Etu ndị 'unknown gunmen' si tọọrọ 'naval personnel' n'Anambra steeti

ọgbaegbe

Ndị bu egbe amabeghị ndị ha bụ atọrọla onye ọrụ ndị agha mmiri n'okporoụzọ nso Uli Junction dí n'Anambra steeti ụbọchị Monde.

Onye ọrụ agha mmiri ahụ bụ Ibrahim Anas si ebe ọ gara ileta nne ya nọ n'akwa ọrịa na-ala Borokiri, Pọtakọt, Rivas steeti ebe ọ na-arụ ọrụ Ụbọchịụka oge ndị bu egbe kwuchiri ụzọ kwụsiri ụgbọala ha, ma tọọrọ ya gawa ebe a mabeghị.

Akụkọ kwuru na ndị ojiegbe ahụ nyochara akpa ndị njem nọ n'ụgbọala ahụ, hụ uwe ndịagha na nke nwaamadi ahụ bu were tọrọ ya.

NAnas, onye gbara afọ 23 bụ onye Kaduna steeti.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Ọnụ na-ekwuru ndị agha mmiri Naijiria bụ Commodore Adedotun Olukayode Ayo-Vaughan gwara BBC Igbo, na ya bụ akụkọ bụ eziokwu.

Ọ gara n'ihu sị na ndịagha na ndị uweojii nzuzo amalite ima imi n'ala iji hụ na ha agbapụtara nwoke ahụ.

Ọ kọwara na nwaamadi ahụ abụghị onye agha mmiri kama ọ bụ onye na-arụrụ ndịagha mmiri ọrụ dịka ọkwọụgbọmmiri.

"Ọ nara oge ka ọ gaa hụ nne ya ahụ adịghị."

"Ụgbọala ha ọ banyere were eme njem ụbọchị ụka mebiri, ha rụọ ya rute ụbọchị Monde."

" Oge ha rutere n'uli Junction, a kwụsiri ụgbọala ha, malite inyocha akpa ndị nọ n'ụgbọala ahụ."

"Ha hụrụ uwe 'camouflage' nakwa akpụkpọụkwụ 'boot' n'akpa ya."

N'okwu akụkọ na-efegharị na-ekwu na ọ bụ ndị a na-enyo na ha bụ ndị Ipob/ESN nwuchiri nwa amadi ahụ, Commodore Ayo-Vaughan sịrị,"Ozi anyị nwetara ekwughị na ọ bụ Ipob maọbụ ESN tọọrọ ya."

"Mana anyị ma na otu ahụ a machiri amachi na-amanye ndị mmadụ nọọ n'ụlọ ụbọchị Monde bụ ụbọchị ihe ahụ mere." 

Ndị agha Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, A tọrọla ma wakpoo ọtụtụ ndị ọrụ ncheka n'akụkụ Naịjirịa dị iche iche ọkachasị dịka nchekwa na-adakpo na Naịjirịa.

Cheta...

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Cheta na Onyema Nwachukwu bụ ọnụ na-ekwuru ndị agha, kwuru n’ụbọchị itoolu nke ọnwa Nọvemba 2022 na ndị ekperima tọọrọ otu onye otu ha bụ Bassey Ikunugwan n'ụbọchị Wenezde, ụbọchị abụọ nke ọnwa Nọvemba, n'okporo ụzọ Okwu-Ebem Ohafia dị n'Abia steeti.

Nke a mere ndị agha ji malite ịchọ onye otu ha ahụ ma banyechaa n'ime ọhịa dị n'obodo Amangu ebe ha na ndị ekperima ahụ kwara mgbọ, ha wee gbuo otu onye, ma nata ya otu egbe AK47, ọtụtụ mgbọegbe na otu ekwentị.

Ozi ndị agha kwuru na ọ bụ ndị agha nnupuisi Indigenous People of Biafra (Ipob) na otu nchekwa ha bụ 'Eastern Security Network' (ESN) mere ya bụ ntọrọ.

Ka ọ dị ugbua, nsogbu ndakpo nchekwa arịala elu n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa kemgbe Jenuwari afọ 2021 dịka e gbuola ọtụtụ ndị ọrụ uweojii, ndịagha nakwa ndị ọrụ ncheka ndị ọzọ.

Gọọmentị Etiti na-ebo otu nnwereonwe Biafra bụ Ipob nakwa ESN alaka ọgụ ha n'aka ha dị n'ogbugbu ndị a n'ile, mana Ipob agọọla ugboro ugboro naka ha dị ọcha.