'Etu m si kuziere onwe m ọrụ 'Special Effects Makeup’ na-enye m ego ugbua’
Onyinye Ojoko na-arụ ọrụ na Nollywood dịka onye na-ahaziri ndị ejije ntecha pụrụiche dịka nke ga-eme ọ dị ka ọkụ agbara ha, maọbụ ha e merụrụ ahụ, maọbụ ka nka n'ike.
Ojoko kwuru na ọ malitere ọrụ a mgbe ọ nọ na Mahadum na na-achọ etu ọ ga-esi na-ewete ego iji bie ndụ.
Ọ kwuru: "Elegharịrị m anya chọpụta maka ọrụ a. A gara m na Youtube kuziere onwe m ọrụ a."
O kwuru na-agbanyeghi na ya bụ ọrụ adịghị mfe, na ọ bụ ihe ọtụtụ na-achọ n'ihi ọnụọgụgụ ndị na-eme ya na Naịjirịa dị obere nke bụ na ezigbo ohere dịịrị onye ọbụla chọrọ ịbata ya.
Ojoko kwuru na ya na ndị ejije ọtụtụ a ma ama arụkọọla ọrụ na mbụ.
O kwukwara na ọ na-agba mbọ ịhụ na o wulitere ngabala ejije ntecha a pụrụiche na Naịjirịa ka ọ kwuru chịm ka nke ndị Hollywood na mba Amerịka.
Gere ihe ọ kwuru n'uju ebe a.
Ndị mere akụkọ a bụ Makuochi Okafor, Chiemela Mgbeahuru na Kelechi Agbanelo.



