Hon Nnenna Ukeje: Ihe gọọmentị Abia state kwuru maka mwakpo ndị 'unknown gunmen' wakporo ụlọ onyeomeiwu a

Ebe foto si, Nnenna Ukeje,Okezie Ikpeaz/Facebook
Gọọmentị Abia steeti akatọọla ihe mere n'ụlọ Hon Nnenna Ukeje bụ ebe ndị omekome wakporo ụbọchị Tuzde, sị na ihe ha mere bụ'arụ".
Kọmishona mgbasaozi steeti ahụ bụ Ọkaiwu Eze Chikamnayo gwara BBC n'ekwentị na gọọmenti steeti na ndị ọrụ nchekwa ejikọla aka ime nchọpụta ndị aka ha dị n'agwa ọkjọọ ahụ.
"Ihe mere bụ ihe jọgburu onwe ya. Ọ bụ ihe kwesịrị ka ndịịle onye ọbụla gbakọ ọnụ katọọ."
"Gọọment Abia steeti na ntịnye aka ndị ụlọọrụ nchekwa dị n'aka ịhụ na-achọpụta ma takwa ndị aka ha dị na ya arụ ahụhụ kwesịrị."
Ndị omekome bu egbe wakporo ụlọ Ukeje n'ụzọ ụtụtụ Tuzde, abalị mbụ nke ọnwa Maachị, afọ 2022 gbaa ụlọ ya nakwa ụgbọala dị n'ụlọ ya n'obodo yya bụ Alayi dị na steeti ahụ.
Etu ndị 'unknown gunmen' si gbaa ụlọ na ụgbọala Hon Nnenna Ukeje ọkụ

Ebe foto si, Nnenna Ukeje
Ndị bu egbe amabeghị ndị ha bụ wakporo ụlọ onye bụbụ omeiwu na-anọchie anya mpaghara Bende n'ụlọomeiwu nta, gbaa ya ọkụ ma gbakwa ụgbọala abụọ dị na ngwuru ụlọ ya ọkụ.
Ndị omekome ruru mmadụ ise bu egbe na iko mmanụ ụgbọala wụbatara n'ụlọ Hon Nnenna Ukeje n'obodo ya bụ Alayi dị n'Abịa steeti ebe elekere abụọ nke isi ụtụtụ Tuzde ma malite ịkpa ike ebe ahụ.
O nweghị onye nwụrụ n'ọdachi ahụ mana ha mebiri ọtụtụ ihe n'ụlọ ahụ.
Omeiwu Nnenna Ukeje gwara BBC Igbo n'ekwentị ya na ya bụ ihe mere n'eziokwu.
Ukeje, onye kwuru na ya anọghị n'ụlọ mgbe o mere sị:
"Ha bịara n'ụlọ m gbaa ya ọkụ, gbaa ụgbọala ndị m nọ n'ogige ụlọ m ọkụ."

Ebe foto si, Nnenna Ukeje
O nweghị ike ịkọwa ihe o chere butere ya bụ mwakpo kama o kwuru na ha ewegarala ndị uweojii mkpesa bụ ndị ọ dịrị inyocha ya bụ mkpamkpa kpara.
"A ka na-eme nnyocha maka ya, achọghị m ikwu karịa nke a ugbua."
Oge BBC kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abia bụ Geofrey Ogbonna, Ọ zaghị ekwentị ya.
Nke a so ọtụtụ mwakpo na-eselite isi ya n'akụkọ Ọwụwa Anyawụ Naịjirịa na nso nso a.

Ebe foto si, Nnenna Ukeje
Akụkọ mwakpo dị ịcheịche emela na mpaghara Imo, Abia, Anambra, Ebonyi na Enugu Steeti nke gụnyere ịgba ụlọ ndị mmadụ ọkụ, ịgba ụlọ ndị uweojii ọkụ, ọgbụgbụ ndị uweojii nakwa ndị nkiti, ịwakpo ụlọ ahịa, ịwakpọ ụlọ ndị mmadụ nakwa ndị njem nakwa mkpa mkpa ndị ọzọ dị egwu.
Cheta na n'ọnwa gara aga ndị o ji egbe wakporo ụlọ ahịa ebe a na-eri ehi n'Abia steeti ma gbuo ọtụtụ ehi nakwa ndị mmadụ.
Gọọmentị steeti ahụ kwuru na ga-agba mbọ kwalite nchekwa na ya bụ steeti ma hụ na udo lọghachịtere ebe ahụ.
Onye bụdị Hon Nnenna Ukeje?

Ebe foto si, Nnenna Ukeje-Facebook
Nnenna Elendu Ukeje bụbụ onye omeiwu na-anọchite anya mpaghara Bende n'ụlọoimeiwu Etiti.
Ọ banyere oche ahụ n'aha otu PDP malite n'afọ 2007 rue afọ 2019 oge Benjamin Kalu napụrụ ya ọkwa ahụ.
Nnenna Ukeje bụ nwa ọkaikpe a ma ama na Naịjirịa bụ Roseline Ukeje gara akwụkwọ na 'Federal Government Girls College, Owerri, na mahadum 'University of Benin".











