Abducted policeman: Etu anyị si wakpoo akwụ ndị Ipob/ESN, bọpụta ozu onye otu anyị ha tọọrọ - Ndị uweojii Enugwu

Ebe foto si, Nigeria Police Force
Ndị uweojii Enugwu steeti ekwuola na ha wakporo akwụ ndị ha sị na ha bụ ndị otu 'Indigenous People of Biafra'(Ipob) na alaka ọgụ ha bụ 'Eastern Security Network' gbuo otu onye ma bọpụta ozu onye uweojii ha liri n'ọhịa Agu-Ibeje dị n' Enugu-Ezike n'Okpuru ọchịchị Igbo-Eze North na nsonso a.
Ha kwuru na ha nwetakwara egbe 12, mgbọ egbe 98, mma oge abụọ,ngwuala, anyịke, ụgbọala ise gụnyere 'Honda Pilot Jeep', 'Hummer', uwe ndị uweojii nke ndị agha, akwa ndị na-acha uhie Biafra nakwa ọgbatumtum 20.
A hụkwara ngwa egwu na oche bụ ihe ndị a na-eche ha natara ndị mmadụ.

Ebe foto si, NFP
Ndị omekome wakporo ogige ndị uweojii n'Igbo-Eze North n'ọnwa Julai ebe ha tọọrọ otu onye uweojii n'abalị 22 nke ọnwa Julai afọ 2022. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Daniel Ndukwe kwuru na ozi o wepụtara nke rutere BBC Igbo aka na ndị uweojii steeti ahụ wakporo "ebe ndị Ipob/ESN n'ọhịa Agu-Ibeje dị n' Enugu-Ezike dị n'Okpuru ọchịchị Igbo-Eze North n'abalị 11 na 12 nke ọnwa Ọgọstụ afọ 2022."
" Ka ndị omekome hụrụ ndị ọrụ nchekwa ya na ha kwarịtara mgbọ, nke tụrụ otu onye n'ime ha , ebe ndị ọzọ riri mbombo ọsọ." " Ije ahụ nyere aka ịhụ ebe e lirị ozu Okpanachi Johnson, bụ onye uweojii na-arụ n'ogige ndị uweojii dị n'Igbo-Eze North Police bụ onye a na-achọ achọ kemgbe abalị 30 nke ọnwa Julai afọ 2022."

Ebe foto si, NFP
Kemgbe ọnwa Jenụwarị afọ 2021, mwakpo na ogbugubu ndị uweojii na ogige ha nakwa nke ndị nwere agba na-arị elu n'Ọwụwa Anyanwụ, Naijiria.
Ndị uweojii na Gọọmentị Etiti boro otu nwere onwe Biafra bụ Ipob na alaka ọgụ ha bụ Eastern Security Network ebubo ana ọ bụ ha na-akpa mkpamkpa ndị ahụ.
Mana ugborougboro , Ipob agọọla n'aka ha adịghị ya.











