Etu ndị ojiegbe si gbuo otu nwoke, tọro ndị ọchịchị APC abụọ n’Imo steeti

Ebe foto si, Getty Images
Akụkọ ọhụrụ si Imo steeti apụta taa bụ ụbọchị 20 nke ọnwa Ọgọst na-ekwu na ndị ojiegbe wakporo okporoụzọ a na-akpọ U-turn dị nso ahịa Nkwo Orji ma gbuo otu nwoke.
Ahịa a dị n'ụzọ Owerri gawa Okigwe, bụ ebe e kwuru na ndị ojiegbe a gbagburu otu nwoke na-arụ ụgbọala ma tọrọ mmadụ atọ nọ n’ime ụgboala o bu.
E kwuru na ihe a mere n’ụbọchị Fraịde.
Onye ogbo nwoke a na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara onye ntaakụkọ anyị taa bụ Satọdee:
“Ihe a mere bụ ihe mwute, nwoke a alụọla nwunye, nwunye ya na-ere ihe n’akụkụ ebe ọ na-emezi ụgbọala ndị mmadụ”
Onye ọzọ nọ ebe ahụ ihe a wee mee gbara ama sị na “Nwoke a bụ onye okporoọchịchị Ikeduru, ndị a gburu ya kwuru na ọ bụghị ya ka ha chọọ bịa mana ọ kweghị rubere ha isi nke mere ha ji gbaa ya egbe”.
E kwuru na ndị ojigbe ahụ gbara egbe aghara aghara dịka ha bu ndị a sị nọ n’ụgbọala ya gbaba ụzọ Okigwe.
Akụkọ ọzọ yiri nke a sịkwa n’akụkụ abụọ n’Imo steeti dapụta n’abalị Fraịdee dịka e kwuru na ndị ojiegbe tọọrọ ndị ọchịchị a sị bụ ndị otu pati All Progressive Congress (APC) abụọ.
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Otu onye na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara onye ntaakụkọ anyị na a tọọrọ Godson Obijiaku n’obodo ya bụ Amauzairi, ebe a tọọrọ onye ọchịchị APC nke ọzọ e ji ‘Ability’ mara n’ụlọọrụ ebe a na-ere ọgwụ n’Amaraku.
E kwuru na ndị ojiegbe ahụ bu ụgbọala wụbata ebe a na-ere ọgwụ bagide Ability ma gbaa egbe aghara aghara ebe ahụ tupu ha a tọọrọ ya.
Mbọ niile BBC Igbo gbara iji nụ olu ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Imo steeti bụ Michael Abattam amịtaghị mkpụrụ dịka ọ zaghị ozi e zitere ya.

Imo steeti so n’akụkụ Ọwụwa anyanwụ Naịjirịa ebe enweghị ezi nchekwa na-enye nsogbu ugbua.
Ọtụtụ otu ndị ojiegbe dị iche iche na-awakpo ndị mmadụ, na-atọrọ ma na-egbu ụfọdụ. Gọọmentị Imo steeti aṅwụla iyi ibelata ihe ndị a na-eme na steeti ahụ site n’izibata ndị uweojii, ndị agha Naịjirịa nakwa otu nchekwa pụrụiche bụ Ebubeagu. Na nso nso o gọvanọ Hope Uzodinma zụtara ụgbọala pụrụiche 10 e ji ebu agha iji kwado ndị ọrụ nchekwa n'ọrụ ha.










