Etu e si wakpo m maka ajụju banyere nde dọla 56 World Bank nyere Abia - Obinna Ichita

Ebe foto si, Obinna Ichita
Obinna Ichita bụ onye omeiwu na-anọchite ndịda Aba bụ nke Bekee kpọrọ "Aba South" n'Abia Steeti kọwara BBC Igbo etu e si mwakpo ya n'ụbọchị Wenezde.
Ọ sị na mwakpo a mere dịka ya na ndị ọ na-anọchite anya ha na-eme ọgbakọ n'Aba Sawụt.
N'okwu ya, ọ kọwara BBC Igbo na ihe a mere atụghị ya n'anya dịka ndị mmadụ bidoro wetewere ya ozi iyi egwu dị iche iche kemgbe ọ jụrụ ajụjụ ole ma ole maka ego o kwuru ruru dọla nde iri ise na isii nke ụlọakụ mba uwa "World bank" zitere Abia Steetị maka ịrụzị okporo ụzọ nke Ohanku, Obohia, Ngwa, Port Harcourt road, Uratta nakwa nke Omuma.Omeiwu Ichita sị na ajụjụ ndị ọzọ ọ jụrụ bụ ajụjụ banyere ego ọ sị ruru Ijere kwuru ijere Naira nke enyeghachiri Abia Steetị site na aka 'Paris Club refund' nakwa ego nrite mmanụ agbidi gọọmentị etiti kenyere Abia Steetị.

Ebe foto si, Obinna Ichita
Maazị Ichita kwuru na okwu ụzọ ndị a na adịghị mma bụ isi okwu ọgbakọ ha nọ n'ime ya mgbe ndị omekome bu ụgbọala atọ bịa wakpoo ha. O kwuru na ọnọdụ ụzọ ndị a emela na ụmụ akwụwkọ be ebe ndị ahụ anaghịzị a ga akwụkwọ, ma ụlọ ndị nọ na mpaghara okporo ụzọ Port Harcourt emechichala.
O kwukwara na dịka o zịpụrụlara ozi maka iyi ndụ egwu a nye ndị ọrụ nnọchite anya Briten na Naijịrịa bụ British High Commission, na ndị ọrụ nnochite anya mba Amerika nakwa nke mba Europe ole m ole dịka okwu a metụtara ego si na mba Europe
Maazị Ichita gwara BBC Igbo na maka okwu iyi ndụ egwu a na ọ gwara Komịshọna ndị uweojii na Abia Steetị, ndị ọrụ nchekwa pụrụiche bụ DSS na Abia Steetị nke mere gọọmentị Abia Steetị ji zipụta ozi ekwu na ozi ya ezighi ozi nakwa ọ bụghị eziokwu.
O kwukwara na dịka ha zigarala ndị ọrụ nchekwa ozi banyere mwakpoo a mere n'ụbọchị Wenzde, na ha ma ihu ụfọdụ ndị mere mwakpoo a nke ha kọwara ndị ọrụ nchekwa n'ozi ha.
Na nchịkọta o kwuru na ọ na atụ anya nnyocha ndị ọrụ nchekwa ga ewepụ ihe nwere isi.
Ichita sị na n'ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Julaị, o zigara gọọmentị Abia Steetị ozi gwaa ha bịa gbatara ndị 'Aba South' ọsọ enyemaka maka ụzọ niile nọ ebe ahụ mebere emebi, mana na ọ nweghi ihe ọbụla gọọmentị mere banyere ya.
Maazị Ichita sị na bido n'ụbọchị ọ jụwara ajụjụ ndị a ka ndị na-eyi ndu egwu bidoro zitewere ya ozi ọjọọ.
N'ọnwa Jụlaị 2021 gọọmentị Abịa steeti kpọrọ okwu ka ndị ọrụ nchekwa nyochaa okwu banyere iyi ndụ ya egwu Omeiwu Ichita kwuputere.
N'oge ahụ Kọmishọna mgbasa ozi na steeti ahụ bụ John Okiyi-Kalu kwuru ka na-adị mkpa ime nnyocha banyere ya bu okwu ma chọpụta nke bụ eziokwu.
O kwukwara na o zigarala ndị orụ nchekwa ozi banyere ndị a na eyi ndu ya egwu ma gwaa kwa ha maka ihe ntisa mere n'ọgbakọ ha n'ụbọchi Wenzde, nke butere nkụsasị ihe, nkuri ụgbọ ala ya nakwa mmerụ ahụ ụfọdụ ndị otu ya.
BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Steetị ahụ bụ Geoffrey Ogbonna n'ekwe nti ya taa bụ Tọọzde maka okwu mwakpoo a, ọ kọwara BBC na okwu dị etu a adighiri ya i tinye ọnụ dịka a ka na-eme nnyocha na ya.
O kwukwara na ọ bụrụ na n'ezia na Maazị Ichita eziterela ndị uweojii ozi mwakpoo a, ọha ga-anụ mpụtara nnyocha ha ma ha mechaa. Mgbọ BBC Igbo gbara mbọ ịnụta n'ọnụ Maazị Okiyi-Kalu banyere mkpesa Omeiwu Ichita na-eme mana ọ zaaghị ekwentyị ya.











