Nigeria Army vs Unknown Gunmen: Gịnị mere n’Ohafia n’etiti ndị agha Naịjirịa na ndị ojiegbe?

Ndịagha Naịjirịa na ndị ojiegbe

Ebe foto si, Nigerian Army/Getty

Ụda egbe dara aghara aghara n’obodo Ohafia, Abia Steeti na Wenezde 18 Ọgọstụ 2022 n’etiti na ndịagha Naịjirịa na ndị ojiegbe.

Nke a tinyere ndị bi n’ogbe ahụ na-agbagharịa nakwa oke ụjọ nke onye jiri gbaa ọsọ.

Otu onye bi n’Ohafia na-achọghị ka a kpọọ aha ya kọọrọ BBC Igbo ihe ọ ma mere n’ebe ahụ.

Ọ sị na ihe a malitere n’ihe dịka elekere anọ nke mgbede, mgbe Orji Uzor Kalu bụ sinetọ na-anọchiteanya Abia North n’ụlọomeiwu bịara Ohafia.

N'okwu ya “Ụfọdụ ndị ojiegbe bịara iwakpo ụgbọala bu Orji Uzor Kalu, sị na ha achọghị ka ọ bịa n’obodo ahụ.

“Nke a mere ụgbọala Kalu jiri gaa n’isi ụlọọrụ ndịagha dị n’Ohafia, ndịagha pụtara ha na ndị ojiegbe malite ịgba onwe ha egbe.”

Nwamadị a sị na a gbagburu ndịagha ruru mmadụ abụọ, ebe mgbọ tụgburu otu nwagbọghọ.

Ọ sị na kamgbe ụnyaahụ rute ugbua na ndịagha jupụtara ebe niile n’Ohafia ugbua ebe ọtụtụ ndị bi ebe ahụ apụtaghị ezi taa.

BBC Igbo kpọtụụrụ sịnetọ Orji Uzor Kalu ịchọpụta na ihe nwamadị a kwuru ọ bụ eziokwu mana ekwentị ya agaghị.

Ihe otu onye agha kwuru

N’otu aka ahụ onye agha na-achọghị ka a kpọọ aha ya kọkwara ihe ọ maara gbasara ihe mere n’Ohafia.

Ọ sị na otu onye agha gara ahịa ịzụta ihe, ndị ojiegbe esochie azụ chọrọ igbu ya.

Ọ sị na ndị ojiegbe bịara n’ahịa na-ajụ “kedụ onye agha ahụ ọgbatumtum butere ebe a?”

Mgbe onye agha ahụ chọpụtara na ndị a na-achọ ya ka ha gbuo, na o zoro ma kpọo ndị agha ibe ya n’ekwentị.

Ndị agha wuchiri n’ahịa ahụ, ha na ndị ojiegbe amalite ịgbarịta egbe.

Ọ sị na ndịagha gbagburu ndị ojiegbe abụọ ma zọpụta onye otu ha ahụ.

Mana ka ha na-agagharịzi n’ahịa ahụ, ha chọpụtara na ndị ojiegbe adịla mbụ gbuo otu onye agha.

BBC Igbo kpọtụụrụ Innocent Omale bụ ọnụ na-ekwuru ndị agha nke 14 Brigade dị n’Ohafia mana ọ zaghị oku tupu akụkọ apụta.

Cheta na nso nso a, Brigadier Gen. Adegoke Adetuyi were ọkwa dịka ọchịagha na-achị ndịagha n’Ohafia.