Rev Emmanuel Obimma kwuru na ọ ma na 'wayo' ga-abanye n'ikpe Hope Uzodinma
Rev. Fr. Emmanuel Obimma a ma dịka Ebube Mmụọnsọ kwuru obi ya maka ọnọdụ Naịjiria nọ n'ime ya ugbua.
Fada Obimma nke Holy Ghost Adoration Mịnịstrị dị n'Anambara steeti, kwuru na o cheghi na okwu gbasara IPOB gaara apụta ihe ma ọ bụrụ na ọnọdụ Naịjirịa dị mma.
O kwukwara sị na "anaghị ere amụma ere. Ọnụ ụkọchukwu na-ebu amụma", ka a jụrụ ya ihe o chere banyere amụma Fada Ejike Mbaka buru n'isi Hope Uzodinma bụ Gọvanọ Imo steeti.
N'etu ikpe ahụ si dapụta, Fada Obimma kwukwara sị na ọ ma na "aghụghọ ga-abanye n'ime mkpebi ikpe ahụ".
Lee ihe nkiri a ka ị chọpụta ihe ndị ọzọ o kwuru.
Ndị mere ihe nkiri a bụ Uche Akolisa na Chiemela Peter.