Owerri Building Collapse: E jighi ngwaọrụ dị mma rụọ ụlọ ahụ dara ada - Gọọmentị Imo steeti

Ebe foto si, Celestine Ugwuanyi
Mmadụ anọ anwụọla, ebe ọtụtụ mmadụ ka tọrọ n'ime ụlọ ogo asatọ nke dara n'Owere n'ụbọchị Tọzde.
Nke a bụ dịka ndị ọrụ gbata gbata na-agba lịka lịka ịzọpụta ndị mmadụ.
Ihe ruru mmadụ 12 bụ ndị azọpụtara ma kpọrọ ha gawa ụlọọgwụ FMC Owere.
Onyeisi ngalaba 'Owerri Capital Development Authority' bụ Innocent Ikpemezie kwuru na ndị ọrụ ha ka na-agba mbọ ịhụ na a zọpụtara ndị niile ka nọ n'ime ụlọ ahụ.
Gere ihe o kwuru ebe a:
N'aka nke ọzọ, kọmishọna na-ahụ maka ala n'Imo steeti bụ Eyinna Onuegbu kwuru na ha ga-ehibe kọmiti ga-eleba anya n'ihe ahụ mere.
Ụlọelu ogo asatọ a nke bụ 'eight-storey' na bekee dara na mpaghara New Owerri, n'okporo ụzọ Musa Yar'Adua Drive.

Ebe foto si, Celestine Ugwuanyi
Ebe ya bụ ihe mere dị nso n'ụlọọrụ ntaakụkọ Hot Fm nke dị n'Owere.
Akụkọ kwuru na ụlọelu ahụ bụ ụlọ oriri na nkwari a ka na-arụ arụ.
Ọtụtụ ndị ọrụ juru na ụlọ ahụ na-arụ ọrụ oge ya bụ ụlọ dara.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Ndị ngalaba gọọmentị Imo steeti a kpọrọ 'Owerri Capital Development Authority' mechara gbata ịma nke na-emenụ.
Ndị nọ oge ihe a mere na-ekwu na ndị na-arụ ọrụ n'ụlọ ahụ oge ọ dara ruru mmadụ 50.
Ndị uweojii gbatakwara ọsọ enyemaka n'egbughị oge.

Ebe foto si, Celestine Ugwuanyi
N'ihi enyemaka ndị mmadụ, a zọpụtara ọtụtụ ndị nọ n'ime ụlọ ahụ oge ọ dara.
O dobeghi anya mmadụ ole a zọpụtara n'ihe mberede a nakwa mmadụ ole ka tọrọ n'ime ụlọ ahụ dara ada.
Mana onye ntaakụkọ gara ebe ahụ kwuru na ya hụrụ mmadụ 17 a zọpụtara.
O kwukwara na ya hụrụ ụfọdụ ndị nwụrụ anwụ mana ọ maghị mmadu ole ha dị.










