Azikwe Road Aba: Otu onye anwụọla , o nwebeghi onye a gbapụtara n'ụlọ dara n'Aba- Onye ọrụ gbatagbata

Aha onyonyo, Onyonyo na-egosi ụlọ ahụ daranụ n'Azikiwe Road dị n'Aba

Odeakwụkwọ 'Aba South Town Planning Authority' bụ Okezie Ahuruonye kwuru na ndị ọrụ gbata gbata na-agbali ka ha mara ma ha ga-azọta ndụ ndị mmadụ ka tọrọ n'okpuru ụlọ ahụ.

Ahụrụonye kwuru na ọ bụ naanị otu onye nwụrụla n'ihe mberede ahụ nakwa onwebeghị onye azọpụtarala n'ime ndị tọrọ ebe ahụ.

Otu nwoke gbanarịrị ihe mberede ụlọ dara n'Azikiwe road dị n'Aba kwuru ka chukwu si zọpụta ya n'ihe ahụ mere.

Nwoke ahụ na-akpọpụtaghị aha ya kwuru na ụmụ ntoroọbịa ahụ akpọrọ Asepa Boys(bụ ndị na-ekpo dọtị) na-arahụ n'ụlọ ahụ chụpụrụ ya n'ụlọ ahụ ka ọ ghara i so ha rahụ.

O kwuru na ka chi foro ka ọ hụziri n'ụlọ ahụ adagidela ha.

Nwoke gbanahụrụ ihe mberede a

Ebe foto si, Emeka Okwuka

Nkọwa foto, Nwoke gbanahụrụ ihe mberede a

Ndị ọrụ gbatagbata rutere ebe ụlọ dara n'Azikiwe Road dị n'Aba.

Ndị ọrụ gbata gbata eruola ebe ụlọ dara n'Aba

Ebe foto si, Emeka Okwuka

Ndị ọrụ Road Safety

Ebe foto si, Emeka Okwuka

Ihe m hụrụ ka ụlọ dara n'Azikiwe Road dị n'Aba- Anya hụrụ ihe merenu

Emeka Okwuka ụlọ ọrụ ya dịketere ebe ụlọ dara n'Aba kwuru na mmadụ isii ka tọrọ n'ime ebe ahụ.

Dịka anya hụrụ ebe ihe a mere, o kwuru na ụlọ ahụ dara n'ebe elekere isii nke ụtụtụ taa bụ ụbọchị iri na isii nke ọnwa Sepụtemba.

Okwuka kwuru na ọ bụ otu onye ka ọ hụrụ ndị ogbe ahụ zọpụtanwuru, bụga ụlọọgwụ mana ọ nụrụ na nwagbọghọ ahụ mechara nwụọ, anyị amabeghị ma nke a ọ bụ eziokwu.

O kwuru na ka ọ dị ugbua , ndị ọrụ gbatagbata steeti ahụ abịabeghị n'ebe ahụ.

Ụlọ dara ada

Ebe foto si, Emeka Okwuka

Kedụ ụlọ bụ ihe a daranụ?

Ụlọ dara ada

Ebe foto si, Emeka Okwuka

Okwuka kwuru na ụlọ ahụ kwesiri ịbụ ogo anọ mana a ka na-arụ arụ mere o jị ka nọrọ n'ogo abụọ.

Mana ọ bụ ebe azụ ya dara dagide ụfọdụ ụmụ ntoroọbia na-arụ ebe ahụ ma na-arahụkwa ebe ahụ.

O kwuru na ọtụtụ mmadụ gbakọrọ ebe ahụ na-ekiri ihe merenu.

Akụkụ ka na-abịa.