'Anyị na-enyo na ọ bụ ndị Ipob/ ESN gburu Onyeisioche Ideatọ -North'- Ndị uweojii Imo steeti

Chris Ohizu

Ebe foto si, Chris Ohizu/Facebook

Ndị uweojii Imo steeti ekwuola ha ha ehiwela otu ga-ama imi n'ala ime nnyocha ma nwụchie ndị aka ha dị n'ọnwụ onyeisioche Okpuru Ọchịchị Idea-atọ North.Ndị omekome bu egbe tọọrọ Chris Ohizu n'abalị nke ọnwa Jenụwarị , gbuo ya, bepụ ya isi na nsonso a.

Ozi si n'aka ndị uweojii Imo steeti nke ọnụ na-ekwuru ha bụ Henry Okoye binyere aka, ma wepụta ụbọchị Monde kwuru sị, "Ndị uweojii Imo Steeti ma maka inyonyo tara ọjị anya na-efegharị na soshal midia ebe otu nwoke a na-eche bụ onyeisioche Okpuru Ọchịchị Ideatọ-North a tọrọ atọrọ ebe o sekpu ala, e kechie ya aka ka na ọ bụghị mmadụ , mecha ndị a na-enyo na ha bụ ndị otu a machiri amachi bụ Indigeneous People of Biafra (IPOB) na alaka ọgụ ha bụ Eastern Security Network (ESN) gbuo ya."

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

" Anyị chọrọ ịgwa ụmụamala Imo steeti na anyị esocheiala okwu ahụ dịka anyị hiwerela otu nnyocha nke Kọmịshọna ndị uweojii steeti a bụ Mohammed Ahmed Barde, hiwere kemgbe a tọọrọ nwa amadi ahụ ha na-achọ ndị omekome ahụ kpara mkpamkpa ahụ tupu ihe onyonyo apụta ihe." . Ọ gara n'ihu kwuo na otu ahụ agaghị ezuike ganye ma ha kpuhe ihu ndị kpara arụ ahụ.

Ọ rịọrọ ndị Ideatọ-North ka ha dere jụụ na-agara mkpa ha dịka ha kerela ajị n'ume ịhụ na oyiri ya emeghị ọzọ.

Etu e si gbuo onyeisioche okpuruọchịchị Ideato North ma bepụ ya isi
A tọrọ Chris Ohizu n'obodo ya n'ụbọchị Fraịdee.

Ebe foto si, Chris Ohizu/Facebook

Nkọwa foto, A tọrọ Chris Ohizu n'obodo ya n'abalị Tọọzde.

Ihe onyonyo ọhụrụ agbaala na soshal midia nke na-egosi onye ọha na-ekwu na ọ bụ Chris Ohizu ebe ndị otu oji egbe kwụ ya n'akụkụ na-amaja ya ma mecha bepụ ya isi.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Henry Okoye gbara ama akụkọ a na-efegharị ugbua dịka o kwuru:

"Anyị na-eme nnyocha n'okwu a ugbua."

Chris Ohizu bụ onyeisioche okpuruọchịchị Ideato North nke Imo steeti bụ onye a sị ndị ojiegbe wakporo ma tọọrọ n'ụbọchị Tọọzde gara aga. E kwukwara na a tọrọ mmadụ abụọ ọzọ n'ụbọchị ahụ dịka a gbara be ya ọkụ n'obodo Imoko nke mpaghara Arondizuogu.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Olu ndị ahụ nọ na ya bụ ihe onyonyo na-ada ka olu ụmụokorobịa kwuru na ha agaghị anabata atụmatụ ntuliaka ọbụla n'akụkụ Naịjirịa ọbụla.

Nke a na-abịa dịka ọ fọrọ naanị otu ọnwa ka ntuliaka 2023 bịazuo na mmezu.

Otu onye okpuruọchịchị ahụ gwara onye ntaakụkọ anyị n'Imo na ha hụrụ ya bụ ihe onyonyo gosiri ebe e bepụrụ Ohizu isi site n'akara Whatsapp ya. O kwuru na ndị mere ya bụ ihe kesara ogbugbu ya n'akara Whatsapp ya ka ọha hụ. O kwuru: Ihe onyonyo ahụ jọgburu onwe ya. A kere ya agbụ, gbaa ya ọtọ tupu e were mma bepụ ya isi"

"Ọ bụ ezigbo ihe dị njọ ile anya." Onye ahụ gwara onye ntaakụkọ anyị okwu boro ebubo na ndị mere ihe kụpụrụ ego ruru nde Naịra isii n'akpa ya nke bụ ego mgbapụta.

Udịrị ihe dị etu a emebuola mgbe ndị otu bu egbe gburu nwaanyị onye agha bụ Gloria Nneka Matthew na Linus Audu bụ ọdịnobi ya bịara njem ịlụ ya. Ndị gburu ha zipụtara ozi etu e siri gbuo ha n'ọnwa Mee, 2022 site n'akara Whatsapp ha ka ọha hụ ya bụ ihe.

Ihe ị kwesịrị ịma maka ntọrọ Chris Ohizu

Chris Ohizu

Ebe foto si, Chris Ohizu/Facebook

Ndị ojiegbe a na-amaghị ndị ha bụ tọọrọ Chris Ohizu bụ onyeisioche okpuruochichi Ideato North, Imo Steeti n'abalị Tọọzde.

Nke a mere n’abalị ụbọchị Tọzde 19 Jenụwarị, 2023 mgbe ndị a wakporo ụlọ ya dị n’obodo Imoko, Arondizuogu ma gbaa ụlọ ya ọkụ.

Otu onye gwara ndị ntaakụkọ na ndị ojiegbe a gbara Ohizu egbe n’ụkwụ tupu ha tọrọ ya na mmadụ abụọ ndị ọzọ.

“A gbara ya egbe n’ụkwụ tupu ha a tọrọ ya, nwoke a ka si n’ụlọ ụgwọ lọta mgbe ihe a mere.”

Onye ọzọ kwuru na ọ dịla anya ha tiwere mkpu banyere ọnọdụ nchekwa dị n’obodo Arondizuogu na-akpọ oku ka ndị nchekwa gbatara ha ọsọ enyemaka.

“Kamgbe afọ gara aga ka m tiwara mkpu na o nweghi ndị uweojii maọbụ ndị ọrụ nchekwa nọ n’Arondizuogu, anyị na-agbazi ekpere chi ugbua.”

Mgbe a kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Imo bụ Henry Okoye, ọ sị na ọ ga-enyocha ma nke a ọ bụ eziokwu ma zaghachị.

Mana tupu akụkọ a apụta ọ zaghachịbeghi.

Mwakpo a na-abịa na-erughi otu izuụka a wakpochara ọnụ na-ekwuru otu ‘Coalition of United Political Parties bụ Ugochinyere Imo, gbaa ụlọ ya na ọtụtụ ụgbọala ọkụ ma gbuo mmadụ atọ n’obodo ya Akokwa dị n’Ideato North.

N’otu aka ahụ, e gbukwara di na nwunye chọrọ ịgba akwụkwọ na nwanne ha nwoke n’otu obodo Arondizuogu na mbido afọ a.