Oliver Ekene Nwosu: Ihe ndị ọnụ na-eru n'okwu na-ekwu maka esemokwu Fada Nwosu na Bishop Awka Diocese

Aha onyonyo, Etu nghọtahie mụ na Bishop Awka Diocese si malite - Ekene Nwosu

Fada Oliver Ekene Nwosu ekwuola na ọ gaghị ewepụta akwụkwọ nkwụsị ọrụ Catholic Bishop Awka Diocese nyere ya mgbe ọ bụ Deacon.

Ọnụn na-ekwuchitere Bishop Awka bụ Fada Martin Anusi gwara BBC Igbo na ọ bụ Fada Oliver ga-ekwuli ihe dị n'ime akwụkwọ nkwụsị ọrụ Bishop Paulinus Ezeokafor nyere ya.

Mana mbọ nile anyị gbara ka anyị nata ya akwụkwọ ahụ kpụrụ n'ala.

N'ọnụ Fada Nwosu, "ihe mụ na Bishop Ezeokafor zitere m dịka akwụkwọ nkwụsị ọrụ dịrị anyị."

Ọtụtụ mmadụ na-ekwu uche ha gbasara nkwupute Fada Oliver Ekene Nwosu mere maka esemokwu dapụtara n'etiti ya na Bishop Awka Diocese.

Ụfọdụ kwetere n'ụfọdụ ihe Fada Nwosu kwuru mana ụfọdụ si na ha ji obere nnu were ihe ndị o kwuru.

O nwere ndị na-ekweghị chacha ma na-ajụ ya ọtụtụ ajụjụ ha che na ọ zachaghị ya ọfụma.

Etu nghọtahie mụ na Bishop Awka Diocese si malite - Ekene Nwosu

N'ọdị nso a ka akụkọ malitere ifesa na soshal midia gbasara otu ụkọchukwu Katọlik a chụpụrụ achụpụ na Naịjirịa.

Akụkọ a kwuru na ụkọchukwu a, aha ya bụ Oliver Ekene Nwosu, ji ụzọ aghụghọ wee mee ka e chie ya ụkọchukwu na mba Tanzania.

Akwụkwọ ozi si n'aka Dayọsis Morogoro nke mba Tanzania, kwuru na ha akwụsịla Ekene Nwosu ọrụ ya dịka ụkọchukwu, n'ihi na o ji ụzọ aghụghọ nara ha ngọzị.

Mana Nwosu gwara BBC Igbo na aka ya dị ọcha n'ebubo e boro ya.

Ọ kọwara na ọ bụ Bishop nke Dayọsisi Ọka, aha ya bụ Paulinus Ezeokafor, na-achụgharị ya ma na-ata ya ahụhụ.

Gere ihe niile Ekene Nwosu kwuru nakwa ihe ndị Ọka Dayọsisi sara ya.

Ndị mere akụkọ a bụ Chioma Obianinwa, Chukwunaeme Obiejesi na Nnamdi Agbanelo.