Owo Church Attacks: Ihe onyonyo etu e si lie ndị e gburu n'ụka Katọlik dị n'Owo Ondo Steeti
Akwa na arịrị na-arị ibe ya elu n’obodo Owo dị n’Ondo Steeti dịka a na-eli ozu ndị e gburu mgbe ndị ojiegbe wakporo ụlọụka St. Francis Kakọlik, n’ụbọchị ise ọnwa Juun, 2022.
Gọvanọ Steetị ahụ bụ Rotimi Akeredolu so ndị ezinaụlọ, ndị enyi na ndị agbataobi na ya bụ emume akwamozu.
N'okwu ya n'ọgbakọ ahụ, Gọvanọ Akeredolu kwara arịrị na mbọ niile ha na-agba iji weta ezi nchekwa na steeti ahụ anaghị amịtacha mkpụrụ otu o kwesịrị.
O kwuru sị: "Ekwetara m na anyị adaala n'ihe gbasara nchekwa. Anyị kụrụ afọ n'ala."
"Ihe mere anyị ji daa abụghị maka na anyị anaghị anwa ike anyị, kama ọ bụ maka na ndị ọjọọ nọ n'akụkụ nke ọzọ nwere ndị ndị na-enye ha nkwado."
"Ndị ọjọọ a nwere ike imeri anyị nwa mgbe nta, mana mmeri ha agaghị adịgịde. Ọ gaghị adịgide."

Akeredolu gara n'ihu kwuo na ọ bụ mmadụ iri anọ tufuru ndụ ha na mwakpo ahụ, "mana ndị a na-eli taa bụ mmadụ 22."
Ọ kọwara na ndị nke ọzọ, ndị ezinụlọ ha eburula ha lie.
"Ka ọ dị ugbua, ihe karịrị mmaọ̄ụ iri asaa ka nọ n'ụlọọgwụ dị icheiche na-anata ọgwụgwọ," Akeredolu kwuru.
Cheta na ndị ojiegbe wakporo ụlọụka a ma gbuo ihe ruru mmadụ iri anọ dịka ha na-efe ofufe.
Ndịisi nchekwa boro ebubo na ọ bụ Islamic State West Africa Province (ISWAP) mere mwakpo ahụ mana o nwebeghi onye ha nwuchiri.
Lee photo ndị ọzọ si na ya bụ akwamozu



Gọọmentị Naịjirịa atụọla ISWAP aka n'ọdachi mere n'Ondo steeti

Ebe foto si, @RotimiAkeredolu/Twitter
Gọọmentị Naịjirịa ekwuola na ọ bụ otu iyinduegwu ISWAP kpara mkpamkpa n’Ondo steeti n’ụbọchị ụka ebe e gburu ihe ruru mmadụ iri anọ.
Minista imeobodo bụ Rauf Aregbesola kwuputara nke a ma kwuo na ha agwala ndị uweojii gbaa mbọ jichie ndị ahụ.
O kwukwara na mwakpo ahụ abụghị maka ịkpa oke okpukperechi maọbụ oke agburu kama na ọ bụ mwakpo nkịtị dịka otu ahụ si emebu.
O nyekwara ndị uweojii iwu isochi ndị gburu mmadụ n'aha okpupere ha na Sokoto na Abuja ma nwụchie ha.
Ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'Owo arịala ruo 40, ndị merụrụ ahụ 61

Ebe foto si, Rotimi Akeredolu
Ọnụọgụgụ ndị nwụrụ na mwakpo ndị ojiegbe mere n'Ọwo, Ondo steeti agbariela ruo mmadụ 40.
Ndị omekome bu egbe ma jiri ogbunigwe wakporo ụlọụka 'St Francis Catholic Church' Owo dị n'Ondo steeti, n'ụbọchịụka, abalị ise nke ọnwa Juun afọ 2022 gbuo ọtụtụ mmadụ.
Gọọmentị na ndị ọrụ gbatagbata kwuburu na ọ bụ mmadụ 22 bụ ihe nwụrụ n'ọdachi ahụ.
Mana Gọvanọ steeti ahụ bụ Rotimi Akeredolu kwuru n'ụbọchị Wenezde na ọdachi metụtara mmadụ 127, mmadụ ji ndụ ha pụta dị 61, ebe ndị nwụrụ eruorola 40.
Akeredolu kwuru nke a dịka ọ nabatara ndị Bishọp Katolik si Ọdịda Anyanwụ nke Most Reverend Leke Abegunrin nọ n'isi ya bịara ya mgbaru n'ụlọ ya dị n'Ijebu-Owo.
Ọ sịrị, "Ọnụọgụgụ m nwere ugbua na-egosi na mmadụ 127 ka ihe metụtara, ndị nwụrụ dịzị 40 ugbua.

Ebe foto si, Rotimi Akeredolu
"A gwaala mmadụ 26 ka ha lawa. Ndị ka nọ ụlọọgwụ anata nleta dị 61.
"Nke a bụ ngụkọ nke Komishọna ahụike ahụike. Gọọmenti enweghị ihe anyị na-ezo."
O kwuru na ọnụọgụgụ ahụ gbalitere dịka ha kpọkọtara ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'ụlọọgwụ dị iche iche na steeti ahụ.
Ọ gwara ndị nnukwu ụkọchukwu ahụ na gọọmenti ga-amapụta ala ebe a ga-eli ndị nwụrụ.
Ihe nwoke nwunye ya na nwa ya lara na nta na mwakpo ụlọụka St Francis, Owo, Ondo steeti kwuru
Otu nwoke agbara nwunye ya egbe n’ụkwụ kọwara na ọ gbalahuru ya bụ mwakpo dịka ọ gaghị ụka ụbọchị ahụ.
O kwukwara na nwa ya nwoke onye gara ụka ụbọchị ahụ emerụghị ahụ.
“Agbaara m ọsọ gaa ụlọụka ahụ oge m nụrụ akụkọ a, a hụrụ nwunye m ebe o dina n’ala n’elu ozu ndị nwụrụ anwụ”
“Agbara ya egbe n’ụkwụ nke bụ na ugbua, ọ gaghị aganwụ ije”
O ji olu eleke kwuo: ‘Ekelere m Chineke n’ihe mere n’isi nwunye m na nwa m’
Etu ụmụnwaanyị Owo n'Ondo Steeti siri gagharịa sụọ ndị wakporo ụlọụka St Francis ọfọ
Ndị obodo Owo nke dị n'Ondo Steeti apụtala mee ngharị ma gọọ ọfọ megide ndị omekomewakporo ma gbuop ndị bịara ofufe n'ụke St Francis n'ụbọchị Sụnde.
Otu onyeisi ha bụbu Kọmịshọna maka ihe gbasara ụmụnwaanyị bụ Yemi Mamoud kwuru na ha mere ngagharịa n'ime iri uju were sụọrọ ndị kpara mkpamkpa n'ụbọchị sụnde ọfọ.
Mamoud kwuru sị, " Ha busoro anyị agha, ụdịrị ihe a emetụneghị n'Ondo Steeti. ihe anyị mere bụ emume omenala ụmụ nwaanyị ahịa kwesịrị ime ma ụdịrị ihe a mee".
O gara n'ihu kwuo sị, " Ihe anyị mere bụ ịbụ ndị kpara arụ a ọnụ, ọnụ anyị bụrụ ha ga-eso ha na ụmụ ha, ala ọbụla ha nọ agaghị anabata ha".
Anyị akpọọla ndị Amotekun inyere anyị aka chọta ndị mere ihe a - Gọọmentị Ondo steeti


Ebe foto si, @RotimiAkeredolu/Twitter/AmotekunFacebook
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Gọọmentị Ondo steeti ekwuola na ha na ndị otu Amotekun ịnye ha aka chọta ndị mere ihe a.
Ọnụ na-ekwuru gọọmentị ahụ bụ Richard Aketi gwara BBC Igbo n'ekwentị na ọ bụ n'ihi na ndị Amotekun ma ala na ọhịa dị ebe ahụ ọfụma.
Ihe ọzọ o kwukwara bụ na Rotimi Akeredolu bụ aka na-achị steeti ahụ nakwa ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ enweela nzụkọ maka okwu a.
O fooro ntutu taa sị na a ga-ejideriri ndị niile kpara mkpa mkpa ahụ.
Nke a na-abịa dịka ndị uweojii kwuru na ndị ahụ wakporo ụlọakụ katọlik dị na Ondo steeti yi uwe dịka ndị gara ụka.
Ọnụ na-ekwuru ha bụ Muyiwa Adejobi kwuru na ha tụrụ ogbunigwe n'ime ụlọụka ebe ndị ọzọ gbawara egbe na mpụta ụlọụka.
N'otu aka ahụ ụlọorụ gbatagbata nje Naịjirịa bụ NEMA esila n'ọnụ Kadiri Olanrewaju bụ onyeisi ha na Ondo steeti kpọpụta ọnụọgụgụ ndị nwụrụ nakwa ndị merụrụ ahụ n'ọdachi ahụ mere.
O kwuru na ọ bụ mmadụ iri abụọ na abụọ nwụrụ ebe mmadụ iri ise merụrụ ahụ na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ atọ dị icheiche na steeti ahụ.
O kwukwara na ọ maghị ihe ọbụla maka olili achọrọ ili ndị nwụrụ na ya bụ ọdachi.
Ondo church killing: "Etu m si gbanahụ ọnwụ na mwakpo ụlọụka katolịk n'Ondo Steeti"
Dịka ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ wakporo ụlọụka Katọlịk St Francis nke dị n'Owo, Ondo Steeti n'ụbọchị ụka bụ ụbọchị ise nke ọnwa Juun a afọ 2022.
BBC Igbo na ụfọdụ ndị hụrụ ka ya bụ ihe mere na ndị nọ mgbe ya bụ ihe mere kọrọ ihe ha hụrụ na ihe ha nụrụ.
Gọvanọ Steeti ahụ bụ Rotimi Akeredolu katọrọ ya bụ ihe ma sị na ha ga-ejide ndị niile kpara ya bụ arụ.
Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buhari katọkwara ya bụ arụ.

Etu o si aga n'ụlọọgwụ ebe ndị merụrụ ahụ n'Ondo na-anata ọgwụgwọ

Osote Onyeisiala Naịjirịa, Yemi Osinbajo awụchiela Owo
Osote onyeisiala, Yemi Osinbajo awuchiela na St. Francis Catholic Church, Owo, Ondo steeti, ebe ndi oyindụegwu gburu ọtụtụ ndị bịara ụka ụnyaahụ bụ Sọnde.
Osinbajo sị wuchiri ebe ahụ mgbe o jiri nkeji iri ana otu gafee elekere iri na abụọ nke ehihie Mọnde iti ndị ya bụ ihe meturu aka n'obi.

Ebe foto si, Yemi Osinbajo/facebook
Bola Ahmed Tinubu awuchiela na Owo, Ondo steeti
Onye bụbu gọvanọ Legọs steeti ji ọkọlọtọ APC azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa ugbua bụ Bola Ahmed Tinubu agaaala Owo iti ndị ya bụ ihe meturu aka n'obi maka ndị ahụ ndị omekome gburu na St. Francisi Catholic Church dị n'Owo, Ondo steeti.
Tinubu katọrọ ya bụ ajọ agwa ndị ahụ a mabeghị ndị ha bụ kpara ebe ahụ ma gwa gọọmentị ka ha nwuchie ndị ahụ taa ha ahụhụ ka iwu kwuru.



Pope Francis ekperela ndị ọdachi Ondo steeti metụtara ekpere

Ebe foto si, Reuters
Onyeisi ụlọụka Katọlik bụ Pope Francis ekperela ndị ọdachi mere na Ondo steeti metụtara.
Nke a pụtara ihe n'ozi si n'ụlọorụ ya akpọrọ Vatican nke kwuru na ọ nụrụ maka ọnwụ ọtụtụ ndị mmadụ.
"A lanyere m ndị niile ihe a mere n'aka Chineke ma kwuo ka o ziga mmụọ nsọ ya ka ọ kasie ha obi" ka o kwuru.
Ozi ahụ kwukwara na o zigaara ndị ahụ ihe a metụtara ozi itiakanobi.
Onyeisiala Muhammadu Buhari zigakwara ozi itiakanobi nye ndị ọdachi a metụtara n'Ondo steeti.
Ọ katọrọ ogbugbu ahụ ma kwuo na ọchịchịrịị agaghị emecha merie ihe.
"O nweghi ihe ga-eme ka Naịjirịa danye n'aka ndị ajọ mmadụ, Naịjirịa ga-emecha nwee mmeri" ka ozi ya kwuru.

Ebe foto si, Catholic Diocese of Ondo
Ọnụ na-ekwuchitere ndị ụka Katolịk n'Ondo Steeti bụ Augustine Ikwu ekwuola na enweghị onye ụkọchukwu maọbụ Bishọp atọọrọ na mwakpo ndị omekome mere n'obodo Owo nke dị na Ondo Steeti taa bụ ụbọchị sụnde.
Ọ dere sị, " Ọtụtụ ndị mmadụ nwụrụ ebe ndị ọzọ merụrụ ahụ. Ha metọrọ ebe dị nsọ ma enwebeghị onye ma ndị kpara arụ a".
O gara n'ihu sị," Ahụ dị ndị ụkọ chukwu niile nọ n'ụka St Francis, enweghị onye atọorọ n'ime ha. Bishọp nonyekwara ha ugbua. Biko ka anyị tinye ha n'ekpere.
'Ndị gbagburu ndị mmadụ n'ụka Katọliki n'Owo bụ aka mgba ha cheere ndị Yoruba' - Banji Akintoye

Onyeisi ndị otu jikọrọ ndị Yoruba niile n'ụwa gbaa gburugburu ekwuola na ndị gbagburu ndị mmadụ St. Francis Katọlik Church dị n'Ọwọ, Ondọ steeti ụbọchị ụka bụ akamgba ka ha cheere ndị Yoruba.
Onyeisi ndị Ilana Omo Oodua Worldwide, bụ Ọkammụta Banji Akintoye kọwara ya bụ ihe ọ na-ebo ndị Ọchịehị dịka iyi ndụ egwụ ma sị na ndị ahụ chee aka ghọrọ ndị Yoruba.
Ọ sị na agaghị eleghara ya bụ ajọ agwa ha kpasara ndị Yoruba anya iji gosi ha na ha agaghị eji ndị Yoruba etie epele.
Na ya bụ ozi o si n'aka ọnye mgbasaozi ha bụ Maxwell Adeleye wepụta, Akintoye kpọrọ oku ka Gọvanọ steeti ahụ bụ Oluwarotimi Akeredolu were ọsọsọ hazie ọnọdụ gbatagbata n'isi ndị ọchịehị n'Ondo steeti.
Ọ sị, "anyị akpọọla oku ụgbọrọ ụgbọrọ ka ndị be anyị mee ngwa ngwa hazịe ka anyị ga-esi pụọ na Naịjirịa, mana ndị ndọrọndọrọ anyị kpochiri ntị. Anyị gwara ha na ọkụ na-agba n'ọzara mana ha nyụrụ ntị mmanụ maka ihe ha na-erite na obodo a. Taa, ha gbaala anyị gburugburu, ọkachasị na Legọs".
"Ebe ndị a kara obi gbuo ndị mmadụ n'etiti be anyị gosiri na nsogbu dị n'ezie. Ndụmọdụ m bụ ka Gọvanọ Akeredolu were ọsọ were iji hazie ọnọdụ gbatagbata n'isi ndị ọchịehi ka anyị malite ịhazi usoro anyị ga-eji hapụ Naịjirịa".

Ihe ruru ozu mmadụ isii na ihe ruru mmadụ 20 merụrụ ahụ ka anyị nabatara - FMC Ondo
Ahmed Adeagbo bụ onyeisi ụloogwụ Federam Medical Centre nke dị n'Ondo Steeti kwuru na ha nabatara ozu mmadụ isii ebe mmadụ iri abụọ bụ ndị merụrụ ahụ sitere na mwakpo awakporo ụlọụka.
O kwuru na ụfọdụ bụ ndị awara ahụ ozigbo ozigbo iji zọọ ndụ ha.
Ihe ndị CAN na-ekwu
Otu Christian Association of Nigeria, CAN, akatọọla ajọ agwa ndị gbagburu ndị mmadụ n'ụka Katọlik dị n'Owo, Ondo steerti sị na ba bu arụ.
Onyeisi otu a bụ Samson Ayokunle site n'aka onye enyemaka mgbasaozi ha bụ Adebayo Oladeji sị na ya bụ agwa ndị ahụ kpara sigburu jọgburu udele ma sigbuo nkakwụ. Ọ kọwara ya bụ agwa dị ka arụ ma na-akpọ oku ka a gbanwee ndị isi ọrụ nchekwa na Naịjirịa.
Ha gbaụrụ ihu ma kwuo na ndị mere ya bụ ihe bụ ndị ajọ mmadụ na-agwa ndị ọrụ nchekwa ka ha chọwa ha ma wuchie ndị ahụ gara n'ụlọụka, hie aka abụọ n'anya, gbagbuọ ndị mmadụ aghara aghara.
N'okwu ha, "ya bụ agwa ndị njọ, o kwesiri nkatọ, ọ na-echi ntị, e kwesiri ijụ ya bụ ekwensu na ọlụ ya niile".
Ha sị na "ọnweghị ihe kwesiri ibute mmadụ ịkpa ụdịrị arụ a, si na ọ gaghị arị ha mma".

Ebe foto si, Rev. Samson Ayokunle onyeisi CAN
Onyeisiala Muhammadu Buhari etiele ndị ụka Katọlịk na ezianụlọ ndị e gburu ndị ha n'Owo aka n'obi ma katọọ ya bụ agwa ajọọ ha kpara.
N'ozi onye enyemaka mgbasaozi ya, bụ Femi Adesina depụtara na Facebook ya, Buhari gbarụrụ ihu maka agwa ọjọọ dị omekome ahụ bụ ndị ọsị ajọ ihe ga-akpọ ha ihu.
Ọ sị na "ọ bụ naanị ndị obi tara mmiri na ndị isi ọkụala mmụọ nwereike ịkpa ụdịrị agwa ahụ, iri uju na ajọ ihe ga-esochi ha azụ n'ụwa ma na ụwa ọzọ.
Dịka ọ na-eti ndị Ondo niile aka n'obi, ọ gwara ndị ọrụ gbatagbata niile ka ha gawa ebe ahụ ga-nyere ndị mmadụ aka ngwangwa.
Tupu nke a emee, Gọvanọ steeti ahụ bụ Oluwarotimi Akeredolu achabiele njem ntuliaka imeụlọ APC ọ gara n'Abuja maka ya bụ ogbugbu e gburu ndị mmadụ gara ụka n'Owo.
Akeredolu Gbarụrụ ihu maka ya bụ ihe ma nye ndị ọrụ nchekwa iwu ha gbaa mbọ hụ na e jidere ndị kpara ya bụ arụ mgbe adịghị anya.
Akụkọ na-ewu na soshal Midia ọkachasị ihe onyonyo nke na-egosi ọtụtụ ndị mmadụ nwụrụ n'ime ụlọụka a sị bụ ụka katọlịk nke St Francis dị n'owo, Ondo Steeti.
Akụkọ na-ekwu na ọ bụ ndị ojiegbe bịara ịtọrọ ụkọchukwu n'ime ụlọụka ahụ gbara ndị a egbe.

Ihe onyonyo na soshal Midia gosiri ọtụtụ ndị mmadụ nọ n'ala.
Amaneghị ndị kpara arụ a ma enwebeghị ihe ndụ uweojii maọbụ gọọmentị kwuru maka ya.
Dịka o siri dị ugbua, enwebeghị onye ma nke bụ eziokwu kama ndị mmadụ nwụrụ anwụ.













