Building collapse: Etu ụlọelu ogogo atọ si daa n'Umuahia

Aha onyonyo, Building collapse: Etu ụlọelu ogogo atọ si daa n'Umuahia

Onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ntọala mmepe Obodo Umuahia bụ Enyinnaya Nwokonta kọwara etu ụlọ elu ogogo atọ si daa n'Umuahia, Abia Steeti.

Ọ sị na ọ na-atara ozi n'ekwentị na otu ụlọelu dị n'ogogo atọ dị n'okporoụzọ Nkwere dị n'Umuahia.

Mgbe ya na ndị ọrụ ya ruru ebe ahụ na ha hụrụ ndị bi n'ụlọ ka ha na-ebupụta ngwongwo ha ji biri n'ụwa.

Ha wee gbaa mbọ hụ na ndị a niile si n'ụlọ ahụ pụta, ka ụlọ ahụ ghara ịdakwasị ha.

Nwokonta sị na o rughi nkeji abụọ ha chụpụrụ ndị mmadụ n'ụlọ ahụ, ụlọ ahụ wee daa mana onweghi onye o meụrụ ahụ.

Ọ sị na ha chọpụtara na a rụrụ ụlọ a n'afọ 1990 nakwa na e jighi ezigbo igwe kwesịrị rụọ ya bụ ụlọ.

Tinyekwara na ọdọmmiri mposi si n'ụlọ ahụ dị nso n'ebe a wara ntọala ya.

Na ọ bụ ihe ndị a ka o chere kpatara ọdịda ụlọelu ahụ.

Nwokonta sị ha ga-amalite inyocha ụlọ mgbe ochie niile dị n'Umuahia iji chọpụta ndị e kwesiri ịrụgharị maọbụ ikutu.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: