Charles Egbu: Onyeisi ojii mbụ ga-abụ onyeisi Leeds Trinity Univserity

Ebe foto si, Leeds Trinity Univserity
Gọvanọr Anambra steeti bụ Willie Obiano ebunyere Charles Egbu onye bụ mbụ onyeisi ojii na-enweta ụdị ọkwa ahụ na Briten gbaa gburu gburu, ụkpa ekele maka ọkwa ọhụrụ a.
Obiano sị na ihe a bụ oke ihe nye ndị Naịjirịa, ọkachasị Anambra steeti maka na inwete ụdị ọkwa a n'ụlọakwụkwọ dị na UK abụghị asụ anwụrụ.
Ọ gwara Egbu sị ọ kweyere na ọ ga-emechapụta ha ihu n'ọkwa maka na ọ maara na ndị n'ehi asaa n'anya n'inye mmadụ ọkwa.
Charles Egbu si Abatete wuru ewu ụnyaahụ mgbe akpọpụtara aha ya dịka onyeisi ndị Leeds Trinity University dị n'England.
Nke a na-abịa dịka Minista na-ahụ maka mahadum na UK bụ Chris Skidmore tichara mkpu na Jenuwarị na ọ nwebeghị onyeisi ojii ji ezigbo ọkwa na mahadum mba ahụ kemgbe.
Ọkammụta Charles Egbu ga-amalite ọrụ dịka onyeisi Mahadum Leeds Trinity n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Nọvemba afọ 2020.
Ihe i kwesịrị ịma banyere ya
Egbu gụrụ kwọntiti Sụvee jigodi mana o ji ọkwa dịka osote onyeisi (Pro-Vice Chancellor) na Mahadum East London.
Ọ bụbu "Dean" nke ngalaba 'Built Environment na Architecture' na Mahadum nke South Bank ma
Ọ bụ ọkankuzi n'ụlọakwụkwọ 'University College London'.
Ọ deela akwụkwọ ruru iri na abụọ (12) nakwa ihe ndị ọzọ e biputara na jọnalụ karịri narị atọ na ụma iri na ise (350) gbasara otu e si ahazị ma arụ ụlọ, ụzọ, akwammiri na ihe ndị ọzọ na-enyere mmepe obodo aka bụ nke ọ nwere mmasị pụrụiche na ha.
Egbu ga-anọchị anya ọkammụta Margaret A. House, onye nọgọrọna bụ ọkwa afọ asaa.
Obiano jikwa ohere ahụ keele ndị niile mechapụtara steeti ya ihu n'ọgbọ a.
Ndị dịka nwada Agnes Ego Maduafokwa bụ onye tuuru ugo dịka onye nke mbụ n'ụle akwụkwọ nke Jamba 2020.
Chidubem Obi bụ onye kporo ndị ọcha n'ọkpa n'agụmakwụkwọ na mba Rọshịa,na ndị ọzọ.








