El-Rufai, 'Obidients', 'Vawulence', akụkọ ụgha na ihe ndị ọzọ 'social media' bubatara n'ọsọ ntuliaka 2023

Ebe foto si, Nasir El-Rufai/Getty Images
Ọbaozi soshal midia agbanweela etu e si eme maọbụ akwado ndọrọndọrọ ọchịchị na Naijiria.
Ọ gbanweela etu e si achụ nta vootu, agbasaozi, akpọkọba ndị mmadụ maka okwu ndọrọndọrọ ọchịchị ọkachasị ndị ntorobịa.
Social midia atulitela okwu ọhụrụ, usoro ọhụrụ, mpụtara ọhụrụ dị iche nke na-abụghị udịrị nke ndị jibụ omenala n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị Naijiria na-emepụta ugbua ntuliaka 2023 na-abịa nso.
Lee ụfọdụ ihe mgbanwe soshal media wetara na Naijiria dịka a na-akwado ntuliaka 2023:
1. Uche ndị ntorobịa adịla n'ọchịchị obodo

Otu ihe pụtara ihe soshal midia mere n'okwu ntulaiaka 2023 bụ na ọ gbanwere etu ndị ntorobia si ahụta ntuliaka.
Nke a pụtara ihe n'etu ọtụtụ ndị ntorobia bụ ndị ejighịbụ okwu ndọrọndọrọ ọchịchị kporo ihe si pụta nweta akwụkwọ e ji atụ vootu nke Bekee kpọrọ 'Permanent Voters' Card'(PVC).
Naanị n'ime ọnwa ole na ole, Inec denyere aha mmadụ nde iri na ụma anọ ọhụụ n'akwụkwọ atụmvootu.
ọzọ kemgbe okwu ntuliaka ahụ pụtara, ọtụtụ ndị ntorobia na-etinye ego ha na oge ha na'ịkwado onye ha chere gaeme ebunobi ha ma ọ banye n'ọchịchị.
2. Okwu ịkpa oke agbụrụ

Ebe foto si, Nasir El-Rufai
Soshal midia enwurula ọkụ ugboro ugboro n'ihi okwu asị metụtara agbụrụ .
Ụbọchị Monday, abalị 15 nke ọnwa Ọgọstụ, afọ 2022, aha Gọvanọ Kaduna steeti bụ Nasir El-Rufai bụ ihe a kpụ n'ọnụ dịka ndị mmad̄ụ katọrọ ya maka ihe okwuru banyere ọgbakọ mbara nke ndị na- akwado Peter Obi nke 'Labour Party' na-akwado na Kaduna.
Ụfọdụ ndị mmadụ hụrụ ozi El-Rufai wepụtara n'akara Twitter ya, ebe o kwuru na ndị na-akwado hụ ike ihe ruru mmadụ 200, gunyere 'imports' dịka okwu asị megidere ndị Igbo.
El-Rufai sịrị na ọ bụ ndị e si na-agbachi ọdọahịa ha kwa ụbọchị Monde a ga-eji ụgbọ abalị bubata na Kadunaga-abụ ndị a ga-ahụ n'ọgbakọ ndị nkwado Peter Obi.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
3. Ozi akpọmasị, ịkpọ iyi na ajọ okwu

Ebe foto si, Sam Omatseye/Peter Obi
Kemgbe mbido afọ 2021, ebe nile nwuru ọkụ na Naijiria ọkachasị na soshal midia dịka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-azọ ọkwa ọchịchị na ndị na-akwado na-arụrịta onwe ha aka n'ọnụ.
Nke a kawanyere njọ malite n'ọnwa May afọ 2022 dịka pati dị iche iche họpụtachara ndị ga-efere ha ọkọlọtọ na na ntuliaka 2023.
Ndị na-akwado Atiku Abubakar nke PDP, Bola Tinnubu nke APC na Peter Obi nke Labour Party na-eborịta onwe ha ebubo mfesa okwu akpọmasị, mkparị.
Iji maa atụ:
Na nsonso a, onye ntaakụkọ Sam Omatsyeye kwuru na ndị na-akwado Peter Obi ji ọnwụ amaja n'ihi edemede o dere banyere Peter Obi.
Nke a na-abịa dịka ọtụtụ katọrọ ya maka ozi akpomasị o dere bụ ebe ọ nọọ boo ebubo na Ọbụ ndị na-achọ bịafra chọrọ isi azụ ụlọ nweta ya na Peter Obi.
4. Okwu ọhụrụ

Ebe foto si, Bola Tinubu/Abubakar Atiku/ Peter Obi
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Kemgbe okwu ntuliaka 2023 nwuru ọkụ na soshal midia, okwu ọhụrụ dị iche iche nke metụtara ndị na-azọ ọkwa nakwa pati dị iche iche pụtara ma na-ewu.
Okwụ ọhụrụndị a gụnyere Obidient, Yusful, Emilokan wdgz.
'Obidients: Nke a pụtara ndị na-akwado onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha Peter Obi nke 'Labour Party'.
Yusful: Nke a pụtara ndị na-eso Peter Obi ji uche ha eme ihe.
Vawulence: Okwu ọjọọ maọbụ okwu na-arụ afọ nke nwere ike ịkpalite iwe, obi mwute nke ndị na-a.
Emilokan: Nke bụ okwu Yoroba pụtara ''m ka o ruru" bụ okwu e ji a ma ndị na-akwado Bola Tinubu nke APC njakịrị.
Atikulated: Nke a pụtara ihe metụtara ndị na-akwado Atiku Abubakar nke PDP.
Unknown Bishop: Nke a bụ okwu pụtara dịka ndị a na-ebo ebubo na ha bụ ndị nnukwu Ụkọchukwu adigboroja gara ọgbakọ mkpọpụta Kashim Shettima n'ọha dịka Osote
BATified: Nke a pụtara ndị na-akwado Bola Ahmed Tinubu na-efe ọkọlọtọ APC n'afọ 2023.
Pitobi: Nke a bụ mkpọbiri onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha ndị Labour party bụ Peter Obi.
E nwekwara okwu ndị ọzọ adịghị ntị mma ịnụ pụtara ọhụrụ nke anyị agaghị enwe ike ikpọpụta ebe a.
We no dey give shịshị: Nke a bụ okwu ndị na-akwado Peter Obi nke Labour Party na-ekwukarị iji gosi na ha na onye ha na-akwado anaghị enye aka azụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
5. Akụkọ ụgha, asị na okwu yiri ya

Ebe foto si, BBC/Saheed Balogun
Ihe ọzọ pụtarala ihe na soshal midia kemgbe okwu ntuliaka 2023 malitere bụ etu akụkọ ụgha nke Bekee kpọrọ 'fake news' maọbụ 'disinformation' si arị ibe ya elu.
Ọ dị ka ndị nkwado Tinubu, Atiku na Peter Obi na-ama aka onye ga-aka ibe ya n'ebubo ndị na-agbasa akụkọ ụgha.
Ndị na-akwado ndị na-azọ ọkwa onyeisiala na-ama aka onye onye ga-aga ibe ya n'ịgbasa akụkọ ụgha banyere ibe ha.
Iji maa atụ: Dịka onye ihe ejije Nollywood a ma ama bụ Zack Orji wepụtara ozi iji kwado Bola Tinubu dịka onye ga-azọrọ otu APC.
Akụkọ ụgha malitere fegharịwa nke kwuru na e nyere Pete Edochie nde naira iri (N10m) iji kwado Tinubu ọ jụ.
Akụkọ kwukwara na e nyere Nkem Owoh a ma dịka Osuofia otu ihe ahụ mana o kweghị.
Dịka nke a na-efegharị, ndị e chere na ha na-akwado Tinubu malitere ikesa akụkọ na e nyere Saheed Balogun bụ onye ejije Nollywood nke Yoroba nde naira iri(N10m) iji kwado Peter Obi mana ọ jụrụ ajụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Ọzọ yiri ya, otu onye amaghị onye ọ bụ kpụrụ akara onye nkwado Peter Obi ama ama na soshal midia were ya kesaa ozi nke ụfọdụ na-ekwu na ọbụ iji bute ọgụ agbụụ na'etiti ndị na-akwado otu n'ime ndị n'azọ ọkwa onyeisiala.

Ebe foto si, Nefertiti/Twitter

Ebe foto si, Nefertiti/Twitter








