Etu ndị ojiegbe si gbuo Eze, ndị ọzọ n'Imo steeti

Eze Ignatius Asor

Ebe foto si, Others

Akụkọ si Imo steeti apụta na-akọwa na ndị ojiegbe wakporo obodo Obudi Agwa dị n'Okpuru ọchịchị Ugwuta nke Imo steeti, gbuo eze ha bụ Eze Ignatius Asor, nakwa mmadụ anọ ndị ọzọ.

Ya bụ mwakpo mere n'ụbọchị Mọnde, 14 nke ọnwa Nọvemba, 2022, mgbe ndị mmadụ gbakọrọ na nzukọ n'obi eze obodo ahụ.

Akụkọ kwuru na ndị ojiegbe ahụ malitere ịkwa mgbọ aghara aghara, nke gburu Eze Asor, ndị ichie ya abụọ nakwa ndị obodo abụọ.

Onowu ya bụ Ichie Stephen Ajoku, so na ndị mgbọ egbe merụrụ ahụ na ya bụ mwakpo.

Otu onye achọghị ka a kpọọ ya aha kwuru sị, "awakporo obodo anyị n'ụtụtụ taa. Ndị ojiegbe a wakporo obieze anyị ebe ha nọ na nzukọ, malite ịkwa mgbọ aghara aghara.

"Dịka m na-agwa gị okwu ugbua, eze anyị bụ Eze Ignatius Asor, ndị ichie abụọ na mmadụ abụọ ndị ọzọ anwụọla. Mgbọ tụkwara Ichie Stephen Ajoku bụ onye agha wụsarala ọwa, mana ọ nwụghị."

N'otu aka ahụ, ndị obodo Mgbala gbara Obudi Agwa agbataobi, gwara onye ntaakụkọ BBC na otu nwaanyị dị ime na otu onye nche, so na ndị merụrụ ahụ mgbe ndị ojiegbe ahụ wabatara obodo ha.

Onye ahụ achọghị ka a kpọọ ya aha, gwara BBC sị "A wakpokwara obodo Mgbala, ebe a gbara nwaanyị dị ime na otu onye nche egbe. Ha ka dị ndụ ugbua. Obodo anyị nọ n'iru uju."

Obinna Jumbo, onye nchịkọta ebe mmepụta ihe n'Agwa, gwara onye ntaakụkọ BBC na ha emeela mkpesa n'aka ndị uweojii, ma kwuo na e bugala ozu ndị nwụrụ anwụ n'ụlọ nchekwa ozu.

Onyeisioche okpuru ọchịchị Ugwuta, Ijioma Ofili, gwara onye ntaakụkọ BBC na ndị ọrụ nchekwa agwala ya ihe mere n'obodo ahụ, ma kwuo na ha na-agba mbọ ịhụ na ha ruru n'isi mmiri n'okwu ahụ.

Ihe ndị uweojii kwuru

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti, bụ Michael Abattam, ziputere ozi ebe ọ nọ kwuo na ndị ojiegbe ahụ a na-enyo bụ ndị Eastern Security Network (ESN), ji aghụghọ bata n'obi eze Eze Asor.

O kwuru na ndị ojiegbe ahụ (gụnyere otu nwaanyị) ji aghụghọ bịa dịka ndị bịara ime mkpesa, tupu ha amịpụta egbe gbagbuo Eze Asor na ndị enyemaka ya abụọ, wee gbapụ ọsọ.

Abattam kwuru na ndị ojiegbe ahụ ji ụgbọala anọ na ọgbatumtum abụọ bịa, wakpokwara ụlọọrụ ndị nche nke ndị Agwa, ebe ha gbara otu onye egbe ma buru ọgbatumtum atọ ọzọ.

Ọ gara n'ihu kwuo na ndị uweojii awụjuola n'obodo ahụ ugbua ichekwa ya, ma kwuo na ha na-ama imi n'ala ịhụ na aka kparala ndị kpara mkpamkpa a.