Lenten Season: Oge 'Lent' nke afọ a bụ iji kpee ekpere maka agha Russia na-aluso Ukraine

Aha onyonyo, Ash Wed

Taa bụ 'Ash Wednesday' ka ndị ụka Kraistị na-amalite 'lent' bụ mmemme ebumaọnụ na ekpere nke ha na-eme abalị 40.

Dịka Ụkọchukwu Chimezie Ihesiulo si kọwaa, oge lent bụ oge pụrụ iche e ji ekpe ekpere ma na-ebukwa ọnụ iji rịọ Chineke mgbaghara maka njọ.

Mana lent nke afọ 2022 pụrụ iche n'ihi ọ dabara n'oge agha na-ada na mba Ukraine dịka ndị agha mba Russia wakporo ha.

Onyeisi ụka Katọlik bụ Pope Francis ekwuola na lent afọ a ga-abụ maka ikpere mba Ukraine ekpere nakwa ịrịọ ka udo chịa n'ụwa.

Ụkọchukwu Ihesiulo, onye na-arụ ọrụ n'ụlọụka Holy Cross dị n'Aladimma, Owere, Imo State, kọwara na ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ikpe ekpere ka mba abụọ a ghọta onwe ha nke ọma.

Nkọwa oge Lent

Lent bụ oge ndị okpukperechi Kristi ji echeta ahụhụ, ọnwụ na mbilite n'ọnwụ nke Kristi.

Ọ na-anọ ogologo ụbọchị iri anọ iji cheta ụbọchị iri anọ Kraịst buru ọnụ n'ime ọzara, dịka nkwenye ndị okpukperechi ahụ si dị.

Ọ bụ emume Easter ka e ji apịachi oge Lent. Emume Easter nke afọ a ga-adị n'ụbọchị 17 nke ọnwa Eprel.