Army couple killed: Nwaada Gloria Matthew, di afọ 10 hụrụ ka e si gbuo mmadụ abụọ ọzọ so ha e me njem - Nwanne Gloria

Ebe foto si, Audu family
Ụmụnne Gloria Nneka Matthew na Linus Audu, ndịagha abụọ ndị ojiegbe gburu n'Ọlụ dị n'Imo steeti na nsonso a dịka ha na-aga ịgbankwu onwe ha, akọwaala etu ha si mata na ndị nke ha ezutela ọnwụ ike n'aka ndị omekataraihepụụjọ.
Ndị omekome gburu ma bepu Linus Audu bụ onye agha lara ezumike nka na nwaanyị ya bụkwa onye agha (Private) bụ Gloria Matthew isi, dịka ha na-aga ịgbankwụ ha n'Imo steeti, n'ụbọchị Satọde 30 Eprel 2022.
Nwanne Linus gwara BBC Igbo na a bọrọ nwanne ya nwoke ọ tọrọ atọ dịka anụmanụ, tinye ya n’ili emighị emi.
N'otu aka ahụ, nwanne Gloria Matthew kwuru na ya na nwanne ya kpara n’ebe elekere asaa nke ụtụtụ ka ha mmadụ asaa si Legọs zọpụ ije ịga ala Igbo.

Ebe foto si, Audu Family
Mana n'ebe ihe dị ka elekere anọ nke mgbede ka nwanne ya nwoke kpọrọ sị na ndị ojiegbe egbuola nwanne ha nwaanyị.
Ndị omekome ahụ mechara tinye onyonyo ogbugbu ya na Whatsapp ekwenti onye ha gburu.

Ebe foto si, Audu Family
Lee ihe ha kọrọ n'uju:

