Okechukwu Okoye: Akụkọ ọnwụ Okechukwu Okoye ga-agbawa Nnamdi Kanu obi ma ọ nụ ya - Ifeanyi Ejiofor

Nnamdi Kanu na Ọkaiwu ya bụ Ifeanyi Ejiofor, na Okechukwu Okoye

Ọkaiwu Ifeanyi Ejiofor, bụ onye na-anọchite anya Mazi Nnamdi Kanu, akatọọla ogbugbu e gburu onye omeiwu Okechukwu Okoye.

Ejiofor kwuru nke a site n'akwụkwọ ozi o wepụtara taa bụ ụka, ma kwukwaa na ogbugbu ya ga-ewute Nnamdi Kanu nke ukwuu ma ọ nụ ya.

Cheta na e gburu Okechukwu Okoye, bụ onye na-anọchite anya mpaghara Aguata II n'ụlọomeiwu Anambra steeti, ma gbupụ ya isi.

"Mmụọ ọjọọ na-aṅụ ọbara ewerela ọnọdụ n'ala anyị...nke anyị agaghị ekwe ka ọ gaa n'ihu,"Ejiofor kwuru.

"Ama m na akụkọ a ga-agbawa onye ndu Nnamdi Kanu, bụ onye m na-anọchite anya ya, obi, n'ihi na ọ gwala m ugboro ugboro ka m dọọ aka na ntị ka ndị na-eme arụ ndị a niile kwụsị."

"N'ezie, ndị iro anyị ewerela ọnọdụ n'obodo anyị na-emezi ihe masịrị ha."

"Anyị na-akpọku ndị niile ọnụ na-eru n'okwu na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ka ha jikọta aka ọnụ, ma tụkọta alo anyị ga-eji nwụchie ndị na-akpa arụ a na be anyị."

Aha onyonyo, Nnamdi Kanu: Ndị aka ha dị na nwuchigharị ya ka nkụ - Ifeanyi Ejiofor

Ejiofor kwuru na o doro ya anya na ndị ekperima a na-eyi ndị mmadụ egwu abụghị ndị na-achọ nnwereonwe Biafra, kama ha bụ ndị ọrụ ngo nkr ọrụ ha bụ imebi aha ndị otu IPOB.

"Anyị ga-eme ihe niile anyị nwere ike iji chekwaa ala nke nna nna anyị ha hafere anyị n'aka.

'Nye anyị ozi maka ndị gburu Omeiwu Okechukwu Okoye, anyị enye gị nde N10m' - Gọv Soludo

Charles Soludo na Okechukwu Okoye

Ebe foto si, Soludo TV

Aka na-achị Anamabra steeti bụ Charles Soludo akpọkuola ọha ndị mmadụ ma arịọ ka onye ọbụla nwere ozi etu a ga-esi anwụchi ndị gburu Omeiwu Okechukwu Okoye pụta kwuo.

Ndị omekome a ma beghị ndị ha bụ tọọrọ Okoye na onye enyemaka ya bụ Cyril Chiegboka n'abalị 15 nke ọnwa Mee, gbuo ya ma bepụ ya isi tọgbo ozu ya n'okporoụzọ si Nnobi gawa Ideani ka ọ gachara abalị isii n'aka ndị omekome ahụ.

N'ozi a, nke ọnụ na-ekwuru ya bụ Christian Aburime binyere aka, o dere,"Soludo etinyela nde naira iri dịka ego nrite nye onye ọbụla maọbụ otu ọbula ga-eweta ozi ga-enye aka ka anwụchie ndị kpara arụ a''.

Soludo, onye gara n'ihu kwe nkwa na oge na adịghị anya na Anambra ga-aghọ ọkụ mmụọ nye ndị omekome kwuwara, "Anambara ga-emeri ikike ọchịchịrị".

Kedụ ka ogbugbu Okechukwu Okoye siri mee?

Charles Soludo

Ebe foto si, Soludo TV

Ndị omekome egbuola onyeomeiwu na-anọchite anya mpaghara Aguata II n'ụlọomeiwu Anambara steeti bụ Okechukwu Okoye .

A tọọrọ Okoye, onye Isuofia ma bụrụkwa onye na-anọchite mpaghara ebe Gọvanọ Chukwuma Soludo nke Anambara. Egbukwara onye enyemaka ya bụ Cyril Chiegboka.

Cheta na a tọọrọ Okoye na onye enyemaka ya n'abalị 15 nke Ọnwa Mee dịka ha nọ n'ụzọ njem na steeti ahụ.

Ndị omekatara ihe daa ụjọ nwụchiri ya gburu ya, hapụ ahụ ya ebughị isi n'okporoụzọ Nnobi gawa Ideani n'abalị iri na otu nke ọnwa Mee, dịka ndị uweojii steeti ahụ si kwuo.

Mana e mechara hụ isi ya n'ọdọụgbọala n'Amichi dị n'okpuru Ọchịchị Nnewi-South dịkwa na steeti ahụ n'otu ụbọchị ahu.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga gwara BBC Igbo n'ozi o depụtara na," Dịka ndị uweojiina-agba mbọ etu ha ga-esi azọpụta Aguluzigbo Umiona, dị n'Okpuru Ọchịchị Aguata, nwa amadị a a tọọ n'ebe Elekere 5.30 n'okporoụzọ si a hụrụ ozu ya nke isi adịghị n'Okporoụzọ si Nnobi gawa Ideanị n'Elekere 4 nke mgbede abalị 21 nke ọnwa Mee, afọ 2022".

Ikenga, onye kwuru na a hụkwara ozu Chiegboka n'ebe e dotara ozu Okoye gara n'ihu kwuo na a dọnyele ozu ya n'ụlọozu.

N'ikwupụta maka ọnwụ ya, Govanọ Charles Soludo onye tụrụ arịrị maka nke ma kwuo "ihe a dị oke mwute na egburu ụmụ Isuofia abụọ".

N'ozi iti aka n'obi o wepụtara nke ọnụ na-ekwuru ya bụ Christian Aburime binyere aka, Soludo rụtụrụ aka na ọ bụ ndị omekome ahụ wakporo ya ma gbagbuo ndị uweojii ya afọ abụọ gara aga bụ ndị kpara arụ ahụ.

O kwuru na gọọmentị ya agba mbọ ịchọta ndị aka ha dị n'ọnwu nwa amadị ahụ ka ha gaa zara ọnụ ha n'ụlọikpe.

Onye bụdị Okechukwu Okoye a ọnwụ ya na-akpọtụ?

Okechukwu Okoye

Ebe foto si, Okechukwu Okoye/Facebook

  • Okechukwu Okoye bụ onye omeiwu na-anọchite anya mpaghara Aguata nke Abụọ n'Ụlọomeiwu Anambara steeti n'aha otu pati Apga, agba nke abụọ ya.
  • Ọ bụ onyeisioche kọmiti mgbasaozi nke ụlọomeiwu Anambra steeti
  • Okechukwu bụ onye e ji 'Okey dị Okay" were mara bụ onye Isuofia n'Anambara steeti.
  • Nna ya bụ Robert Okoye nke ogbe Ozalla n' Isuofia.
  • Ọ gara akwụkwọ sekọndịrị n'ụlọakwụkwọ Community Secondary School Isuofia.
  • Ọ gara ụlọakwụkwọ dị elu Federal Polytechnic ,Oko tupu ọ gaa mahadum ala Bekee bụ University of Bedfordshire.
  • Ndị ma ya kọwapụtara na o wetara ọtụịtụ ihe mmepe na mpaghara Agụata dịka ọ nọ n'ọkwa ịnọchite ha
  • Ihe ndị a gụnyere ịrụ klaasị na ụlọakwụkwọ "Aguata Boys Secondary School, Ekwulobia,"; ịrụzịagharị ebe nnyocha sayensị dị n'ime ụlọakwụkwọ 'Community Secondary School,Isofia'; mposi asatọ n'ụlọakwụkwọ St Anthony's Secondary School,Ikenga. wdg.
  • Okoye bụ onye na-ekpesi ụka Katọlik ike na-agbanyeghị na nna ya bụ onye Anglikan.
  • Ọ bụ onye ịgụ egwu na-amsị dịka a ma ya dịka 'choirmaster' n a-akụsiri ụmụaka na ndị ntorobia.
  • Akụkọ kwuru na agbanyeghị na nna ya bụ onye Anglikan, Okechukwu toro n'ikwu nne ya ebe nnenne ya na ndị ezinaụlọ ya na-ekpe Katolik nke na ha nwere ụkọchukwu.

Akụkọ ka na-abịa.