihe a na-eme ."
Ndị pụtara ịzọ ọkwa bụ ndị nwere mbu nwee mfụ nke na ọ ga-esi ike ikwuteli kpọmkwem, onye ga-emeri na ya ntuliaka
Lee ụfọdụ ihe ndị ọnụ na-eru n'okwu na-ekwu ga-arụtụ aka na onye ga-emeri na ntuliaka onyeisiala na-abịa:
1. BVAS/Inec

Ndị okwu ndọrọndọrọ ọchịchị obodo were anya dịka Orakwe kwuru na ebe Inec kwụ na etu ntuliaka ga-esi ga-eso ekwu onye ga-emeri na ntuliaka.
"Ọtụtụ ụmụ Naijiria ihe ruru pasenti 30-40 na-atụ uche maka ebe Inec kwụ na ntuliaka a."
"Inec so na ihe ndị nwere ike idozie maọbụ mebie ntuliaka."
"Ọ bụrụ na Inec nwee onye ha bu n'obi ịkwado na ntuliaka, ọ ga-emetụta onye ga-emeri na ntuliaka. Ndị mmadụ na-atụ uche maka etu ha ga-esi mee ntuliaka 2023."
"Ndị mmadụ na-ajụ ajụjụ etu e si agba ụlọọrụ Inec ọkụ n'Ọwụwa Anyanwụ? A na-agba Inec ọkụ n'Ugwu Awụsa otu a."
"Kedụ ihe mere o jiri bụrụ naanị n'Ọwụwa Anyanwụ ka a na-agba Inec ọkụ?"
"Ndị si na a gaghị eme ntuliaka nwere ike na-amụnye ya ọkụ."

Onyeisi Inec bụ Mahmood Yakubu ekwuola na ụlọọrụ ahụ ga-eji akọrọngwa 'Bimodal Voter Registration System' a kpọrọ 'BVAS' n'ịchafụ na ntuliaka 2023.
BVAS bụ igwe ji akara aka na ihu mmadụ amata onye bụ onye na ndị na-atụ vootu.
Inec ga-ejikwa teknụzụ IReV nke e ji ezipụ mpụtara ntuliaka n'ọdọ atụmvootu ozigbo rụọ ọrụ ntuliaka 2023
Ntuliaka 2023 ga-abụ ntuliaka Onyeisiala mbụ a ga-eji igwe 'BVAS were mee.
Ndị ma ihe ekwe na-aku na ekwu na ọ ga-ebelata wuruwuru na-eso ntuliaka.
E jiri BVAS mee ntuliaka na Ekiti na Osun steeti bụ ebe ndị okwu ndọrọndọ®ọ ọchịchị were anya kwuru na onyere ohere ka ọ bụrụ ndị ọha ndị obodo tụụrụ vootu meriri na ntuliaka.
Ka ọ dị ugbua, onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari ekwuola hoohaa na ọ bụ mmasị ya na ntuliaka 2023 ga-adị ka nke e mere n'Ọsụn na Ekiti steeti , na-enweghị mago mago ọbụla, maọbụ ntịnye aka nke gọọmenti.
2. Soshal midia

Ebe foto si, Getty Images
Soshal midia nwere ezi uru ọ bara na ntuliaka dịka e ji ya agbasa ozi ma na-akụziri ndị mmadụ ihe dị mkpa maka ntuliaka nakwa ndị na-azọ ntuliaka.
Ụfọdụ ndị ọrụ na-eru n'okwu mmadụ na-ekwu na ọ bụ soshal midia mere ka aha onye na-asọ ọkwa onyeisiala n'aha otu Labour Party bido wuwee.
Na nkọwa, etu soshal midia ga-esi emetụta ntuliaka na-abịa, Ọkammụta Igwe na Orakwe kwuru na soshal midia nwere ike idozi maọbị imebi ntuliaka 2023.

Ha kwuru na akụkọ a na-akọ na soshal midia ga-eme ka ọtụtụ ndị gụrụ akwụkwọ nwee etu ha ga-esi we tụnye aka na ntuliaka na-abịa.
Prof Obasi Igwe kwuru sị: "Akụkọ dị iche iche na-aga na soshal midia ma nke bụ eziokwu ma nke bụ ụgha, nke a ga-etinye aka n'ihe ndị mmadụ na-aga ime."
Orakwe sịrị na etu soshal midia nwere ike isi mebi ntulliaka bụ site na akụkọ ụgha.
"Tupu ntuliaka, i nwere ike ịnụ na Atiku arituorola Peter Obi maọbụ na Peter Obi aritorola Atiku."
" Ụdị akụkọ a nwere ike iduhie otu agadi nwaanyi nọ n'ime obodo, ọ sị na Peter Obi agaghị azọkwa ntuliaka, ka ya nọrọ n'ụlọ ya."
3.Mkpu nnwereonwe

Nkwubi ọbụla si n'aka ndị na-eti mkpu nwereonwe nwere ike ịmetụta ntuliaka.
Na izu ole gara aga, nwoke nọ Finland bụ Simon Ekpa na ndị otu ya ọ kpọrọ 'Autopilot' kporo oku nọ®ọnụlọ abalị ise, n'Ọwụwa Anyanwụ, mmachi ahụ adịchaghị ire dịka otu Ipob, otu Ọhaneze Ndigbo nakwa Gọọmenti steeeti dị n'Ọwụwa Anyanwụ kwugidere ya.
Dịka Orakwe si kwuo, ebe otu ndị na-eti mkpu nnwereonwe kwụ na ntuliaka ga-emetụta onye ga-emeri na ntuliaka onyeisiala n'Ọwụwa Anyanwụ.
" Etu ihe si aga, ọ bụrụ na otu Ipob maọbụ otu ndị dịka ha pụta nye iwu onye ndị mmadụ ga-atụnyere maọbụ sịkwanụ ndị mmadụ apụtala tụọ vootu, ọtụtụ ga-ege ha ntị."
4. Ego

Onye kachasí jide ego ga-eso kwuo onye ga-emeri na ntuliaka 2023.
Agụụ na ụbịam ji ndị mmadụ, e nye ha ego ọ ga-emetụta ka ndị mmadụ ga-esi
N'ihi oke ụbịam, ọtụtụ ndị mmadụ ga-atụnyere ndị nyere ego maọbụ ihe onyinye dị iche iche.
Orakwe sịrị, "Ụbịam na-arị elu, onye inyere otu Naira, ọ sị na ka ya rie nke a n'ihi na ọ banye ebe ahụ ọ gaghị echeta m."
Dịka Ụlọakụ mbaụwa World Bank si kwuo n'ozi ha wepụtara n'ọnwa Maachị afọ 2022, mmadụ anọ n'ime 10( ya bụ pasentị 40) ụmụ Naijiria nọ n'ụbịam.
Ndọrọndọrọ ndọrọ ọchịchị Naijiria bu ihe ọ bụ ndị aka ji akụ na-enye karị aka na ya. ha ji ego agbasa ozi achụm nta vootu nakwa inye onyinye dị iche iche dịka akwa, ihe oriri, anakwa ego.
5. 'Muslim/Muslim Ticket'

Ebe foto si, APC
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Naijiria bụ mba okpukperechi na-eso n 'ihe na-ekwu onye ndị mmadụ ga-atụnyere na ntuliaka.
Ntuliaka 2023 agaghị adị iche. Dịka Obasi Igwe, Ọkammuta 'Political Science' bụbụ onyenkuzi na mahadum 'University of Nigeria Nsukka' si kwuo,”Ọtụtụ ndị mmadụ ga-atụnyere ndị si okpukperechi nke ha."
Kemgbe onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha APC bụ Bola Tinubu bụ onye ụka Alakụba kpọpụtara Kashim Shettima bụkwa ony otu okpukperechi ahụ dịka osote ya, ụfọdụ ndị ụka Kraisti agbarụọla ihu maka nzọpụụkwụ ahụ.
Otu n'ime ha bụbụ odeakwụkwọ ukwu nke Gọọmenti Etiti bụ Babachir Lawal bụ onye ugwu ma bụrụkwa onye Ụka Kraisti gwara ụlọọrụ ntakụkọ AriseTV na mkparịtaụkta na "Iwebata onye moslem na onye moslem ịzọ ọkwa nke APC webatara bụ ajọ atụmatụ ga-eme ka nsogbu nkewa kawanye njọ n'Ugwu."
Onye ntakụkụọ bụ Olu Fasan kwuru na ya bụ ihe bu iji lelia ndị ụka Kraistị, " Ha chọrọ ịnapụ ndị ụka Kraisti ikike ha na ndị okpukperechi Alakụba ịkwụ nhatanha n'okwu ndọrọrọndọrọ ọchịchị Naijira."
"Ọ bụrụ na ọ gara ha, " ọ ga-esi ike onye Ụka Kraisti ịbụkwa Osote Onyeisial ma ya fọdụ Onyeisiala Naijiria."
Ndị okpukpere Kraist and nke Alakụba bụ okpukerechi kachasị n'ọnọgụgụgụ na Naijiria.
Ọ fọrọ ntakịrị ka ndị na-ekpe okpukerechi abụọ a hara nhataha dịka ndị Kraịsti dị pasentị 48%,ebe ndị Alakụba dị pasentị 50%, dịka nnyocha ụlọọrụ Pew nke afọ 2015 si kwuo.
Ha na-enyo onwe ha enyo mgbe abụla mgbe mana nke a kawanyere njọ na nsonso dịka tigbuo-zọgbuo metụtara okpukperechi na-arị elu ọkachasị n'Ugwu Naijiria..
6. 'G-5 Governors'

Ebe foto si, NyesomWike/Facebook
Ọtụtụ ndị ma ihe ekwe na-akụ na pati APC ekwuola na mpụta otu "G-5 Governors" nwere ike ịgbarụrụ pati ahụ mmiri na ntuliaka 2023.
Ndị 'G-5 Governors' bụ ndị na-akpọkwa onwe ha "Integrity Group" gụnyere Governor Nyesom Wike nke Rivas Steeti, Samuel Ortom nke Benue Steeti, Seyi Makinde nke Oyo Steeti, Okezie Ikpeazu nke Abia steeti na Ifeanyi Ugwuanyi nke Enuwgu steeti.
Ha bụ ndị gọvanọ PDP kewapụtara onwe dịka obi adịghị ha mma etu kemgbe pati ahụ mechara ntuliaka imeụlọ ha.

Ebe foto si, Nyesom Wike/Facebook
Kemgbe ha mechara ntuliaka imeụlọ, ọgbaghara dapụtara n'otu PDP dịka otu n'ime ndị zọrọ ọkwa ifere pati ahụ ọkọlotọ bụ Gọvanọ Wike na ndị na-akwado ya gbarụrụ ihu maka etu onye meriri na ntuliaka imeụlọ ha bụ Atiku Abubakar si kpasoo Nyesom Wike agwa ka o merichara.
Kama ịhọrọ Wike dịka osote ya, Atiku họọrọ Ifeanyi Okowa bụ gọvanọ Delta Steeti na-agbayeghị alo komiti lebara anya n'okwu pati ahụ tụnyere ya.
Ndị ootu G-5 na ndị na-akado kpọrọ ekwo nkụ si na ọ bụ naanị ma onyeisioche pati ha bụ Iyorchuia Ayu arituru n'ọkwa ya dịka iwu pati ahụ sịrị dị ka udo ga-achị.
Otu onye nwere agba na pati ahụ bụ .Bode George gwara BBC Igbo na mkparịtaụka ' na o megidre iwu pati ha, Onyeisiala nakwa Onyeisioche pati ha isi n'otu mpaghara dịka Atiku na Ayu bụ ndị Ugwu Naijiria.
N'ihi ọgbaghara, kama inye Atiku nkwado, ndị 'G-5' na-ekwu okwu kwugide Atiku ma jụkwa isonye ya n' achumtavootu.
Na nso nso, Wike kwuru na ndị G-5 gọvanọ "ga-akwado onye na-azọ ọkwa onyeisiala aka ya dị ọcha."
7 . Agbụrụ/Asụsụ onye:

Ebe foto si, BBC/CBN
E wezụga okwu okpukperechi, okwu agbụrụ maọbụ mpaghara onye is so n'ihe bu isi a hụrụ kwawa okpu na ntuliaka na Naijiria.
Obasi sịrị,"E nwere ndị ga-asị na ihe ọ sọrọ ya bụrụ, na onye ya ma bụ onye nke ya."
tụnyere ndị maka ha na-asụ asụsụ nke a maọbụ nke ọzọ."
"Obasi kwuru sị, ” Ọtụtụ ndị mmadụ ga-atụnyere ndị si agbụrụ ha."
Ka ọ dị ugbua, ụfọdụ ndị ọnụ na-eru n'okwu na-ekwu na ndị mmadụ ga-atụnyere ndị bụ ọ-kwụrụ- ọka ga-adọ ntuliaka ahụ dịka mpaghara ha si dị.

Ebe foto si, Atiku Abubakar/Facebook
Ndị ọnọ-na-ndo-ahụ-ọnwa a na-ebu amụma na Atiku Abubakar nke PDP si Ugwu Naijiria ga-enweta nkwado ndỊ Ugwu n'ebe ọ dị ukwuu, Bola Tinubu nke APC si Ọdịda Anyanwụ ga-enweta nkwado ndị Yoroba,ebe Peter Obi nke Labour Party si Ọwụwa Anyanwụ ga-enweta nkwado ndị Igbo..
Ndị ma ihe ekwe na-akụ n'okwu ndọrọndọrọ ọchichị na-ekwu na mmadụ atọa ga-enweta nkwado na mpaghara ha si bịa.
Ịgbado ụkwụ n'okwu agbụrụ malitere na ndọrọndọro ọchịchị Naijiria n'afọ 1945, oge ichie Obafemi Awolowo Atumvootu Nke a malitere
8. ENDSARS

Ebe foto si, EPA
A na-eche na ngaghariiwe Endsars nakwa iwe etu gọọmenti si so ogbugbu e gburu ụfọdụ ndị meere ngaghariiwe EndSars na Lekki Toll Gate ga-emetụtụ onye ndị mmadụ ga-atụnyere n'afọ 2023 dịka ọ kpalitere ọtụtụ ndị na-eto eto itinye anya okwu ntuliaka.
Orakwe sịrị, ""EndSars kpalitere ịnọkụnobi ndị mmadụ isonye na ntuliaka."
" Nke a pụtara ihe na ndebanye aha maka akwụkwọ atumvootu."
Otu n'ime ndị ndụ Endsars bụ Rinu Oduala kwuru na Endsars kpọlitere ndị mmadụ n'ụra n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị.

Ebe foto si, Rinu Oduala/Twitter
9. 'Ideologies'

Ebunmobi na nkwenye banyere ọchịchị nwere ike ime ndị mmadụ kpebie na ọ bụ okeke maọbụ Okafor ka haga-atụnyere n'ihi ebe ha chere onye kwụ n'okwu nkwenye banyere ọchịchị.
Okammụta Igwe sịrị, "O nwere ndị ga-eji maka nkwenye banyere ọchịchị Bekee kpọrọ "ideology tunyere onye ha ga-atụ nyere, manaha ebughị ibu."
Onye na-azọ ọkwa Onyeisiala n'aha AAC bụ Omoyele Sowore na-ekwupụta nkwenya na 'socialism', ụfọdụ ndị nwere ụdị nkwenye nwere ike iji maka nke a tunyere ya vootu.
10. Amaghị nke ekwe na-akụ
Agụghi akwụkwọ nwere ike ime ka ndị na-atụ vootu ghara ịtụnyere onye ha bu n'obi ịtụnyere.
Orakwe kọwara na ụfọdụ ndị mmadụ agụghị akwụkwọ ịghọta akara pati ha maọbụ onye ha bu n'obi ịtụnyere nwere ike mee ka ha binyere onye ọzọ aka maọbụ binye aka n'ụzọ ga-ala vootu ha n'iyi.
11. Ndị e ji okwu ha agba izu

Igwe sịrị, "O nwere ndị ga-abịa ebe a na-atụnye aka, ha agaghị ama onye ha ga-atụnyere. "Ufọdụ ndị mmadụ ga-atụrụ onye a sị ha tụọ®ọ vootu."
Ọ bụrụ na Naijiria bụ obodo dị mma, ihe aga atunye aka ga-abụ ihe onye ahụ ga-eme.














