Sam Omatseye: Peter Obi, o nwee ihe mere m, ndụ m dị gị n'aka

Sam Omatseye: Peter Obi, o nwee ihe mere m, ndụ m dị gị n'aka
Nkọwa foto, Onyeisoche akwụkwọ akụkọ 'The Nation' bụ Sam Omatseye etiela mkpu na ndụ ya nọ n'egwu dịka o boro ebubo na ndị na-akwado Peter Obi na-ezitere ya ozi mmaja igbu ya.

Onyeisoche akwụkwọ akụkọ 'The Nation' bụ Sam Omatseye etiela mkpu na ndụ ya nọ n'egwu dịka o boro ebubo na ndị na-akwado Peter Obi na-ezitere ya ozi mmaja igbu ya.

Nke a na-abịa dịka Omatseye wepụtara edemede nke ọ kpọrọ 'Obi-tuary' o jiri katọọ Peter Obi n'abalị mbụ nke ọnwa Ọgọstụ afọ 2022.

N'ozi o wepụtara n' akara Twitter ya ụbọchị Tuzde, Omatseye kpọkuru Peter Obi ka o jide ndị na-akwado ya aka, si na-ha na-ezitere ya ozi imemila ya.

Ọ sịrị, "Maazị Peter Obi, gwa ndị na-akwado gị okwu. Ha na-akpo na-eyi m egwu ọnụ.

" O nwe ihe mere m, ndụ m dị n'aka."

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Ebe Omatseye dere ya bụ edeme ya na Nation Newspaper kpalitere okwu na soshial medịa Naịjirịa
Nkọwa foto, Ebe Omatseye dere ya bụ edeme ya na Nation Newspaper kpalitere okwu na soshial medịa Naịjirịa

Edemede 'Obi-Tuary' kusuru iwe na soshal midịa

N'edemede ahụ Omatseye dere ọ kpọrọ "Obi-Tuary", ọ katọrọ Obi si na ọ na-agagharị n'ụlọụka dị iche iche na-eme ka ọ bụ onye nsọ.

"Mana onye na-ede ihe a ghọtara na Obi ma na igwe mmadụ hụụ ya n'anya agaghị ajụ ya ajụjụ."

"Ya mere oji were okpukperechi alata ha."

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

"Ugbua, ọ na-agazị ụlọụka dị iche iche kwa izu, dịka Jonathan mere."

O bokwara ebubo na ọ bụ ndị na-eti kpu Biafra bụ ndị tụgharịrị na-akwado Obi iji mezuo ebunobi ha.

"Ndị Biafra so na ya nwere nkwenye na ọ bụ site n'Obi ka ha ga-esi abọ Gọọmenti Naijiria ọbọ."

"Ha chọọ iweghara ụlọ anụmanụ site na ime ka ha bụ nọ n'ụlọ anụmanụ."

Okwu Omatseye kusuru ọtụtụ ụmụ Naijiria na soshal midia.

Etu ozi siri nwuru ọkụ na soshal midia mere BBC Igbo jiri kpọturu ụfọdụ ndị ọrụ mgbasaozi doro anya.

Richard Mamah bụ onye ọkwa ya gbalitere n'ụlọọrụ ntaakụkọ kọwara BBC Igbo na ihe Omatseye dere so na ụdịrị nrụrụtaụka gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị ndị mmadu n’akụkụ ụwa dị icheiche na-ebipụta n’oge ntuliaka.

Mamah kwuru: “Agbanyeghị na m agaghị ede ụdịrị edemede ahụ, a ma na ọbụghị ụdịrị ya nke mbụ aga ahụ n’ụwa mana n’uche ndị na-etinyeanya n’ozi tupu ọgbaa n’ọhụ nke Bekee na-akpọ ‘Editors’ arụghị ọrụ ha n’uju n’ibelata ụda olu ike ya bụ ozi nwere.”

O kwukwara na ọrụ ndị ‘Editors’ na ndị na-ezipụta ozi ugbua kwesịrị ịbụ ịhụ na-echekwara udo ma ghara ịkpalite mmụọ ndị mmadụ n’ụzọ ga-ebute ọghaghara nke ntuliaka.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2

Onye na-eme ihe na-akpa obi anụrị ama ama bụ Charles Oputa a ma ama dịka ' 'Charly Boy' jụụ ajụjụ onye bụ Sam Omatseye na-ama ọkwa ọnwụ Peter Obi?kwuru na

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 3

Onye na-agba mbọ maka ikike dịị onye bụ Rinu Oduola gosiri mgbagwoju anya na Omatseye dere ya bụ edemede ndị isi ụlọrụ ha hapụ ka e bipụta ya.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 4

Valentine Obienye bụ onye na-ekwuchitere Peter Obi sara ya bụ okwu site n'ozi ọ gbasara na WhatsApp.

Obienye dere na ndị dịka Omatseye na-eso akwado akpamoke na-enwuru ka ọkụ na Naịjirịa, kama iji ọkwa ya n'obodo ebelata ya.