Abia state: Etu ndị a maghị si wakpoo Amangwu,Ohafia, gbuo ndị mmadụ,gbaa ọtụtụ ụlọ ọkụ

Ụlọ ndị a gbara ọkụ n'Amangwu,Ohafia

Ebe foto si, Emenike Iroegbu

Ndị amaghị ndị ha bụ awakpoola obodo Amamgwu Ohafia dị n'Abịa steeti gbuo ndị mmadụ ma gbaa ọtụtụ ụlọ ọkụ.Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ndị omekome ahụ zọchiri n'abalị Monde, gbaa ọtụtụ ụlọ ọkụ, ebe mmadụ ole edobeghị anya tụnyere ndụ ha.

O nweghị onye ma ndị bịara ije ọjọọ ahụ mana ndị gwara ndị ntaakụkọ anyị okwu achọghị ka akpọ aha ha kwuru na otu na ndị e gburu na mwakpo ahụ bụ otu nwaanyị na-agbara ndị oji egbe eri a ama.

Ụlọ ndị a gbara ọkụ n'Amangwu

Ebe foto si, Emenike Iroegbu

Otu onye n'ime ha onye kwuru sịrị,"Nwaanyị ahụ nwere ebe a na-atụ ndụ mmanụ a ma ama n'Amangwu. A na-ebo ya ebubo ị na-agbara ndị ojiegbe ama."Kemgbe mkpamkpa ahụ kpara n'Amangwu, ọtụtụ ndị mmadụ agbaala ọsọ ndụ , ebe ụfọdụ ndị gbara ọsọ ji nwanyọọ alọghachi.Ndị uweojii Abia steeti kwuru na ha nụrụ maka ya bụ ọdachi.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Geoffrey Ogbonna kwuru na o nwebeghị onye wetara ha mkpesa banyere mkpamkpa ahụ kpara.

N'otu aka ahụ, o nwebeghị ihe gọọmentị Abia kwuru maka ihe mere.Mana onye omeiwu na-anọchite Ohafia North n'ụlọomeiwu steeti ahụ bụ Ichie Chief Mandela Obasi kwuru na ya nụrụ maka ọdachi ahụ ebe a gbara ọtụtụ ụlọ ọkụ ma gbụọ ụfọdụ ndị mmadụ.

Cheta na nsogbu nchekwa na-arị elu n'Ọwụwa anyanwụ kemgbe ihe karịrị otu afọ dịka e merela ọtụtụ mwakpoo, gbuo otụtụ ndị mmadụ ma gbaa ọtụtụ ụlọ na ogige ndị uweojii ọkụ.

N'ọnwa Epreelu afọ abụọ gara aga ka ndị uweojii gbagburu otu nwokorobia.