Etu ụlọelu ogogo atọ si daa n'Abakaliki

Ụlọelu ogogo atọ dị n'akụkụ isiụlọọrụ okpuruọchịchị Abakaliki n'Abakaliki ,isiobodo Ebonyi steeti ụbọchị Tuzde.
O nweghị onye nwụrụ maọbụ meruo ahụ na ya bụ ihe mberede mana ndị bi nso ebe ahụ kọrọọla BBC Igbo ihe ha hụrụ tupu ya bụ mkpamkpa akpaa.
Ijeoma Uchenna Mbam bụ onye bị n'akụkụ ya bụ ụlọ na di ya huru ka igwe e ji rụọ ya bụ ụlọ malitere ịmịpụta kemgbe Izuụka atọ gara aga bụ mgbe o jiri kpọtụrụ ndị ọzọ ka ha soro ya hụ ihe ya na ahụ.
Ijeoma sịkwa na di ya kpọtụkwaara ndị ọrụ 'Capital Territory Development Board' mana ha bịaghịzị tupu ya bụ ụlọ a daa na ihe dịka elekere iri na otu nke abalị ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Julaị.
Nwokora Christopher kelere Chineke ka o siri zọpụta ya na ezinaụlọ ya na ya bụ ụlọ dakwarasa mgbaaja ụlọ ha.

Ọ gwara BBC Igbo na"anyị kelere Chukwu maka na anyị amaghị na ya bụ ụlọ ga-adakwasị mgbaaja ụlọ anyị".
Nwokora takwara ịnjinia na-arụ ya bụ ụlọ ụta dịka onye aka ọrụ ya riri mperi.

Nwankwo Jude bụ onye hụrụ ihe mere sị na aja karịrị simenti e ji rụọ ya bụ ụlọ, na ọ bụ ya mere ya bụ ụlọ jiri daa.

Kọmishọna na-ahụ maka nchekwa na udo okeala na ndị ọrụ ya e ruola ebe ya bụ ụlọ dara ma nyekwa iwu ka agbachie ebe ahụ ogige ma nwuchie injinịa rụrụ ya bụ ụlọ ozigbo ozigbo.
Ọ dọkwara aka na ntị ka ndị ọbụla bi nso ebe ahụ nye efe maka mmeru ahụ.









