Ọ bụghị eziokwu na e gburu ndị Ugwu isii iji bọrọ ndị e gburu na mwakpo ụlọụka Owo - Ndị uweojii

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii Ondo steeti ekwuola na akụkọ na-efegharị na-ekwu na e gburu ndị Ugwu isii iji bọgwara ndị oyindu egwu gburu n'ụlọụka Katolik bụ akụkọ ụgha.
Ndị ojiegbe gburu mmadụ isii na mpaghara Sabo dị n'obodo Ondo dị n'Ondo steeti n'ụzọ ụtụtụ ụbọchị Wenezde.
Nke na-abịa abalị atọ ndị oyinduegwu wakpochara ma gbuo mmadụ 40 n'ụlọụka 'St Francis Catholic Church, Owo, Ondo steeti.
Otu ụlọntaakụkọ anyị achọghị ịkpọ aha ya kwuru na "ndị ojiegbe mmadụ bu ọgbatutum mmadụ atọ,mmadụ atọ wakporo ndị Ugwu na-ere suya na tii gbuo mmadụ isii bụ ndị e liera, ebe ndị merụrụ ahụ na-anata nleta n'ụlọọgwụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti bụ Odunlami Funmilayo, kwuru n'ozi mgbasaozi o wepụtara ụbọchị Tọzde na ndị nwụrụ bụ ndị ohi wakporo ha, gbagbuo ha, na ọ bụghị ọbọ.
Ọ sịrị: 'O nweghị mwakpo e mere n'ogbe ndị Awụsa dị na Sabo dị n'obodo Ondo maọbụ ebe ọbụla n' Ondo steeti dịka ndị na-achọ ibute agha na-efesaa."
N'ụbọchị Tuzde, abalị asaa nke ọnwa Juun, 2022, ndị na-achọ izu ohi wakporo ụgbọala J5 akara efere ya bụ MKA-464 nke bu ịyabasị na jinwannụnụ si Zaria aga Ore kwụsịrị n'obodo Ondo oge ndị ekperima wakporo ha.
"Ha(ndị ohi ahụ ) gbara ọkwọụgbọala ahụ egbe, mgbọ tụkwara onye nso ụgbọala ahụ dịka ọ na-agba ọsọ ndụ, tụkwa otu onye ọgbatumtum nakwa onye na-agara onwe ya."
Cheta na ụbọchị ụka ndị bu egbe na ogbunigwe gbakporo ụlọụka St Francisi Catholic Church dị n'Owo gbuo mmadụ 40, ma merụọ ọtụtụ ndị ọzọ ahụ n'ụdị mkpamkpa akpabeghị na steeti ahụ mbụ.









