Fr 'E dey work': Onye bụ ụkọchukwu a ụka Katọlik machiri n'Ọnịtsha?

Archbishop Valerian Okeke, na Fr Magnus Ebere

Ebe foto si, Facebook/Archbishop Valerian Okeke/Edeywork

Akụkọ apụtala na onyeisi ụka Katọlik nke Ọnịcha Achdayọsis bụ Valerian Okeke amachiela Onyeisi ụlọ ekpere a kpọrọ "E dey work" mịnịstrị nke dị na Nnobi, Anambra Steeti.

N'ime akwụkwọ ozi o zipụrụ n'ụbọchị Satọde, Achbishọp Okeke kwukwara na ụkọchukwu bụ onyeisi ụlọ ekpere ahụ, bụ Fada Magnus Ebere, enweghị ikike ịrụ ọrụ na mpaghara ahụ.

Fr Magnus Ebere ekwubeghị okwu maka nke a. Anyị kpọrọ akara ekwentị dị n'ọba ozi ụlọekpere ya mana azaghị ya.

Ọ zabeghịkwa ozi anyị zigaara ya n'akara e-mail.

Akwụkwọ mmachi Fr Magnus Ebere

Ebe foto si, Catholic Archdiocese of Onitsha

Nkọwa foto, Achbishọp Valerian Okeke kwuru na Fada Magnus Ebere ji ụzọ aghụghọ mịbata n'obodo Nnobi wee malite ụlọọekpere adigboroja."

Achbishọp Okeke kwuru sị: "Onweghị ndị isi ụka Rev Fr Magnus Ebere gwara tupu ọ malite, o nweghịkwanụ onye nyere ya ikike ịrụ ọrụ."

"Anyị adọọla ndị ụka anyị aka na ntị ugboro ugboro gbasara usoro ekpere nwoke a, bụ nke na-agaghị enyere okwukwe ha aka."

"Nkuzi Fr Magnus Ebere bụ nkuzi ọjọọ na nkuzi aghụghọ, onye ọbụla na-eso ya anọghizi n'okpuru usoro nkuzi ụka Katọlik."

Ihe kpatara mmachi a

Fr Magnus Ebere na Fr James Alenu

Ebe foto si, canaanlandministriestv/Lagos Archdiocese

Nkọwa foto, Fr Magnus Ebere na Fr James Alenu

N'ọdị nso a ka akụkọ pụtara na ụka Katọlik na Legọs Steeti amachiela ụkọchukwu aha ya bụ James Anelu onye e boro ebubo na ọ machiri ịgụ egwu Igbo n'ụlọụka ya Katọlik.

Fada Magnus Ebere kwuru okwu wee katọọ ihe Fada Anelu mere, ma kwuo na "e wepu ndị Igbo, ụka Katọlik na Legọs ga-adakpọ".

Ọ gara n'ihu kwuo na e wepu ndị Igbo, Naịjirịa ga-etikpọ, akụnụba ya etipia.

"Ndị Igbo bụ ndị e kere ka ha na-achị mba ndị ọzọ," Fada Magnus Ebere kwuru n'ihe onyonyo fesara na soshal midia.

Achbishọp Valerian Okeke katọrọ nkuzi a Fada Ebere na-akuzi, ma kwuo na nke a abụghị nkwenye ndị ụka Katọlik nọ n'ala Igbo.

"Ihe a bụ okwu onye isi mgbaka, onye kwesịrị ka e nyere ya aka maka ọrịa isi mgbaka," Okeke depụtara n'ime akwụkwọ ozi ya.

"Ụka Katọlik abụghị ụka e hibere maka otu agbụrụ, o kwesịghị ka ndị mmadụ na-ahụta ya etu ahụ."

Onye bụ Fr E-dey work?

Fr Magnus Ebere

Ebe foto si, Facebook/Edeywork CanaanlanTV

Nkọwa foto, Fr Magnus Ebere

Fr Magnus Ebere bụ ụkọchukwu so n'otu a kpọrọ 'Society of Divine Vocations', maọbụ 'Vocationist Fathers', maọbụ S.D.V n'ịchafụ.

Onye malitere otu a bụ ụkọchukwu aha ya bụ Justin Russolillo, onye mba Italy.

Otu a malitere malitere kpọmkwem n'afọ 1947, mana ọ batara na Naịjirịa n'afọ 1991, n'Ahiara Mbaise.

O dobeghị anya ugbua n'afọ e chiri Magnus Ebere ụkọchukwu, maọbụkwanụ Bishọp chiri ya.

Ndị otu a azabeghị ajụjụ anyị zigaara ha n'akara e-mail gbasara nke a.

Mana ihe doro anya bụ na ọ bụ Fr Magnus Ebere nwe ụlọekpere a kpọrọ Canaanland Adoration, nke dị na Mbaise nakwa Nnobi Anambra Steeti.

Ụlọekpere a malitere ihe dịka afọ iri maọbụ afọ iri na otu gara aga.

Oge a machiri Fr 'E dey work' n'Ahiara, Mbaise

Cheta n'ọnwa Nọvemba afọ 2019, ka ndị isi ụka Katọlik na dayọsis Ahiara dị na Mbaise, Imo steeti, wepụtakwara akwụkwọ kwuo na ha amachiela Fr Magnus Ebere na ụlọekpere ya bụ 'e dey work'.

Mmachi a si n'aka Bishọp na-elekọta dayọsis ahụ bụ Lucius Ugorji, nakwa ụkọchukwu na-enyere ya aka bụ Fada David Iheanacho.

Dịka Fada Iheanacho si depụta n'oge ahụ, Fr Ebere anataghị ikike ọbụla tupu ọ malite ụlọekpere ya n'Ahiara.

"Anyị dọrọ Fr Ebere aka na ntị ka ọ ghara ihibe ụlọ ekpere ya ebe a, mana o nupuru isi ma were ụzọ nzuzo na-enweta ala ebe ọ ga-arụ ụlọekpere."

"Ọ naghị agbaso usoro ụka Katọlik ji ekpe ekpere ma na-enyekwa Sakaramentị."

"Ndị mmadụ bokwara ya ebubo ịnapụ ha ala ha n'ike na-enweghị ezigbo nkwekọrịta."

"Anyị na-agwa ndị Katolik n'Ahiara Dioces ka ha zeere ụlọekpere a bụ Canaanland Adoration Mịnịstrị, maka na onyeisi ya bụ Fr Magnus Ebere enweghị ikike ụka Katọlik iji rụọ ọrụ."