Parasomnia : Etu nwoke si jiri anya ụra bepu 'akpa school' ya na mberede

Mma

Ebe foto si, Getty Images

Otu nwoke nọ n'ụlọọgwụ ugbua dịka o ji anya ụra bepụ ihe o ji bụrụ nwoke na-amaghị ama.

Kofi Atta, bụ nwafọ n'Assim Akomfode dị na mpaghara etiti mba Ghana nọ n'ọnọdụ ọjọọ n'ụlọọgwụ gwara BBC na "Ugbua anọ m n'ụlọọgwụ ebe a na-elekọta m."

Nwoke ahụ gbara afọ 47 mabụrụ onye ọrụugbo kwurukwara sị, "A na-agba m ọgwụ ma kwụnyere m mmiri.

"A sị na e kwesịrị ịwa m ahụ mana enweghị m ego a ga-eji tinye m n'ụgbọala 'ambulance' ga-ebuga m nnukwu ụlọọgwụ Komfo Anokye Teaching Hospital (KATH) maka ịwa m ahụ."

 Ụwa gbara Kofi Atta gharịrị n'ọnọdụ ọ hụrụ onwe ya dịka ụra foro ya n'anya.

Ndị agbataobi ya mmadụ abụọ hụrụ na-a ọ na-agba ọbara .

O tetara n'ụra ebe ọnọ n'oche arahụ ụra, nnụkwu ụfụ fụrụ ya n'ebe ihe o ji bụrụ nwoke.

Ọ bụ oge ahụ ka ọ matara na o bepuru 'akpa school' ya na-amaghị ama dịka ọ na-arọ nrọ.

" Echetaghi m oge m were mma, ya bụ ihe gbagwojuru m anya."

Nsogbu 'Parasomnia'

Na-agbanyeghị na ndị agbataobi ya hụrụ ya ma buru ya gaa ụlọọgwụ , Atta na-ahụ ihe mere ya dịka ọ bụ na nrọ rue oge ọ hụrụ onwe ya n'ụlọgwụ.

Ọ kọwara na ya na-arọ ebe ya na-ebe anụ ọ ji esi nri n'ụlọ ya.

A na-ede na nsogbu ya bụ ọnọdụ ahụike a kpọrọ 'Parasomnia' na Bekee.

Nke a bụ ọnọdụ ịnọ n'ụra mụrụ anya.

Ndị ọnọdụ a na-eme dịka ọbaozi ahụike 'Healthline si kọwaa, na-anọ n'ụrụ na-akpagharị maọbụ na-eme ihe dịwara aṅa dịka ịnọ n'ụra na-ekwu okwu, ịnọ n'ụra na-agagharị, ịnọ n'ụra anyụ mamịrị maọbụ na-arọ nrọ nrọ.